diff --git "a/data/ibo_Latn/newstest2019-ref.ibo.txt" "b/data/ibo_Latn/newstest2019-ref.ibo.txt" new file mode 100644--- /dev/null +++ "b/data/ibo_Latn/newstest2019-ref.ibo.txt" @@ -0,0 +1,1997 @@ +Welsh AM na enwe mgbakasị ahụ maka ‘ị dị ka ihe egwuregwu’ +Enwere nchekasị ahụ n’ime ụfọdụ AMs maka ntụle na ekwesịrị ịgbanwe aha ha ka ọ bụrụ MWPs (Member of the Welsh Parliament). +Ọ malitere n’ihi atụmatụ nke ịgbanwe aha nke ndị otu obodo ahụ ka ọ bụrụ Nzụkọ Omeiwu Welsh. +AMs n’ofe ụdị ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche na enwe nchekasị ahụ na ọ nwere ike ibute ihe mkparị. +Otu AM nke Labour kwuru na ndị otu ya na echekasị na “ọ na ada ka Twp na Pwp.” +Maka ndị ọgụ akwụkwọ nọ na mpụga Wales: Na Welsh twp pụtara iberibe, pwp pụtara nsị. +AM Yi Uwe Ajị Anụ kwuru na otu ahụ dị ka dum “na ewe iwe”, na ọ nwere ihe ndị ọzọ atụnyere. +Otu onye Kọnzavetiv Welsh kwuru na otu ya “meghere obi emeghe” gbasara mgbanwe aha ahụ, mana kwupụta na ọ bụ mkpumkpu nwụfe okwu site na MWP gaa na Ihe Egwuregwu. +Na nghọta a ana akpọpụta mkpụrụedemede w nke Welsh otu ụzọ ka esi akpọpụta mkpụrụedemede u nke Bekee nke Yorkshire. +Kọmishọn nke Mgbakọ Mba ahụ, nke na edepụta iwu iji bubata mgbanwe aha ahụ, kwuru: “Mkpebi ikpeazụ na ihe nkọwa ọ bụla nke a na akpọ Ndị Otu nke Mgbakọ Mba ga-abụ okwu maka ndị otu n’onwe ha.” +Gọọmentị nke Atụmatụ Wales 2017 nyere mgbakọ mba Welsh ikike iji gbanwee aha ya. +Na Juun, Kọmịshọn ahụ bipụtara nsonaazụ nke ndụmọdụ ọhaneze na ebumnuche ndị ahụ nke chọpụtara nkwado gbasara agbasa maka ịkpọ mgbakọ mba ahụ Nzụkọ Ọmeiwu Welsh. +N’okwu nke aha nke ndị AM, Kọmịshọn ahụ dabedoro na Ndị Otu Nzụkọ Ọmeiwu Welsh ma ọ bụ WMP, mana nhọrọ MWP nwetara nkwado kachasị n’aka ndụmọdụ nke ọhaneze. +Ndị AM na atụnye nhọrọ ndị ọzọ n’ezie, mana ọgụ iji ruo nkwekọrịta nwere ike ịbụ ihe isi mgbu maka Onye Ọrụ Nọ N’isi, Elin Jones, onye nke atụrụ anya na ọ ga-enyefe iwu edere edere maka mgbanwe ndị ahụ n’ime izu ndị na abịa. +Iwu maka mmezi ndị ahụ ga-agụnye mgbanwe ndị ọzọ n’ụzọ nke mgbakọ mba ahụ si arụ ọrụ, gụnyere iwu maka nchutu nke ndị AM yana nka nke sistemụ otu ahụ. +Ndị AM ga-enwete ntuli aka ikpeazụ gbasara ajụjụ nke ihe ekwesịrị ịkpọ ha mgbe ha arụtụrụ aka gbasara iwu ahụ. +Ndị Macedonia ga-aga ntuli aka maka nhọpụta nke ịgbanwe aha obodo ha +Ndị ntuli aka ga-atuli aka na Sọnde ma a ga-agbanwe aha obodo ha ka ọ bụrụ “Repọbliki nke North Macedonia.” +Atọlitere ntuli aka nke igwe mmadụ iji kpezie esemokwu ogologo oge dị n’etiti ndị agbataobi bụ Greece, nke nwere mpaghara nke ya akpọrọ Macedonia. +Oteela Athens kwubere na aha nke ndị agbataobi ya nọ n’ugwu na egosipụta nzọrọ na mpaghara ya, ha agaala n’ihu na egbochi arịrịọ nsonye ya maka EU na NATO. +Onye Isi Ala Gjorge Ivanov nke Macedonia, onye iro nke ntuli aka na mgbanwe aha ahụ, ekwuola na ọ ga-eleghara ntuli aka ahụ anya. +Kaosiladị, ndị nkwado nke nhọpụta ahụ, gụnyere Praịm Minista Zoran Zaev, na arụrụ aka na mgbanwe aha ahụ bụ naanị ụgwọ a ga-akwụ iji sonye na EU na NATO. +Mgbịrịmgba nke St. Martin Dara Jụụ ka Ndị Ụlọ Ụka dị na Harlem Na Agba Mba +“N’akụkọ ochie, ndị okenye m gwara okwu kwuru na enwere ụlọ mmanya na ụlọ ụka n’akụkụ niile,” Maazị Adams kwuru. +“Taa, enweghị nke ọ bụla.” +O kwuru na aghọtara ọpụpụ nke ụlọ mmanya ndị ahụ. +“Ndị mmadụ na emerịkọta n’ụzọ dị iche iche” ugbu a, o kwuru. +“Ụlọ mmanya abụghịzị ime ụlọ nke gburugburu ebe ndị mmadụ na-aga kwa oge.” +Maka ndị ụlọ ụka, ọ na echekasị na ego enwetere na ịre akụ agaghị anọte aka otu ndị isi si chee, “ma n’oge adịghị anya ma ọ bụ emechaa ha ga-alaghachite ebe ha bidoro.” +Ndị ụlọ ụka, o tinyere, na enwere ike iji nnukwu ụlọ obibi nwere dochie ha, nke eji ụdị ndị mmadụ na agaghị enyere aka n’ebe nsọ nke gburugburu ahụ fọdụrụ. +“Nnukwu imirikiti ndị mmadụ na azụta nkewa ụlọ n’ụlọ ndị a ga-abụ ndị ọcha, “o kwuru, “ya mere ha ga-eme ka ụbọchị nke ndị ụlọ ụka a ga-emechi kpamkpam bịa ngwangwa n’ihi ọ ga-esi ike imirikiti ndị mmadụ na akwabata n’ime ụlọ ndị a bụrụ ndị otu nke ụlọ ụka ndị a.” +Ụlọ ụka abụọ ahụ bụ ndị mgbakọ ndị ọcha rụrụ ha tupu Harlem abụrụ obodo ndị isi ojii - Ogbe Obodo Ukwuu na 1870, St. Martin bụ afọ iri ka emechara. +Ọgbakọ ndị Methodist nke izizi pụrụ na 1930. +Ọgbakọ ndị isii ojii nọ na efe ofufe n’akụkụ wegara aha n’ụlọ ahụ. +Ndị ọgbakọ isi ojii weghara St. Martin n’okpuru Rev. John Howard Johnson, onye duru mgbochi nke ndị mgbere ahịa dị na Okporo Ụzọ 125, isi okporo ụzọ maka ịzụ ahịa dị na Harlem, ndị gbochiri ịwere ma ọ bụ ịkwado ndị isi ojii n’ahịa. +Ọkụ gbara na 1939 mebiri ụlọ ahụ nnukwu, mana ka ndị ụka nke Fada Johnson haziri ịrụgharị ụlọ ahụ, ha rụrụ igwe mgbịrịmgba ahụ. +Rev. David Johnson, nwa Fada Johnson yana onye nọchiri na St. Martin, ji obi aṅụrị kpọọ igwe mgbịrịmgba ahụ “mgbịrịmgba nke ndị ogbenye.” +Ọkachamara onye kụrụ igwe mgbịrịmgba ahụ na Julaị kpọrọ ya ihe ọzọ: “Akụ omenala” yana “akụrụngwa akụkọ ihe mere eme enweghị ike idochi.” +Ọkachamara ahụ, Tiffany Ng nke Mahadum nke Michigan, kwukwara na ọ bụ igwe mgbịrịmgba izizi dị n’ụwa nke onye egwu isi ojii ga-akpọ, Dionisio A. Lind, onye nke gara n’igwe mgbịrịmgba ka ibu dị na Ụlọ Ụka Riverside afọ 18 gara aga. +Maazị Merriweather kwuru na St. Martin anọchighi ya. +Ihe akpọrọ na St. Martin n’ofe ọnwa ole ma ole gara aga bụ akụkọ nke ndị ọsịse na ndị nrụpụta gbagwojuru anya, ụfọdụ nke ndị ndu nke ụlọ ụka ahụ webatara, ndị ọzọ bụ nke ngalaba ụka dị n’okpuru ọchịchị ndị Bishọpụ. +Ụlọ ọzụzụ - otu nchịkwa nke ụlọ ụka ahụ, nke ndị ndu juputara - degara ngalaba ụka ahụ na Julaị maka echiche na ngalaba ụka ahụ “ga-achọ ịnyefe ụgwọ ndị ahụ” n’aka ụlọ ozuzu ahụ, ọbụlagodi na ụlọ ozuzu ahụ etinyeghị aka na iwere ndi ọsịse na ndị nrụpụta na ngalaba ụka ahụ ezitere. +Ụfọdụ ndị ụka kpesara ụkọ nke mkpughe na ngalaba ụka ahụ. +Shark merụrụ nwa afọ 13 ahụ na mmanye lọbsta dị na California +Shark makpuru ma merụọ nwa nwoke afọ 13 ahụ na Satọde ka ọ na amanye na mmiri maka lọbsta na California n’ụbọchị mmepe nke oge lọbsta, ndị ikike kwuru. +Mmakpu ahụ mere tupu 7 ụtụtụ n’akụkụ Osimiri nke Beacon na Encinitas. +Chad Hammel gwara KSWB-TV na San Diego na ya na ndị enyi nọ na amanye na mmiri ihe dị ka ọkara aka elekere n’ụtụtụ Satọde mgbe ọ nụrụ ka nwa nwoke ahụ na eti mkpu enyemaka, mgbe ahụ ya na ụfọdụ kworo ụgbọ gafee iji nyere aka dọpụta ya n’ime mmiri. +Hammel kwuru n’izizi na ọ chere na ọ bụ ihe ọhụụ nke ijide lọbsta, mana mgbe ahụ ọ “chọpụtara na ọ na eti, “atara m! +Atara m!' +Adọpuru ọkpụkpụ ụkwụ ya niile, “ Hammel kwuru na ọ chọpụtara ozugbo o rutere nwa nwoke ahụ. +“Etiri m mkpu ka mmadụ niile pụta na mmiri ahụ: ‘Enwere shark n’ime mmiri ahụ!”” Hammel tinyere. +Eji ụgbọ elu buru nwa nwoke ahụ gaa Ụlọ Ọgwụ Ụmụaka Rady dị na San Diego ebe edebanyere ya n’ọnọdụ ihe egwu. +Amaghị ụdị nke shark mere mmakpu ahụ. +Lifeguard Capt. Larry Giles kwuru na nchịkọta akụkọ na ahụrụ shark na mpaghara ahụ n’izu ole ma ole gara aga, mana ekpebiri na ọ bụghị ụdị shark jọrọ njọ. +Giles tinyere na onye ahụ ihe mere nwere mmerụ ahụ buru ibu n’akụkụ elu ahụ ya. +Ndị ikike mechiri osimiri ahụ bido na Akụkụ Osimiri Ponto dị na Casablad ruo Swami dị na Ecinitas n’ime aka elekere 48 maka ebumnuche nnyocha na nchedo. +Giles kwukwara na enwere karịa ụdị shark 135 dị na mpaghara ahụ, mana anaghị ahụta imirikiti ka ndị jọrọ njọ. +Atụmatụ nke Sainbury ịbanye n’ahịa ihe ịchọ mma nke UK +Sainbury na eche Boots, Superdrug na Debenhams aka mgba site na iji warawara ụzọ ịchọ mma nwere nka-ụlọ ahịa eji ndị enyemaka ọkachamara kpojuo. +Dị akụkụ nke ọkpụrụkpụ mbanye n’ime ahịa ihe ịchọ mma £2.8n nke UK, nke na aga n’ihu etolite ebe ahịa uwe na ngwa ụlọ na alaghachi, a ga-anwale warawara ụzọ ịchọ mma n’ime ụlọ ahịa 11 na gburugburu obodo ahụ ma buga ya n’ụlọ ahịa ndị ọzọ n’afọ na esote ma ọ bụrụ na ọ gaa nke ọma. +Nkwanye ego n’ihe ịchọ mma na abịa ka ụlọ ahịa na achụ ụzọ iji mejuo oghere nke edobeburu maka Igwe onyonyoo, mikrowevụ na ngwa ụlọ. +Sainsbury kwuru na ọ ga-abasa nha nke ngwaahịa ihe ịchọ mma ya ruo ngwaahịa 3,000, gụnyere ụlọ ọrụ dị ka Revlon, Essie, Tweezerman na Dr. PawPaw nke izizi. +Oke ndị dị adị malite na L'Oreal, Maybelline na Burt’s Bees ga-enwetakwa oghere na mpaghara nwere akara yitere ndị ahụ ahụrụ n’ụlọ ahịa dị ka Boots. +Ụlọ ahịa ndị ahụ na amalitegharị ahịa ihe ịchọ mma Ụlọ Ahịa ya ka imirikiti ngwaahịa ahụ bụrụ nke na emejọghị ụmụ anụmanụ - ihe ndị ahịa na etolite na achọ nnukwu ugbu a. +Na mgbakwunye, ndị mgbere isi ụtọ Fragrance Shop ga-anwale ikikere n’ụlọ ahịa Sainsbury abụọ, nke izizi emepere na Croydon, ndịda London, izu gara aga ebe nke abụọ ga-emepe na Selly Oak, Birmingham, emechaa n’afọ a. +Ịzụ ahịa n’ịntanetị na mbugharị gaa na ���zụ obere nri kwa ụbọchị na ntakịrị ụlọ ahịa dị na mpaghara pụtara na ndị nnukwu ụlọ ahịa na enwekwu ọrụ ịrụ iji mee ka ndị mmadụ bịa. +Mike Coupe, onye isi oche nke Sainsbury, ekwuola na obere ụlọ ahịa ga-aga n’ihu n adịkwa ka nnukwu ụlọ ahịa nke ụlọ ahịa ebe ngalaba nnukwu ụlọ ahịa na anwa ịchụghachi ndị mwepu ego Aldi na Lidl site na ijikwu ọrụ na ihe ndị abụghị nri. +Sainsbury na etinye obere ụlọ ahịa Argos n’ọtụtụ ọdụ ahịa, o bubatakwara ọnụọgụ Habitats pụtara ihie kemgbe ọ zụtara ụlọ ọrụ abụọ ndị ahụ afọ abụọ gara aga, nke o kwuru bawanyere ahịa nri ma mee ka nzụrụ ahụ mụtakwuo uru. +Ọnwụnwa nnukwu ụlọ ahịa gara aga iji bidogharịa ọdụ ịchọ na ịre ọgwụ agaghị nke ọma. +Sainsbury nwalere ahịa njikọta n’etiti Boots na mbido 2000, mana njikọta ahụ jedebere ka enwesịrị esemokwu gbasara otu a ga-esi kee uru si na ọdụ ahịa ndị na ere ọgwụ n’ime nnukwu ụlọ ndị ahịa ya. +Ụkpụrụ ọhụrụ na abịa ka Sainsbury resịrị ahịa ịre ọgwụ dị ọnụọgụ ụlọ ahịa 281 n’aka Celesio, onye nwe ụlọ ọrụ Lloyds Pharmacy, ihe erere ya bụ £125m, afọ atọ gara aga. +O kwuru na Lloyds ga-arụ ọrụ n’atụmatụ ahụ, site na itinye oke nke ụlọ ahịa nlekọta anụahụ ama ama dọtịrị adọtị dị ka La Roche-Posay na Vichy n’ụlọ ahịa anọ. +Paul Mills-Hicks, onye ndu ọrịre ahịa nke Sainsbury, kwuru: “Anyị agbanweela nhụta na mmetụta nke warawara ụzọ ihe ịchọ mma anyị iji bulite gburugburu maka ndị ahịa anyị. +Anyị etinyekwala ego na ndị ọrụ azụrụ iche ndị ga-anọ ozugbo iji nye ndụmọdụ. +Ezubere oke nke akara anyị iji dabaa na mkpa niile, gburugburu mara mma na ọnọdụ dị mma pụtara na anyị na akwalite ebe ịchọ mma nke na ama aka n’etiti ụzọ ochie eji azụ ahịa. +‘Iwe’ ji Peter Jones ka Holly Willoughby sepụrụ aka na nkwekọrịta £11million +Onye nke Dragons Den ama ama bụ Peter Jones juputara ‘n’iwe’ ka onye mgbasa ozi TV Holly Willoughby sepụrụ aka na nkwekọrịta £11million dị n’etiti azụmahịa obibi ndụ ya iji gbado anya na nkwekọrịta ọhụrụ ya dị n’etiti Marks and Spencer yana ITV +Willoughby enweghị oge maka ahịa uwe ụlọ na akụrụngwa ha bụ Truly. +Atụnyela azụmahịa ha abụọ n’ahịa Goop nke Gwyneth Paltrow. +Onye mgbasa ozi This Morning, 37, gara na Instagram iji kwupute na ọ na apụ. +Holly Willoughby ahapụla onye nke eji Dragons” Den mara bụ Peter Jones n’iwe site na ịmapụ n’azụmahịa obibi ndụ ha na aga nke ọma n’oge ikpeazụ - iji gbado anya na nkwekọrịta ọhụrụ nke ya mara oke ọma dị n’etiti Marks & Spencer na ITV. +Ndị akụkọ kwuru na Jones were ‘iwe’ mgbe nwata nwanyị nke TV ahụrụ n’anya nke ukwuu kwetere n’oge nzụkọ iwe emere na Tuesday n’isi ụlọ ọrụ nke ụlọ azụmahịa ya dị na Marlow, Buckinghamshire, na nkwekọrịta ọhụrụ ya - ruru £1.5 million - pụtara na ọ nweghịzị oge zuru oke iji tinye uche na ahịa uwe ụlọ na akụrụngwa ha bụ Truly. +Atụnyere azụmahịa ahụ ka ahịa Goop nke Gwyneth Paltrow, eburu amụma na ọ ga-ebuwanye akụ nke Willoughby ekpebiri na £11 million ugboro abụọ. +Ka Willoughby, 37, gara na Instagram iji kwupute na ọ na apụ Truly, Jones pụrụ na Britain iji gaa n’otu ụlọ ezumike ya. +Otu isi akụkọ kwuru: “Truly n’ezie kachasị na mkpa nke Holly. +Ọ kwesịrị ịbụ ọdịnihu ya n’oteaka nke ga-elekọta ya n’afọ iri ndị na esote n’ọdịnihu. +Mkpebi ya iji pụọ hapụrụ mmadụ niile tinyere aka n’ọgbaghara. +Ọnweghị onye nwere ike ịkwenye ihe na eme na Tusde, ọ bịara nso nke ukwu na mmalite. +Enwere ụlọ nkwakọba ahịa nke ngwaahịa juputara dị na Isi Ụlọ Ọrụ Marlow nke dị njikere maka ọrịre.” +Ndị ọkachamara kwenyere na ọpụpụ nke onye mgbasa ozi This Morning, onye nke so na ndị ama ama na Britain na amịta ego, nwere ike iri ụlọ ahịa ahụ nde ego n’ihi nnukwu nkwanye ego na ngwaahịa sitere na oche yana kandụl ruo n’akwa na uwe ụlọ, yana ohere maka ogbugbu oge ọzọ na mmalite ya. +Ọ nwere ike ịbụ njedebe nke ogologo ọyị ahụ. +Nne nke ụmụ atọ Willoughby na dị ya Dan Baldwin bụ enyi Jones na nwunye ya Tara Capp ihe dị ka afọ iri. +Willoughby na Capp bidoro Truly na 2016, Jones, 52, sonyere dị ka onye isi na Machị. +Di na nwunye ndị ahụ na agakọta ego ezumike ọnụ, Jones nwere oke n’akụ pasentị 40 n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi TV nke Baldwin. +Willoughby ga-abụrụ onye nnọchite ụlọ ọrụ nke M&S, ọ ga-anọchi Ant McPartlin dị ka onye nlekọta nke I’m A Celebrity nke ITV. +Otu onye nọketere Jones nso kwuru abalị ụnyahụ “Anyị enwenwughi ike ikwu okwu gbasara azụmahịa ya.” +Okwu siri ike ‘mgbe ahụ anyị hụ onwe anyị n’anya’ +Ọ mara njakịrị maka okwu asị ọ ga-enweta n’aka ndị mgbasa ozi maka ikwu okwu ụfọdụ a ga-ahụta ka nke na adịghị “n’usoro onye isi ala” yana maka ịnwe ezi okwukwe maka onye isi ala nke North Korean. +Gịnị kpatara Onye Isi Ala Trump ji gbaghara nke ukwuu? +Trump kwuru n’olu “onye nta akụkọ” ịkpa amụ ya. +“Enweghi ihe ọ bụla m hapụrụ.” +O kwukwara na Kim nwere mmasị na nzụkọ nke abụọ ka ha zutechara izizi na Singapore na Juun nke Trump toro ka nnukwu nzọụkwụ na iwepusi nnukwu ngwa agha nuklịa nke North Korea. +Mana mkparịta ụka iwepu ngwa agha nuklịa akwụsịtụla. +Karịa ọnwa atọ ka enwechara nzụkọ Juun na Singapore, onye nnọchite anya nke North Korea dị elu Ri Yong gwara ndị isi ụwa na U.N. Mgbakọ Ezumezu na Satọde na North anaghị ahụ “nzaghachi kwekọrọ” n’aka U.S. maka arụmọrụ gboo na iwepu ngwa agha nke North Korea. +Kama, o kwukwara, ndị U.S. na aga n’ihu etinye ntaramahụhụ emere iji na akwanye ọkụ. +Trump soro echiche ezi okwukwe n’okwu nchịkọta ya. +“Anyị na eme nnukwu ihe na North Korea,” o kwuru. +“Anyị na North Korea chọburu ịlụ ọgụ. +Ọnụọgụ nde nke ndị mmadụ nwere ike ịnwụ. +Ugbu a anyị nwere nnukwu ezi ọyị” +O kwuru na mbọ ya iji melite mmerịkọta n’etiti Kim ewetele nsonaazụ ndị mara mma - ịkwụsị nnwale rọketị, ịnyere aka hapụ ndị eji eji yana iweghachite ụlọ ihe ndị fọdụrụ na ndị agha America nwụrụ anwụ. +Ọzọkwa ọ gbachitere usoro ya dị iche n’ikwu maka mmerịkọta yana Kim. +“Ọ dị mfe ukwuu ịme ka onye isi ala, mana kama ịme ka ọnụọgụ ndị mmadụ dị 10,000 nọ n’ilo na anwa ịbata n’ime ebe a juru eju, anyị nwere ihe dị ka ọnụọgụ mmadụ 200 kwụ ebe a, “Trump kwuru, na atụ igwe mmadụ nọ ya n’ihu aka. +Tsunami na Ala Ọmajijiji nke Indonesia Na Emebi Agwa-etiti, Na Egbu Ọtụtụ +Ka ala ọmajijiji Lombok mechara, dịka ọmụmaatụ, agwara ndị nzụkọ mba ofesi na abụghị nke gọọmentị na achọghị ha. +Ọbụlagodi na achụpụla karịa pasentị 10 nke ọnụọgụgụ nke Lombok n’ụlọ ha, akpọpụtaghị ọdachi mba ọ bụla, ihe izizi maka ịchọ enyemaka ndị mba ofesi. +“N’imirikiti okwu, na mwute, ha kwuputere ya ka o doo anya na ha achọghị enyemaka mba ofesi, yabụ ọ bụ ihe aka mgba, “Nw. Sumbung kwuru. +Ebe Save the Children na edekọba otu iji gaa Palu, o doghi ya anya ma ndị ọrụ mba ofesi enwere ike ịrụ ọrụ n’ala ahụ. +Maazị Sutopo, onye okwu okwu ụlọ ọrụ ọdachi mba, kwuru ndị ọrụ Indonesia na enyocha ọnọdụ dị na Palu iji hụ ma a ga-ahapụ ndị ụlọ ọrụ mba ofesi ịnyere aka na mbọ enyemaka ahụ. +Ejide n’aka ala ọmajijiji nke Indonesia na enwe oge niile, obodo ahụ adịghị nkwadobe ma ncha maka iwe nke ekereụwa. +Ka arụrụ ụlọ nche tsunami na Aceh, ọ bụghị ihe a na ahụ ebe niile n’akụkụ mmiri ndị ọzọ. +Ihe mgbama nke tsunami na adịghị na Palu, ọbụlagodi na etiri amụma nke ịdọ aka na ntị, nwere ike iso bute ọnwụ ndị mmadụ. +N’oge kachasị mma, ịga njem n’etiti imirikiti agwaetiti nke Indonesia bụ ihe mgba. +Ọdachi mba na eme ka nhazi gbagwojukwuo anya. +Ụgbọ mmiri ụlọ ọgwụ edowere na Lombok iji lekọta ndị ala ọmajijiji metụtara na aga ugbu a na Palu, mana ọ ga-ewe opekata mpe ụbọchị atọ iji ruo ọnọdụ nke ọdachi ọhụrụ ahụ. +Onye isi ala Joko Widodo mere imelite akụrụngwa nke Indonesia mebisiri emebi isiokwu nke mgbasa ozi nhọpụta ya, mana o tufusiela ego n’okporo ụzọ na ụzọ ụgbọ oloko. +Mana enweghị ego na egbu ọchịchị nke Maazị Joko ka ọ na eche nhọpụtagharị n’afọ na esote. +Maazị Joko na echekwa nrụgide n’aka esemokwu ngalaba dị kemgbe na Indonesia, ebe ndị otu nke ọnụọgụgụ Muslim ka ukwuu nabatara ụdị nchekwa nke okwukwe. +Egburu karịa ọnụọgụ ndị mmadụ 1,000 ma chụpụ iri puku kwụrụ iri puku ndị mmadụ n’ụlọ ha dị ka ndị omempụ Ndị Otu Kraịst na Alakụba na alụ ọgụ n’okporo ụzọ, na eji mma, ụta na ube, yana ngwa-ọgụ ndị ọzọ jọrọ njọ. +Lelee: Nsaghachi Daniel Sturridge nke Liverpool n’ime ngwụcha oge vs Chelsea +Daniel Sturridge zọrọ Liverpool n’aka nfụlahụ Premier League n’aka Chelsea site na ịnye goolu na nkeji nke 89 na Satode nke mere na Stamford Bridge dị na London. +Sturridge nwetara pass n’aka Xherdan Shaqiri ka ọ nọ ebe yaadị 30 na mpụga nke goolu Chelsea ka ndị otu ya na achụ 1-0. +O tinyere bọọlụ ahụ n’akaekpe ya tupu ọ gbaa shọt n’isi elu postu ahụ. +Ọnwụnwa ahụ gara n’elu bọksị ahụ ka ọ na eselụ aga n’ak���kụ elu akanri nke net ahụ. +Bọọlụ ahụ mechara gafee Kepa Arrizabalaga na agbatị aka wee dakpuo n’ime net ahụ. +“Ọ bụ ịnwa ịbanye n’ọnọdụ ahụ, ijide bọọlụ ma ndi egwu dị ka Shaq na agba ya aga ihu oge niile ole enwenwuru ike, yabụ m onwe m nwara iwepụta onwe m ole m nwenwuru ike, “Sturridge gwara LiverpoolFC.com. +“Ahụrụ m Kante ka ọ na abịa, metụ ya otu ugboro, echeghị m maka ya ọtụtụ, gbaa ya ozugbo.” +Chelsea nọ n’ihu 1-0 ka agara ezumike ka enyechara goolu na nkeji 25 site n’aka Eden Hazard nwa Belgium ama ama. +Onye ihu nke Blues ahụ nyere Mateo Kovacic pass azụ ụkwụ n’egwuregwu ahụ, tupu ọ gbapụ ọsọ n’akụkụ ọkara ama egwuregwu wee gbabanye n’ọkara nke Liverpool. +Kovacic mere wete mara ibe dị ọsọ n’ọkara ama egwuregwu. +Ọ gbara ọmarịcha bọọlụ, nke dubara Hazard n’ime bọksị ahụ. +Hazard gbafere dịfensị ahụ wee tinye goolu ahụ n’isi net site na iji shọt eji ụkwụ akaekpe gbaa wee gafere Alisson Becker nke Liverpool. +Liverpool na Napoli ga-aga ọgụ n’ọkwa izizi nke Champions League na elekere 3 nke ehihie na Wenesde na Stadio San Paolo dị na Naples, Italy. +Chelsea na eche Videoton na UEFA Europa League na elekere 3 nke ehihie na Tọsde na London. +Ndị nwụrụ anwụ na tsunami Indonesia eruola 832 +Ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ na ala ọmajijiji na tsunami nke Indonesia eruola 832, ụlọ ọrụ ọdachi nke obodo ahụ kwuru na isi ụtụtụ nke Sonde. +Ekpesara na ejidere imirikiti ndị mmadụ n’okpuru ụlọ ndị dara ada nke ala ọmajijiji 7.5 butere nke mere na Friday wee kpalite nnukwu ikuku ruru ụkwụ 20, onye okwu okwu ụlọ ọrụ ahụ Sutopo Purwo Nugroho gwara nzụkọ ndị nchụ nta akụkọ. +Obodo nke Palu, nke nwere karịa ndị mmadụ 380,000, kpojuru n’ibe ahịhịa si na ụlọ ndị dara ada. +Ndị uwe ojii jidere otu nwoke, 32, na nnyocha nke igbu mmadụ ka eji mma magbuo otu nwanyị +Ebidola nnyocha igbu mmadụ ka ahụchara ahụ otu nwanyị na Birkenhard, Merseyside n’ụtụtụ a. +Ahụrụ mmadụ afọ 44 ahụ na 7:55 ụtụtụ nwere ọnya mma na Grayson Mews na Okporo Ụzọ John, ejidere otu nwoke dị afọ 32 na nnyocha nke igbu mmadụ. +Ndị uwe ojii na arịọ ndị mmadụ nọ na mpaghara ahụ onye hụrụ ma ọ bụ nụ ihe ọ bụla ka ọ bịa ihu. +Onye Uwe Ojii Ịnspektọ Brian O'Hagan kwuru: ‘Nnyocha ahụ nọ na mbido ya mana m ga-arịọ mmadụ ọ bụla nọ n’ogige nke Okporo Ụzọ John dị na Birkenhead onye hụrụ ma ọ bụ nụ ihe ọ bụla a na enyo enyo ka ọ kpọtụrụ anyị. +M ga-achọ ịrịọ mmadụ ọ bụla, karịchara ndị ọkwọ ụgbọ taksị, onye nwere ike ijide ihe ọ bụla na nseta dashkam ka ọ kpọtụrụ anyị n’ihi ha nwere ike ịnwe ozi dị mkpa maka nnyocha anyị.’ +Onye okwu okwu ndị uwe ojii ekwenyela na nwanyị ahụ ahụrụ ahụ bụ onye mpaghara na Birkenhead, ahụrụ ya n’ime otu akụ. +N’ehihie a ndị enyi kwere na ha ma nwanyị ahụ abịala n’ogige ahụ iji jụọ ajụjụ maka ebe ahụrụ ya n’ụtụtụ a. +A na eme nnyocha ugbu a dị ka ndị uwe ojii si kwuo ha na akwadobe ịgwa osote nke onye ihe ahụ mere. +Onye ọkwọ ụgbọ taksị bi na Grayson Mew nwara ịbanyechi na be ya mana ndị uwe ojii gwara ya na ọ nweghị onye na abanye ma ọ bụ apụ n’ụlọ ahụ. +Okwu ekweghị ya mgbe ọ chọpụtara ihe mere. +A na agwa ndị bi ebe ahụ ugbu a, na ọ ga-ewe ogologo oge tupu ahapụ ha ịbanyechi ọzọ. +Anụrụ ka otu onye uwe ojii na agwa otu nwoke na a na ahụta mpaghara ahụ niile ka ogige omekome. +Otu nwanyị anya mmiri juru bịara n’ogige ahụ. +Ọ nọ na ekwugharị “ọ jọrọ njọ’. +Na elekere 2 nke ehihie ụgbọ ala ndị uwe ojii abụọ nọ n’ime eriri ahụ ụgbọ ala ọzọ nọkwa na mpụga. +Ụfọdụ ndị uwe ojii kwụ n’ime eriri ahụ na elele ụlọ ndị ahụ. +A na arịọ mmadụ ọ bụla nwere ozi ka ọ dete ozi na @MerPolCC, kpọọ 101 ma ọ bụ kpọtụrụ Crimestoppers na ejighi aha ya na 0800 555 111 na ekwu ndekọ 247 nke Septemba 30. +Akpụrụakpụ Cromwell nke nzụkọ omeiwu abụgo ihe ncheta kachasị ọhụrụ dabanyere n’esemokwu ‘ịdegharị akụkọ ochie’. +Nchụpụ ya ga-abụ ntaramahụhụ maka mmebi ya yitere Taliban emere n’ọtụtụ akpụrụakpụ omenala na okpukperechi nke England, nke ndị nsuso Puritan na enye nsogbu mere. +Mana Otu Cromwell kọwara ntụnye nke Maazị Crick ka ‘ihe njakịrị” yana “ịnwa ịdegharị akụkọ ochie.” +John Goldsmith, onye isi oche nke Otu Cromwell, kwuru: “Ọ bụ ihe agaghị ezenwu na nrịrụta ụka ugbu a maka mwepu nke akpụrụakpụ na akpụrụakpụ nke Oliver Cromwell dị na mpụga nke Obieze nke Westminster ga-abụ ihe mgbado anya. +Mmebi akara okpukperechi nke emere n’oge ọg�� ndị England abụghị Cromwell nyere iwu ya ma ọ bụ mee ya n’aka ya. +Ikekwe a ga-egbu Cromwell na ezighi ezi maka mmereme nke nna ochie ya Thomas mere na narị afọ gara aga. +Ọmarịcha ngosipụta nke Sir William Hamo Thorneycroft maka Cromwell pụtara ihie n’echiche narị afọ 19 yana akụkụ nke ndekọ akụkọ nke mmadụ ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ekwesịrị ị na ebuli elu. +Maazị Goldsmith gwara The Sunday Telegraph: “Ọtụtụ na ebuli Cromwell, ikekwe karịa na ngwụcha narị afọ 19 karịa oge a, dị ka onye nchedo nke nzụkọ omeiwu maka nkwanye si na mpụga, n’okwu ya ndị ọchịchị. +Ma nke ahụ abụ ngosipụta ziri ezi n’uju bụkwazị isiokwu nke nrịrụta ụka akụkọ ochie na aga n’ihu ugbu a. +Ihe doro anya bụ na ọgụ nke etiti narị afọ 17 doziri ntolite nke obodo anyị, Cromwell bụ mmadụ ama ama onye nke na egosi otu akụkụ nke nkewa ahụ. +Ntozu ya ka Onye Nchedo Kachasị bụ ihe tozuru ibuli elu ma na echeta.” +Ezi Na Egbu Mmadụ Dọgburu Onye Ọrụ Ubi China +Ezi makpuru otu onye ọrụ ubi ma gbuo ya n’ahịa dị na akụkụ ọdịda anyanwụ na ndịda nke China, site na mkpesa mgbasa ozi nke mpaghara. +Nwoke ahụ, eji naanị aha nna ya kọwaa “Yaun,” ka ahụrụ ya ebe ọ nwụrụ anwụ, adọrịrị akwara ya, ọbara kpuchiri ya n’akụkụ ụlọ ezi dị n’ahịa ahụ dị na Liupanshui na mpaghara Guizhou, South China Morning Post kpesara na Sọnde. +Onye ọrụ ubi na azụ ezi kwadoro ịgbanye ọgwụ mgbochi n’ime ezi ndị dị n’ụlọ ezi n’ụbọchi Meh 30, 2005 na Xining nke Mpaghara Qinghai, China. +Ekwuru na ya na nwa nwanne ya mere njem bidoro na mpaghara Yunnan nọketere nso na Wenesde iji ree ezi 15 n’ahịa ahụ. +N’ụtụtụ na esote, nwa nwanne ya hụrụ ya ebe ọ nwụrụ anwụ, ma chọpụta otu ụzọ banyere n’otu ụlọ ezi ka ọ mepere emepe. +O kwuru n’ime ụlọ ezi ahụ bụ nnukwu oke ezi ọbara dị n’ọnụ ya. +Nnyocha fọrensik kwenyere na ezi ibu 550 ahụ dagburu onye ọrụ ubi ahụ, site na akụkọ ahụ. +“Ọbara na ọnya juru ụkwụ nwa nwanne m,” nwa nwanne ahụ kwuru, nke eji aha nna ya wee na arụtụ aka “Wu,” kwuru, dị ka Guiyan Evening News siri kwuo. +Nseta igwefoto nche gosiri ka Yuan na abanye n’ahịa ahụ 4:40 ụtụtụ Tọsde iji nye ezi ndị ahụ nri. +Ahụrụ ahụ ya n’otu aka elekere ka emechara. +Anụmanụ gburu nwoke ahụ abụghị nke Yaun ma ọ bụ nwa nwanne ya. +Otu onye nchịkwa ahịa gwara Evening News na akpọchiri ezi ahụ iji gbochie ya na ịmakpu mmadụ ọzọ, ebe ndị uwe ojii na ekpokọta ihe aka n’ogige ahụ. +Ezinụlọ nke Yuan na ndị ikikere ahịa na akparịta ego nkasị obi maka ọnwụ ya. +Agbanyeghị na ọ bụ ihe na anaghị emekarị, ebe ezi ịmakpu mmadụ bụ ihe edekọburu na mbụ. +Na 2016, otu ezi makpuru otu nwanyị na dị ya n’ubi ha na Massachusetts, hapụ nwoke ahụ na nnukwu mmerụ ahụ. +Afọ iri gara aga, ezi na ada 650 n’ibu kpadoro otu onye ọrụ ubi Welsh na traktọ ya ruo mgbe nwunye ya chụpụrụ anụmanụ ahụ. +Ka ezi nke onye ọrụ ubi Oregon richara ya na 2012, otu onye ọrụ ubi Mantioba gwara CNC News na ezi na emekabe ihe ike mana ụtọ ọbara nwere ike ịbụ “ihe mkpalite.” +“Naanị egwu ka ha na egu. +Ha bụ ụmụ ntakịrị, ha nwere nnukwu nchụchọ ... ha apụghị ịmerụ gị ahụ. +Ị kwesịrị ịnye ya nsọpụrụ ziri ezi, “o kwuru. +Ihe fọdụrụ na Oke Ifufe Rosa ga-ebute nnukwu mmiri ozizo gbasara agbasa n’akụkụ ọdịda anywa na ndịda nke US +Dị ka amụma ihuigwe, Oke Ifufe Rosa na ada ka ọ agafe n’elu mmiri juru oyi nke akụkụ osimiri n’ebe ugwu nke Mexico. +Kaosiladị, Rosa ga-ebute mmiri ozizo ga-ebute ide mmiri n’ofe ebe ugwu nke Mexico yana akụkụ ọdịda anyanwụ na ndịda nke U.S. n’ụbọchị ndị na abia. +Rosa nwere ikuku 85 mph, Oke Ifufe nke Otu 1, ebe 5 ụtụtụ. Oge ọwụwa anyanwụ Sọnde, ọ dị na maịlụ 385 nke ọdịda anyanwụ na ndịda nke Punta Eugenia, Mexico. +Atụrụ anya na Rosa ga-aga n’ebe ugwu na Sọnde. +Ugbu a, nnukwu oghere ebidola ịchịkọta n’ofe Oke Osimiri Pacific ma gaa ọwụwa anyanwụ na-aga Akụkụ Osimiri Ọdịda Anyanwụ nke U.S. Ka Rosa na erute ala mmiri Baja California na Mọnde ka oke ikuku mmiri, ọ ga-ebido ịkwa oke mmiri miri emi gaa n’ebe ugwu n’ime nke ọdịda anyanwụ na ndịda nke U.S. +Rosa ga-ebulite mmiri ozizo toruru 10 inchis n’akụkụ nke Mexico na Mọnde. +Mgbe ahụ, oke mmiri na agwakọta n’ime nnukwu oghere na abịa ga-emepụta nnukwu mmiri ozizo gbasara agbasa n’ebe Ọdịda anyanwụ na ndịda n’ofe ụbọchị ndị na abịa. +Na mpaghara, mmiri ozizo ruru 1 ruo 4 inchis ga-ebute ide mmiri jọrọ njọ, ọsụsọ ahịhịa yana ala ọzịze nwere ike ịdị n’ọzara. +Oke mmiri miri emi ga-ebute oke mmiri ozizo irute inchi 2 ruo 3 kwa aka elekere na nkebi, karịchara n’akụkụ nke ndịda Nevada na Arizona. +Dị ka a na atụ anya inchis 2 ruo 4 nke mmiri ozizo n’ụfọdụ akụkụ nke Ọdịda anyanwụ na ndịda, karịchaa n’ofe nke Arizona. +Enwere ike ịnwe ide mmiri nwere ọnọdụ na emebi ngwangwa n’ihi ụdịdị nke oke mmiri ozizo fesara efesa. +Ọ ga-abụ nnukwu ndụmọdụ jọrọ njọ iji ụkwụ gara banye n’ọzara ebe enwere ihe egwu nke oke mmiri ozizo. +Nnukwu mmiri ozizo nwere ike ịme ka kanyọns bụrụ osimiri ji iwe yana egbe eluigwe na amụma ga-ebute oke ifufe na aja na efesasị efe. +Nnukwu oghere ahụ na abịarute ga-ebute ụfọdụ nnukwu mmiri ozizo n’ebe akụkụ osimiri Ndịda California. +Mgbakọ mmiri ozizo nke gafere ọkara inchi nwere ike ịdị, nke nwere ike ibute obere ọsụsọ ahịhịa yana okporo ụzọ na amị amị. +Nke a ga-abụ mmiri ozizi izizi nke mpaghara ahụ nke oge udu mmiri ha. +Ụfọdụ nyọsa oke mmiri ozizo fesara efesa ga-ebido irute Arizona na mgbede Sọnde yana n’isi ụtụtụ Mọnde, tupu mmiri ozizo ahụ agbasasịa na mgbede Mọnde na Tusde. +Nnukwu mmiri ozizo ga-agbasa na Akụkụ Anọ na Tusde ma nọgide ruo Wenesde. +Ọktọba nwere ike ịhụ ụfọdụ mgbanwe temprechọ dị ike n’ofe U.S. ka Arctic na ejuwanye oyi, mana ebe okpomọkụ ga-enwe okpomọkụ. +Oge ụfọdụ nke a na ebute nnukwu mgbanwe na temprechọ n’ofe obere oge. +Enwere nnukwu ịmaatụ nke ndịiche temprechọ dị egwu gafere n’etiti U.S. na Satọde. +Enwere ihe rutere ndịiche temprechọ digrii-20 n’etiti Kansas City, Missouri, na Omaha, Nebraska, yana n’etiti St. Louis na Des Moined, Iowa. +N’ụbọchị ole ma ole na abịa, ekpomọkụ ọkọchị ga-anọgide ga-anwa ịkpụkọ ma dọtịa ọzọ. +Atụrụ anya na imirikiti n’ebe etiti na ọwụwa anyanwụ U.S. ga-ahụ mbido Ọktọba nwere ekpomọkụ gbasara 80s bido na Ala Ndịda ruo n’akụkụ nke Ọwụwa anyanwụ na ugwu. +New York City nwere ike iru digrii 80 na Tusde, nke ga-abụ ihe dị ka digrii 10 karịa nkezi. +Amụma ihuigwe ogologo oge anyị na egosi nnukwu ohere maka nkezi temprechọ ndị dị n’elu maka akụkụ ọwụwa anyanwụ nke U.S. gafere ọkara izizi nke Ọktoba. +Ihe karịrị ọnụọgụ ndị mmadụ nde 20 lelere ọnụnụ Brett Kavanaugh +Ihe karịrị ọnụọgụ ndị mmadụ nde 20 lelere nkwupụta akaebe nke Tọsde sitere n’aka Brett Kavanaugh onye ahọpụtara maka Ụlọ Ikpe Kachasị yana nwanyị boro ya ebubo nke mwakpo n’ike mere na 1980, Christine Blasey Ford, na netwọk igwe onyonyoo isi. +Ugbu a, nkwụsịdo ike ndọrọndọrọ ahụ gara n’ihu, ndị mgbasa ozi nọ na akwụsịbido mmemme ndị kwesịrị ịme maka ntụgharị nkeji ikpeazụ nke Fraịde ahụ: nkwekọrịta nke Onye Ọmeiwu Jeff Flake nke Arizona zubere maka FBI iji mee nnyocha otu-izu maka ebubo ndị ahụ. +Ford gwara Ọgbakọ Ndị Ikpe Nzụkọ Ọmeiwu na o doro ya anya pasentị 100 na Kavanaugh ji anya mmanya pịa ya aka ma nwaa iyipu ya akwa n’emume ụlọ akwụkwọ sekọndịrị. +Kavanaugh, na nkwupụta nwere oke mmetụta, kwuru na o doro ya anya pasentị 100 na ọ meghị. +Enwere ohere na ihe karịrị ọnụọgụ nde ndị mmadụ 20.4 nke Nielsen kwuru na Friday lelere ya. +Ụlọ ọrụ ahụ na-agụ nkezi nlele na CBS, ABC, NBC, CNN, Fox News Channel na MSNBC. +Ọnụọgụgụ adịghị ozugbo maka netwọk ndị ọzọ gosiri ya, gụnyere PBS, C-SPAN na Fox Business Network. +Ma Nielsen na enwekarị nsogbu ịha ndị mmadụ lelere n’ụlọ ọrụ ha. +Iji mee ka ịghọta nke ahụ, nke ahụ bụ nha ndị nlele yitere ndị nọ n’ama egwuregwu futbọọlụ onye mmeri ma ọ bụ Academy Awards. +Fox News Channel, ndị nchịkọta ya nwere uche nke ya kwadosiri nhọpụta Kavanaugh ike, gafere netwọk niile site na ịnwe nkezi nke ọnụọgụ ndị nlele nde 5.69 n’oge ọnụnụ ụbọchị-niile ahụ, Nielsen kwuru. +ABC gbara onye nke abụọ site na ịnwe ndị nlele ọnụọgụ nde 3.26. +CBS nwere ọnụọgụ nde 3.1, NBC nwere ọnụọgụ nde 2.94, MSNBC nwere ọnụọgụ nde 2.89 yana CNN nwere ọnụọgụ nde 2.52, Nielsen kwuru. +Mmasị rịrị elu ka ọnụnụ ahụ gwụchara. +Flake bụ onye agbadoro anya n’okwu nke Fraịde. +Ka ụlọ ọrụ Repọblikan na agafeghị oke wepụtara nkwupute ya na ọ ga-atụnyeere Kavanaugh, igwefoto CNN na CBS jidere ya n’ụtụtụ Fraịde ebe ndị njegharị iwe na akpọ ya asị ka ọ na anwa ịbanye igwe nrigo na aga ọnụnụ Mgbakọ Ndị Ikpe. +O ji obi umeala kwụrụ ọtụtụ nkeji ka a na akpọ ya iyi, a na egosi ya ozugbo na CNN. +“Akwụ m ebe a n’ihu gị,” otu nwanyị kwuru. +“Ọ dị gị ka ọ na agwa ndị obodo anyị eziokwu? +Agwara ya, “ị nwere ikike mgbe ọtụtụ ụmụ nwanyị enweghị ikike.”” +Flake kwuru na ụlọ ọrụ ya ewepụtala nkwupute ma kwuo, tupu igwe nrigo ahụ emechie, na ọ ga-enwekwu ihe ndị ọ ga-ekwu n’ọnụnụ mgbakọ ahụ. +Netwọk kebụl na mgbasa ozi nọ na ekpuchi ihe na eme ozugbo ka emechara, mgbe Mgbakọ Ndị Ikpe kwesịrị ituli aka iji kwagoo nhọpụta Kavanaugh n’aka Nzụkọ Ọmeiwu n’uju maka ntuli aka. +Mana Flake kwuru na ọ ga-eme nke ahụ naanị na nghọta na FBI ga-elenye anya na ebubo emere onye nhọpụta ahụ n’ime izu na esote, nke ndị Demokrats dị obere nọ na akwanye. +Agbanwere obi Flake obere na nkata ya na enyi ya, Onye Ọmeiwu Demokrat Chris Coons. +Ka yana nkata Coons gachara, ọtụtụ ndị ọmeiwu mechara, Flake mere mkpebi ya. +Nhọrọ Flake nwere ikike, n’ihi ọ pụtara ihie na ndị Repọblikans enweghị vootu iji kwado Kavanaugh na emeghị nnyocha ahụ. +Onye Isi Ala Trump emepeela nnyocha FBI n’ebubo nke emere Kavanaugh. +British PM May na ebubo ndị nkatọ ebubo nke ‘ịme ndọrọndọrọ’ n’elu Brexit +Praịm Minista Theresa May boro ndị nkatọ ebubo iji ọdịnihu Britain “eme ndọrọndọrọ” maka atụmatụ ya iji hapụ European Union yana imebi mmasị obodo n’ajụjụ ọnụ emere n’akwụkwọ akụkọ Sunday Times. +Praịm Minista Theresa May nke Britain rutere maka Ọgbakọ Conservative Party na Birmingham, Britain, Septemba 29, 2018. +N’ajụjụ ọnụ ọzọ dị n’akụkụ nke ya dị n’ihu akwụkwọ nke akwụkwọ akụkọ ahụ, onye bubu minista mba ofesi bụ Boris Johnson guzosiri ike nsogbu ya maka atụmatụ Chequers ya maka Brexit, na ekwu na atụmatụ na Britain na EU kwesịrị ịnakọta ụtụ isi ha abụọ bụ “nnukwu okwu nzuzu.” +Egbe ọgbụgba Wayde Sims: Ndị uwe ojii jidere onye a na enyo enyo Dyteon Simpson na ọnwụ onye egwu nke LSU +Ndị uwe ojii jidere otu onye a na enyo enyo n’ọnwụ nke Wayde Sims, onye egwu basketbọọlụ dị afọ 20 nọ na LSU. +Ejidela Dyteon Simpson, 20, ma tinye ya n’ụlọ mkpọrọ na ebubo ọnwụ nke digrii-abụọ, Ngalaba Ndị Uwe Ojii Baton Rouge kwuru. +Ndị ikikere buputere vidio nke esemokwu dị n’etiti Sims na Simpson, ndị uwe ojii kwuru na Sims tufuru ugogbe anya ya n’ọgụ ahụ. +Ndị uwe ojii weghachitere ugogbe anya ahụ n’okirikiri ahụ ma kwuo na ha hụrụ DNA nke Simpson na ha, ndị mmekọ CBS bụ WAFB kwuru. +Ka ajụchara Simpson ajụjụ, ndị uwe ojii kwuru na ọ kwenyere na ịgbagbu Wayde. +Atọrọ bọndụ ya na $350,000, Advocate kwuru. +Ụlọ Ọrụ Onye Nyocha nke East Baton Rouge Parish buputere mkpeza izizi na Fraịde, na ekwu na ihe buputere ọnwụ ahụ bụ egbe ọgbụgba agbara n’isi ruo n’olu. +Ngalaba ahụ na eto ndị ọrụ ike nke Ndị Uwe Ojii Steeti Louisiana, ụlọ nyocha ndị uwe ojii nke steeti ahụ, ndị uwe ojii Southern University yana ndị amaala mpaghara n’ịnyere aka na nnyocha ahụ butere njide ahụ. +Onye ndu egwuregwu LSU Joe Alleva kelere ndị uwe ojii maka “uchu yana nchuso akwụmọtọ ya.” +Sims dị afọ 20. +Onye ihu ahụ dị 6-ụkwụ-6 toro na Baton Rouge, ebe nna ya, Wayne, bụkwa onye egwu basketbọọlụ nke LSU. +Ọ na enweta akara 5.6 n’ọkara yana nkụpụta 2.6 kwa egwuregwu n’oge gara aga. +N’ụtụtụ Fraịde, onye ndu basketbọọlụ LSU bụ Will Wade kwuru na otu ahụ nọ na “mgbu” yana “nkụja” n’ihi ọnwụ Wayde. +“Nke a bụ ihe ị na eche oge niile,” Wade kwuru. +Volkano gbọpụtara ntụ na Mexico City +Mgbọpụta ntụ sitere na volkano Popocatepetl eruola agbatobi ndị nọ na ndịda nke isi ala Mexico. +Ọdụ Mba maka Mgbochi Ọdachi Mba dọrọ ndị Mexico aka na ntị na Satọde iji nọpụ na volkano ahụ ka achọpụtara mmereme na kreta, ọ debanyere mbupute 183 nke gas na ntụ n’ofe aka elekere 24. +Ọdụ ahụ na enyocha ọtụtụ ụda na ọma jiji. +Onyonyo ndị dị n’ebe mmerịkọta ọhaneze gosiri ntakịrị nyiwe ntụ na ekpuchi ụgbọ ala n’agbataobi nke Mexico City dị ka Xochimilco. +Ndị na enyocha ala chọpụtara mmalite na mmereme n’ime volkano ahụ nọ maịlụ 45 (kilomita 72) ọwụwa anyanwụ na ndịda nke isi ala kemgbe ala ọmajiji ruru 7.1 mere n’etiti Mexico na Septemba 2017. +Volkano ahụ ama ka “Don Goyo” dị ire kemgbe 1994. +Ndị uwe ojii na ndị nkewa Catalonia lụrụ ọgụ tupu ụbọchị ncheta ntuli aka nnwere onwe +Ejidere ndị mmadụ isii na Barcelona na Satọde ka ndị ngagharị iwe na akwado nnwere onwe lụsara ndị uwe ojii ọgụ, ka puku kwụrụ puku ndị mmadụ sonyere na ngagharị nke ọzọ iji dowe ụbọchị izizi ncheta nke ntuli aka gbasara nsepụ aka nke Catalonia na akpọtụ akpọtụ. +Otu nke na akwado nkewa kpuchiri ihu ha nke ndị uwe ojii na egbochi tụrụ ha akwa ma tụkwaa agba ntụ, na emepụta urukpuru ojii nke ntụ n’okporo ụzọ na abụkarị ndị njem na eju. +Ọgụ mechaa dapụta n’ụbọchị ahụ ebe ndị uwe ojii ji osisi iji kwụsịtụ ọgụ ahụ. +N’ofe ọtụtụ aka elekere ndị otu na akwado nnwere onwe nọ na eti “Agaghị echezọ, agaghị agbahara” n’ihu ndị ngagharị iwe ndị ịdị n’otu nọ na eti, “Ndụ dịịrị Spain.” +Ndị mmadụ iri na anọ nwetere ọgwụgwọ maka obere mmerụ ahụ enwetara na ngagharị iwe ahụ, ndị mgbasa ozi mpaghara kwuru. +Obi mgbali elu dị n’ime mpaghara ahụ na akwado nnwere onwe n’ime otu afọ ka emechara nhọpụta Ọktoba 1 nke Madrid hụrụ ka ihe gabigara iwu mana nke ndị nkewa Catalonia nwụrịrị. +Ndị ntuli aka họpụtara dum ịnọrọ na nnwere onwe, agbanyeghị na ndị pụtara dị obere ebe ndị na achọghị nkewa ledara ntuli aka ahụ. +Site na ndị ikikere Catalonia ihe rutere ndị mmadụ 1000 merụrụ ahụ n’afọ ikpeazụ ka ndị uwe ojiii nwara ịkwụsị ntuli aka ahụ ịga n’ihu n’ọdụ ntuli aka dị n’ofe mpaghara nke nnukwu ọgụ ndị ahụ. +Ndị otu na akwado nnwere onwe larụrụ n’ilo na Fraịde iji gbochie ngagharị iwe na nkwado nke ndị uwe mba ahụ. +Ngagharị iwe ahụ gara n’ihu mana akwanyere ha iji ụzọ ọzọ. +Narcis Termes, 68, onye na arụ ọkụ bịara ngagharị iwe nkewa ahụ du nwunye ya kwuru na ọ nweghịzị olile anya maka atụmanya nke Catalonia ịnweta nnwere onwe. +“Afọ gara aga anyị hụrụ otu oge kachasị mma na ndụ anyị. +Elelere m nne na nna m bee akwa ka ha nwere ohere ịtụ ntuli aka mana ugbu a anyị kwudoro akwudo,” o kwuru. +Tụmadị ijikwa mmeri dị mkpa dị mkpụmkpụ na ntuli ala nke mpaghara emere na Disemba gara aga, ndị otu na akwado Catalonia agbaala mbọ idowe agbamume n’afọ a ebe imirikiri ndị isi ha ama ama kachasị mma gbara ọsọ ndụ ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ mkpọrọ na eche ikpe maka ọrụ ha na ịhazi nhọpụta ahụ yana nkwupute nke nnwere onwe sotere ya. +Joan Puig, onye na arụ ụgbọ ala dị afọ 42 na edekọ ngagharị iwe ahụ n’ekwentị ya na nkwado nke ndị uwe ojii, kwuru na ndị ndọrọndọrọ n’akụkụ abụọ ahụ kpalitere esemokwu ahụ. +O kwuru “obi ndị mmadụ na agbali nke ukwuu,”. +Na Satọde, Oriol Junqueras, otu n’ime ndị isi Catalonia nọ n’ụlọ mkpọrọ na eche ikpe kemgbe ebe ngwụcha afọ gara aga, kwuru na ọ ga-apụta maka ntuli aka Nzụkọ Omeiwu nke Europe. +“Ịkwụpụta ka onye nhọpụta maka ntuli aka nke Europe bụ ụzọ kachasị mma iji kagbuo nlaghachi azụ n’uru ọchịchị onye kwuo uche ya yana mkpagbu anyị hụgoro na gọọmentị ndị Spain,” ka o kwuru. +Londonderry: Ejidere ụmụ nwoke ka ụgbọ ala sụbanyere n’ụlọ +Ụmụ nwoke atọ, afọ 33, 34, na 39, ka ejidere ka eji ụgbọ ala sụbanye n’ụlọ ugboro ugboro na Londonderry. +Ihe ahụ mere na Ballynagard Crescent na Tọsde n’ihe dị ka 19:30 BST. +Ịnspektọ Ndị Uwe Ojii Bob Blemmings kwuru na emebiri ọnụ ụzọ yana ụlọ ahụ n’onwe ya. +Ọ nwere ike ịbụ na agbara ụgbọ ala ahụ ụta n’otu oge. +Goolu Menga nyere Livingston mmeri 1-0 n’elu Rangers +Goolu izizi nke Dolly Menga nke Livingston wetere mmeri +Livingston akwagotere kụjara Rangers iji tinye Steven Gerrard na ọdịda nke abụọ ya n’egwuregwu 18 ka onye ndu nke otu Ibrox. +Goolu Dolly Menga kwụpụtara ka ndịiche ka ndị otu Gary Holt gbagoro n’otu ọkwa ka Hibernia n’ọkwa nke abụọ. +Ndị otu Gerrard na enweghị mmeri n’ụzọ na Premiership n’afọ a ga-ezute ndị nọ n’isi bụ Hearts, ndị ha ji akara asatọ achụ, na Sọnde na esote. +Tupu nke ahụ, Rangers ga-ezute Rapid Vienna na Europa League na Tọsde. +Livingston, otu aka ọzọ, dọtịrị mmeri ha na enweghị nsaghachi na ngalaba ahụ ruo egwuregwu isii, ebe onye isi ndu Holt enwebeghị ọdịda kemgbe ọ nọchiri Kenny Miller n’ọnwa gara aga. +Livingston tufuru ohere ha n’aka ndị mbịambịa na adịghị nkọ +Ndị otu Holt kwesịrị ịnọ n’ihu tupu ha enye goolu, egwuregwu ike ha buteere ndị Rangers ụdịrị nsogbu niile. +Scott Robinson gafere mana ọ gbafuru mbọ ya n’ihu goolu ahụ, mgbe ahụ Alan Lithgow nwenwuru ike ịgbafu mbọ ya ka ọ mịchara iji nweta bọọlụ isi nke Craig Halkett gafere n’ihu goolu. +Ndị anọ be ha nwere afọ ojuju ịhapụ Rangers ịgba bọọlụ n’ihu ha, buru n’obi na ha ga-enye ndị mbịambịa ahụ nsogbu na bọọlụ atụsara otu ebe. +Ma nke ahụ bụ ụzọ ha ji nye goolu ahụ dị mkpa. +Rangers nyere frikik, ndị Livingston mepere oghere, Declan Gallagher na Robinson jikọrọ aka iji tọlite Menga, onye metụrụ ya otu ugboro wee si n’etiti bọksị ahụ wee nye goolu. +N’oge ahụ, ndị Rangers ji bọọlụ niile mana ha enwenwughi ike ịgafe defensị ndị ahụ anọ be ha yana onye nche post Liam Kelly enweghị nsogbu ọ bụla, +Usoro ahụ gara n’ihu ruo ọkara nke abụọ, mana Alfredo Morelos mere ka Kelly rụọ ọrụ ya. +Ụkwụ nke onye nche post Rangers Allan McGregor jụrụ Scott Pittman, Lithgow gbafuru bọọlụ nke Livingston ọzọ atụsara otu ebe. +Bọọlụ bịara ugboro ugboro n’ime bọksị Livingston, nke agbafuru ha niile, ebe enwere penaltị abụọ ajụrụ - ka Halkett gbachara Glenn Middleton ewebatara ụkwụ, otu maka ịmetụ bọọlụ aka - ajụrụ ha. +‘Ihe dị egwu’ sitere n’aka Livingston - nchịkọta +Alasdair Lamont nke BBC Scotland na Ogige Tony Macaroni +Omume na nsonaazụ dị egwu maka Livingston. +Na nhụta otu nwoke, ha mere nke ọma, ha gara n’ihu na emefe ihe ndị atụrụ anya na mgbago ha. +Ụzọ egwuregwu na ndị otu ha agbanweghị nke ukwuu kemgbe ha laghachitere n’isi, mana otito ga-aga n’aka Holt maka ụzọ o si dozie otu ahụ kemgbe ọ bịara. +Ọ nwere ọtụtụ odogwu. +Kaptịn Halkett gbara oke mbọ, jikwara defensị kpọrọ akpọ, ebe Menga dowere Connor Goldson na Joe Worrall n’ọrụ n’egwuregwu ahụ niile. +Ndị Rangers enweghị ihe na akpalite ha. +Tụmadị ezigbo egwuregwu ahụgoro n’aka ha n’okpuru Gerrard, ha erughi ọkọlọtọ ndị ahụ. +Bọọlụ ikpeazụ ha ezughi oke - naanị otu ugboro ka ha mepere ndị otu ahụ nọ n’ụlọ, ọ bụ ihe mmepe anya maka ndị Rangers, ndị hụrụ onwe ha n’etiti tebul. +Erdogan nwetere nnabata dị iche iche na Cologne +Enwere ọchị yana eluigwe na acha agba akwụkwọ ndụ (Septemba 29) ka ndị isi nke Turkey na Germany hụrụ maka nri ụtụtụ na Berlin. +Ọ bụ ụbọchị ikpeazụ nke mbịambịa na ebute esemokwu nke Onye Isi Ala Erdogan na Germany- nke ezubere iji dozie mmekọrịta n’etiti ndị enyi NATO. +Ha enweela esemokwu n’ihi nsogbu gụnyere ikikere ndị mmadụ, nnwere onwe ndị mgbasa ozi yana mgbakwunye nke Turkey na EU. +Mgbe ahụ Erdogan gabara Cologne iji mepee ụlọ alakụba ọhụrụ buru oke ibu. +Obodo ahụ bụ ụlọ nke ọnụọgụgụ ndị Turkey kachasị na mpụga nke Turkey. +Ndị uwe ojii ji n’ihi nche wee gbochie igwe mmadụ ruru 25,000 na ịgbakọta n’ihu ụlọ alakụba ahụ, mana ọtụtụ ndị nkwado pụtara n’ebe dị nso iji hụ onye isi ala ha. +Narị kwụrụ narị ndị na anaghị akwado Erdogan - imirikiti bụ Kurdish - mekwara ka anụ olu ha, na akpọ iwu nke Erdogan asị yana mkpebi nke ndị Germany iji nabata ya n’obodo ahụ. +Ọgụ ngagharị iwe ahụ na egosi nkewa nke onye ọbịa ụfọdụ ndị Turkey si Germany kpọrọ odogwu n’otu aka ọzọ ndị ọzọ na ahụta ya ka onye ọchịchị akaike. +Ihe mberede okporo ụzọ Deptford: Ọkwọ anyịnya igwe nwụrụ n’ihe mberede yana ụgbọ ala +Otu ọkwọ anyịnya igwe nwụrụ n’ihe mberede gụnyere ụgbọ ala na London. +Ihe mberede ahụ mere n’akụkụ nkwụsị nke Okporo Ụzọ Bestwood na Okporo Ụzọ Evelyn, okporo uzọ na eju eju na Deptford, n’ebe ọwụwa anyanwụ na ndịda nke obodo ahụ, n’ihe dị ka 10:15 BST. +Onye na anya ụgbọ ala ahụ kwụsịrị, ndị nlekọta letere ya, mana nwoke ahụ nwụrụ n’ebe ahụ. +Ihe mberede ahụ na eme n’ime ọnwa ole ma ole ka ọkwọ anyịnya igwe ọzọ nwụrụ n’ihe mberede akụrụ gbapụ ọsọ na Okporo Ụzọ Childers, ihe dị ka otu maịlụ pụọ n’ebe mberede nke Satọde. +Metropolitan Police kwuru na ndị uwe ojii na arụ ọrụ iji mata nwoke ahụ wee gwa onye na esote ya. +Mmechi okporo ụzọ na mbugharị nnukwu ụgbọ ala dị, agwala ndị na akwọ ụgbọ ka ha zere mpaghara ahụ. +Ụlọ mkpọrọ Long Lartin: Ndị ọrụ isii merụrụ ahụ n’ọgbaghara +Ndị ọrụ n’ụlọ mkpọrọ isii emerụọla ahụ n’ọgbaghara dị n’ụlọ nga ụmụ nwoke nwere nnukwu nche, Ụlọ Orụ Ụlọ Mkpọrọ ahụ kwuru. +Ọgbaghara dapụtara na HMP Long Lartin dị na Worcestershire n’ihe dị ka 09:30 BST na Sọnde nke ka na aga n’ihu. +Akpọbatala ndị ọrụ ọkachamara “Tornado” iji gboo ọgbaghara ahụ, nke gụnyere ndị nga asatọ, akpakọtala ya n’otu akụkụ. +Eletere ndị ọrụ ahụ maka obere ahụ mmerụ n’ihu ha n’ebe ahụ. +Onye okwu okwu Ụlọ Orụ Ụlọ Mkpọrọ kwuru: “Ezipula ndị ọrụ ụlọ mkpọrọ azụrụ iche iji gboo ihe ahụ na eme ugbu a na HMP Long Lartin. +Eletela ndị otu isii maka mmerụ ahụ. +Anyị anaghị anabata ọgbaghara n’ụlọ mkpọrọ anyị, o doro anya na aga enyefe ndị butere ya n’aka ndị uwe oji, ha nwere ike ịnọkwu oge toro ogologo n’ụlọ nga.’ +HMP Long Lartin na eji karịa ndị nga 500, gụnyere ụfọdụ ndị omekome kachasị njọ n’obodo a. +Na Juun ekpesara na gọvanọ ụlọ mkpọrọ ahụ nwetere ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ ka otu onye nga makpuru ya. +N’ọktoba afọ gara aga akpọrọ ndị ọrụ ọgbaghara iji gboo nnukwu nsogbu nke eji bọọl��� siri ike wee makpuo ndị ọrụ. +Oke Ifufe Rosa Nwere Ike Ibute Ide Mmiri na Phoenix, Las Vega, Salt Lake City (Mpaghara Ọkọchị Nwere Ike Irite) +O siri ike ịhụ ka oke ifufe egbe-igwe ịkụ Arizona, mana nke ahụ bụ ihe nwere ike ịme na mbido izu na abịa ka ike fọdụrụ na Oke Ifufe Rosa na agafe n’akụkụ Ọdịda Anyanwụ na Ndịda nke Ọzara, na ebute ihe egwu ide mmiri. +Ọrụ Ihuigwe Mba enyela nlepụ anya maka ide mmiri maka Mọnde na Tusde maka akụkụ ọdịda anyanwụ nke Arizona ruo n’akụkụ ndịda na ọwụwa anyanwụ Nevada, ọwụwa anyanwụ na ndịda nke California na Utah, gụnyere obodo nke Phoenix, Flagstaff, Las Vegas, na Salt Lake City. +Atụrụ anya na Rosa ga-agafe Phoenix ozugbo na Tusde, jiri mmiri ozizo na erute na mgbede Mọnde. +Ọrụ Ihuigwe Mba dị na Phoenix ekwuola na twit na naanị “oke ifufe ọjọọ iri dịgidere n’ọkwa oke ikuku mmiri ma ọ bụ oke ifufe egbe-igwe n’ime maịlụ 200 nke Phoenix kemgbe 1950! +Katrina (1967) bụ oke ifufe n’ime maịlụ 40 nke oke ala AZ.” +Ụkpụrụ Ọdụ Oke Ifufe Mba kachasị ọhụrụ ugbu a na ebu amụma inchi 2 ruo 4 nke mmiri ozizo, mkpokọta ndị dịpụrụ iche ga-erucha inchi 6 na Mogolllon Rim of Arizona. +Mpaghara ndị ọzọ nke Ọdịda Anyanwụ na Ndịda Ọzara gụnyere etiti Rockies na Great Basin nwere ike ịnweta inchi 1 ruo 2, mgbakọta dịpụrụ iche ruru inchi 4 ma enwee ike. +Maka ndị ahụ na anọghị n’egwu ide mmiri, mmiri ozizo nke Rosa nwere ike ịbụ ngozi ebe mpaghara ahụ na enwe nnukwu ọkọchị. +Agbanyeghị na ide mmiri bụ ihe nnukwu egwu, ụfọdụ mmiri ozizo a ga-adị mkpa ebe akụkụ ọdịda anyanwụ na ndịda ugbu a na enwe nnukwu ọkọchị. +Site n’aka ndị U.S. Ihe Nyocha Ọkọchị, naanị pasentị karịrị 40 na enweta opekata mpe ọkọchị dị oke egwu, otu nke abụọ kachasị,” weather.com kpesara. +Izizi, ụzọ nke Oke Ifufe Rosa na ada n’ofe Baja California ala mmiri nke Mexico. +Rosa, ka nọrọ n’ike oke ifufe ụtụtụ Mọnde nwere ikuku kachasị nke maịlụ 85 kwa aka elekere, nọ maịlụ 385 ndịda nke Punta Eugenia, Mexico na aga n’akụkụ ugwu na maịlụ 12 kwa aka elekere. +Ikuku mmiri ahụ na abanye mmiri jụrụ oyi na Pacifik ya mere ọ na agbatu n’ike. +Ya mere, atụrụ anya na ọ ga-ada na Mexico n’ike oke ikuku mmiri n’oge ehihie ma ọ bụ mgbede na Mọnde. +Mmiri ozizo n’ofe akụkụ nke Mexico nwere ike isi ike, na eyite ihe egwu nke ide mmiri. +“Atụrụ anya mgbakọta mmiri ozizo nke inchi 3 ruo 6 sitere na Baja California banye n’akụkụ ọdịda anyanwụ na ugwu nke Sonora, nwere ruo inchi 10 ma enwee ike,” weather.com kpesara. +Mgbe ahụ Rosa ga-aga akụkụ ugwu site na Mexico ka oke ikuku mmiri tupu o rute n’oke ala Arizona n’isi ụtụtụ Tusde ka oke ifufe egbe-igwe, nke ga-agafe ozugbo na Arizona wee banye n’akụkụ ndịda Utah n’oge ime mgbede Tusde. +“Ihe ịze ndụ kachasị atụrụ anya n’aka Rosa ma ọ bụ ihe fọdụrụ na ya bụ nnukwu mmiri ozizo dị egwu na Baja California, ọdịda anyanwụ na ugwu nke Sonora, yana U.S. Ọdịda Anyanwụ na Ndịda Ọzara,” Ọdụ Oke Ifufe Mba kwuru. +Atụrụ anya mmiri ozizo ndị a ịmepụta ịde mmiri nwere ike igbu ndị mmadụ yana ọsụsọ ahịhịa n’ọzara, yana ala ọzịze n’ala ugwu. +Mmakpu Midsomer Norton: Njide mmadụ anọ maka ọnwụnwa igbu mmadụ +Ejidela ụmụ ntorobịa nwoke atọ yana otu nwoke dị afọ 20 na nyocha nke ọnwụnwa igbu mmadụ ka ahụchara otu onye dị afọ 16 nwere ọnya eji mma mee na Somerset. +Ahụrụ nwoke ntorobịa ahụ ebe ọ nwere ọnya n’ebe mpaghara Excelsior Terrace nke Midsomer Norton, ihe dị ka 04:00 BST na Satode. +Edugara ya n’ụlọ ọgwụ ebe ọ nọrọ n’ọnọdụ “dị mma”. +Ejidere otu onye afọ 17, mmadụ abụọ afọ 18 yana otu nwoke afọ 20 n’abalị na mpaghara Radstock, Avon nke Ndị Uwe Ojii Somerset kwuru. +Ndị uwe ojii arịọla ka mmadụ ọ bụla nwere nseta ekwentị mkpanaka nke ihe mere ka ọ bịa ihu. +Trump kwuru Kavanaugh “tara ahụhụ, obi akpọ, iwe” nke Otu Demokrats +“Otu ntuli aka maka Ọkaikpe Kavanaugh bụ ntuli aka iji jụ obi ọjọọ na ụzọ gafere oke nke ndị Otu Demokrats,” Trump kwuru n’ọgbakọ dị na Wheeling, West Virginia. +Trump kwuru na Kavanaugh “ataala ahụhụ obi akpọ, iwe” nke ndị Otu Demokrat n’usoro nhọpụta ya. +Kavanaugh gbara akaebe n’ihu Nzụkọ na Tọsde, jiri iwe na obi mmụọ wee gọnarị ebubo nke Christine Blasey Ford na ọ wakporo ya n’afọ iri gara aga mgbe ha bụ ndị ntorobia. +Ford gbakwara akaebe nke ọnụnụ ahụ gbasara ebubo ya. +Onye isi ala kwuru na Satọde na “Ndị America hụrụ amamịghe na agwa na mgbamume” nke Kavanaugh n’ụbọchị ahụ. +“Otu ntuli aka iji kwenye na Ọkaikpe Kavanaugh bụ otu ntuli aka iji kwenye n’otu uche iwu kachasị tozuo etozu n’oge anyị, onye ọkaiwu nwere ndekọ nke ọrụ ọhaneze na amuke amuke,” ọ gwara igwe mmadụ nke ndị nkwado West Virginia. +Onye isi ala ahụ iji ụzọ ọzọ wee rụtụ aka na nhọpụta Kavanaugh ka ọ na ekwu maka mkpa nke mpụta ndị Repọblikan na ntuli aka ndị etiti afọ. +“Izu ise fọdụrụ tupu otu ntuli aka kachasị mkpa na ndụ anyị. +Anaghị m apụta, mana m na apụta n’ezie,” o kwuru. +“Ya mere m ji nọrọ n’ebe niile na akwado ndị anamachọihe mara oke mma.” +Trump rụrụ aka na ndị Demokrats nọ na njem iji “kwụsị ma gbochido.” +Ntuli aka izizi dị mkpa n’ọkwa Nzụkọ Ọmeiwu maka nhọpụta nke Kavanaugh ka atụrụ anya ga-eme tupu Fraịde gachaa, onye otu ọchịchị GOP dị elu gwara CNN. +Ala ọmajiji, tsunami, nke Indonesia gburu narị kwụrụ narị ndị mmadụ, ọgụgụ ka na agbago +Opekata mpe egburu ndị mmadụ 384, ka nnukwu ikuku dara n’akụkụ osimiri ekpochapụrụ ọtụtụ ndị mmadụ, mgbe nnukwu ala ọmajiji na tsunami kụrụ agwaetiti Indonesia nke Sulawesi, ndị ikikere kwuru na Satọde. +Narị kwụrụ narị ndị mmadụ bịakọtara maka emume n’akụkụ osimiri n’obodo nke Palu na Fraịde mgbe ikuku ruru ogo mita isii (ụkwụ 18) dara n’ala n’oge uhuruchi, zara imirikiti banye n’ọnwụ ha ma na emebi ihe ọ bụla dị n’ụzọ ya. +Tsunami ahụ sotere ala ọmajiji ike 7.5. +“Mgbe ihe egwu tsunami ahụ bidoro ụnyahụ, ndị mmadụ nọ na eme mmemme ha n’akụkụ osimiri ahụ, ha agbaghị ọsọ ozugbo, ya mere o ji metụta ha,” Sutopo Purwo Nugrogo, okwu okwu maka ụlọ ọrụ njikwa ọdachi mba nke Indonesia BNPS kwuru na nchịkọta na Jakarta. +“Tsunami ahụ abịaghị n’aka ya, o burulu ụgbọ ala, osisi, ụlọ, ọ kụrụ ihe niile nọ n’ala,” Nugroho kwuru, na ekwukwa na tsunami ahụ gafere na nnukwu osimiri n’ọsọ nke 800 kph (497 mph) tupu o daruo n’akụkụ osimiri. +Ụfọdụ ndị mmadụ rịrị elu osisi iji gbanarị tsunami ahụ ma dị ndụ, o kwuru. +Ebugara ihe ruru ndị mmadụ 16,700 n’ama 24 dị na Palu. +Ọsịse elu nke ụlọ ọrụ ọdachi ahụ buputere gosiri imirikiti ụlọ na ụlọ ahịa emebisiri, akwa mmiri gbagochara ma daa yana ụlọ alakụba mmiri gbara okirikiri. +Ala ọmajiji gara n’ihu na eme n’ụsọ oke osimiri ahụ na Satọde. +Enwere mmetụta usoro nke ala ọmajiji na mpaghara nwere ndị mmadụ nde 2.4. +Ụlọ Ọrụ maka Nyocha na Ntinye nke Teknụzụ nke Indonesia (BPPT) kwuru na nkwupute na ike nnukwu ọmajiji nke Fraịde buputere dị ihe dị ka ugboro 200 nke ike nke ogbunigwe atọmik atụsara na Hiroshima na Agha Ụwa nke Abụọ. +Ala nke obodo ahụ, nke tukwu na ngwụcha nke mpaghara osimiri toro ogologo, dị warawara, nwere ike ibuwanye nha nke tsunami ahụ, ka o kwuru. +Nugroho kọwara mmebi ahụ ka “ihe gbasara agbasa” ma kwuo puku kwụrụ puku nke ụlọ, ụlọ ọgwụ, ọdụ ụlọ ahịa na ụlọ nkwari dara. +Ahụrụ ahụ nke ụfọdụ ndị mmadụ ọ metụtara n’okpuru ahịhịa nke ụlọ ndị dara, o kwuru, tinye ndị mmadụ 540 merụrụ ahụ ma 29 na efu. +Nugroho kwuru na ndị nwụrụ yana mmebi nwere ike ịkarị n’ogologo ụsọ oke osimiri ahụ 300km (maịlụ 190) n’akụkụ ugwu nke Palu, mpaghara a na akpọ Donggala, nke nọketere nso na etiti nke ọmajiji ahụ. +Nkwukọrịta enweghị ozi ọ bụla ma ncha sitere na Donggala, Nugroho kwuru. +Enwere karịa ndị mmadụ 300,000 bi ebe ahụ,” Red Cross kwuru na nkwupute, na etinye na ndị ọrụ ya na ndị wepụtara onwe ha na aga n’ebe ndị emetụtara. +O kwuru “nke a abụrụla ihe mberede, mana ọ nwere ike ịkawanye njọ,”. +Ekwutọrọ ụlọ ọrụ ahụ nke ukwuu na Satọde maka ịhapụ ikwu na tsunami dara na Palu, agbanyeghị na ndị ọrụ kwuru na nnukwu ikuku bịara n’oge enyere ịdọ aka na ntị ahụ. +Na nseta ekekọrịtara n’ebe mmerịkọta ọhaneze enwere ike ịnụ ka otu nwoke nọ n’elu ụlọ na eti nnukwu mkpu na adọ aka na ntị maka tsunami na abịa nke ọ na agwa ndị mmadụ n’okporo ụzọ dị n’okpuru. +N’ime nkeji ole ma ole nnukwu mmiri dara n’akụkụ osimiri ahụ, buru ụlọ na ụgbọ ala. +Reuters enwenwughi ike inyocha nseta ahụ. +Ọmajiji na tsunami ahụ butere nnukwu mmebi n’ọkụ latrik nke gbubiri nkwukọrịta n’okirikiri Palu na eme ka ndị ikikere nwee nhịahụ na ịhazi mbọ ịzọpụta ndị mmadụ. +Ndị agha ebidola iziga ụgbọ elu eji ebu ibu bu ihe enyemaka sitere na Jakarta yana obodo ndị ọzọ, ndị ikikere kwuru, mana ndị gbara ọsọ ndụ ka chọrọ nri na akụrụngwa ndị ọzọ eji ebi ndụ ngwangwa. +Emepegharịala ọdụ ụgbọ elu nke obodo ahụ naanị maka mbọ ihe enyemaka, a ga-aga n’ihu mechie ya ruo Ọkt. +Onye Isi Ala Joko Widodo kwes���rị ịbịa n’ama mgbabata ọsọ ndụ ndị dị na Palu na Sọnde. +Ọnụọgụ Tsunami Indonesia Agafeela 800. +Ọ Jọrọ Oke Njọ. +Ebe ndị ọrụ World Vision si Donggala garuru n’obodo Palu na enweghị nsogbu, ebe ndị ọrụ ya na anara ndo n’okpuru mkpuchi tapọlin atọlitere na mpụga nke ụlọ ọrụ ha, ha gafere okirikiri nke mbibi n’ụzọ ha, Maazị Doseba kwuru. +O kwuru “ha gwara m na ha hụrụ ọtụtụ ụlọ emebiri,”. +Ọ jọrọ oke njọ. +Ọbụlagodi ka ndị otu enyemaka bidoro ọrụ nhịahụ nke ibido ụkwụ nke ihe enyemaka ọdachi, ụfọdụ kpesara na a na egbochi ndị ọrụ enyemaka mba ofesi nwere nka dị mkpa na ịga na Palu. +Site n’aka ndị iwu nke Indonesia, ego, ngwa na ndị ọrụ si na mba ofesi nwere naanị ike ibido ịga ma ọ bụrụ na akpọọ ebe nke mbibi ahụ ihe ogige ọdachi mba. +Nke ahụ emebeghị. +“Ọ ka bụ ọdachi ọkwa ogige,” Aulia Arriani kwuru, onye okwu okwu maka Red Cross nke Indonesia. +“Ozugbo gọọmentị ahụ kwuru, “Ọ dị mma, nke a bụ ọdachi mba,” anyị nwere ike imepe maka enyemaka ofesi mana enwebeghị ọkwa ọ bụla.” +Ka abalị nke abụọ dara na Palu ka ala ọmajiji na tsunami nke Fraịde mechara, ndị enyi na ezinụlọ nke ndị ka na efu jidere okwukwe na ndị ha hụrụ n’anya ga-abụ ọrụ ebube na akpalite mmụọ nke akụkụ ọjọọ nke ọdachi ekereụwa. +Na Satọde, akpapụtara otu obere nwa n’ime olulu. +Na Sọnde, ndị mgbata ọsọ enyemaka zọpụtara otu nwanyị nke akpadoro n’okpuru ahịhịa n’ime ụbọchị abụọ, n’akụkụ ya bụ ahụ nne ya. +Gendon Subandono, onye ndu nke ndị otu paraglaịdịn nke mba Indonesia, zụrụ mmadụ abụọ nke ndị paraglaịdas maka Egwuregwu Asia na efu, nke mechiri na mbido nke ọnwa a na Indonesia. +Ndị ọzọ nke ejidere n’okpuru Ụlọ Nkwari Akụ Roa Roa, Maazị Mandagi gụnyere, bụ ụmụ akwụkwọ. +“Dị ka onye ọkaibe n’ama paraglaidin, enwere nsogbu mmụọ nke m, o kwuru. +Maazị Gendon chetara otu, n’ime elekere ka akụkọ nke ọdịda Ụlọ Nkwari Akụ Roa Roa gbasara n’ime ogbe paraglaịdịn, o ji ọsọ zigara ndị asọmpi Palu ozi na WhatsApp, ndị na esonye n’emume akụkụ osimiri ahụ. +Ozi ya, agbanyeghị, dapụtara naanị n’otu nrịbama agba ntụ, kama nrịbama agba eluigwe dị mkpị. +“Echere m na nke ahụ pụtara na ezigaghị ozi ndị ahụ,” ka o kwuru. +Ndị oyi were $26,750 n’oge mkpojugharị ATM na Newport dị na Levee +Ndị oyi n’ụtụtụ Fraịde zuru $26,750 n’aka onye ọrụ Brink na ekpojugharị ATM dị na Newport na Levee, site na akụkọ ebuputere n’aka Ngalaba Ndị Uwe Ojii Newport. +Ọkwọ ụgbọ ala nke ụgbọ ala ahụ na ekpochapụ ATM dị n’ụlọ ntụrụndụ ahụ ma na akwadobe itinyekwu ego ọzọ, Onye Uwe Ojii. Dennis McCarthy dere na nkwupute ahụ. +Ka ọ nọ n’ọrụ, nwoke ọzọ “si n’azụ wụchibido onye ọrụ nke Brink ahụ” wee zuru akpa ego ezubere maka nnyefe. +Ndị akaebe hụrụ ọtụtụ ndị a na enyo enyo na agbapụ n’okirikiri ahụ, site na nkwupute ahụ, mana ndị uwe ojii akọwapụtaghị mmadụ ole so na mmereme ahụ. +Onye ọ bụla nwere ozi maka njirimara ha kwesịrị ịkpọtụrụ ndị uwe ojii Newport na 859-292-3680. +Kanye West: Rapa gbanwere aha ya ka ọ bụrụ Ye +Rapa Kanye West na agbanwe aha ya - ka ọ bụrụ Ye. +Na ekwupute mgbanwe ahụ na Twitter na Satọde, ọ dere: “Mmadụ amabu ka Kanye West.” +West, afọ 41, azaala Ye ka aha otutu ya n’oge nso nso a ma jiri aha otutu ahụ ka aha nke egwu nke asatọ ya, nke ebuputere na Juun. +Mgbanwe ndị ahụ na abịa tupu mpụta ya na Saturday Night Live, ebe atụrụ anya na ọ ga-ebupụta egwu ọhụrụ ya Yandhi. +Ọ na anọchi ọkụegwu Ariana Grande n’ihe ngosi ahụ onye kagburu “n’ihi ihe obi mmụọ,” onye mmepụta ihe ngosi ahụ kwuru. +Yanakwa ịbụ nkenke nke aha njirimara ya dị ugbu a, West ekwubuola na mkpụrụokwu ahụ nwere nghọta okpukperechi n’ebe ọ nọ. +“Ekwenyere m na ‘ye’ bụ mkpụrụokwu akachasị jiri n’ime Akwụkwọ Nsọ, n’ime Akwụkwọ Nsọ ọ pụtara ‘gị,”” West kwuru na mbido afọ a, mgbe ọ na akparịta maka aha egwu ya n’etiti onye njikwa redio Big Boy. +“Yabụ abụ m gị, abụ m anyị, ọ bụ anyị. +O si na Kanye, nke pụtara nke ọ bụ naanị ya, ịbụ naanị Ye - nke bụ ngosipụta nke mma anyị, njọ anyị, mgbagwoju anya anyị, ihe niile. +Egwu ahụ bụkwa ngosipụta nke onye anyị bụ.” +Ọ bụ otu n’ime rapa ndị ama ama gbanwere aha ha. +Amabụ Sean Combs ka Puff Daddy, P. Diddy ma ọ bụ Diddy, mana afọ a kwuru mmasị ya maka aha ndị Love na Brother Love. +Onye mmekọ Ọdịda Anyanwụ gara aga, JAY-Z, ejirila ma oge ụfọdụ ejighi akarauhie yana nnukwu mkpụrụedemede. +AMLO nke Mexico anwụọla iyi na ha agaghị eji ndị agha maka ndị nkịtị +Onye isi ala nke Mexico ahọpụtara ọhụrụ Manuel Lopez Obrador anwụọla iyi na ọ gaghị eji ndị agha ma ncha maka ndị nkịtị ka obodo ahụ na erute ụbọchị ncheta nke 50 maka omume ọjọọ emekwasara ụmụ akwụkwọ. +Lopez Obrador kwere nkwa na Satọde na Nnukwu Ụlọ Ahịa Tlatelolco na “ọ gaghị eji ndị agha iji megbuo ndị amaala Mexico.” +Ndị agha gbara egbe na ngagharị juru oyi a na eme na nnukwu ụlọ ahịa ahụ na Ọktoba 2, 1968, na egbu ruo ọnụọgụ ndị mmadụ 300 n’oge mmemme ụmụ akwụkwọ onye akaekpe na amalite na Latin America niile. +Lopez Obrador kwere nkwa ịkwado ndị ntorobịa Mexico site na ịnye ihe enyemaka kwa ọnwa maka ndị na agụ akwụkwọ ma mepekwuo mahadum ọhaneze bụ n’efu. +O kwuola na enweghị ọrụ yana enweghị ohere agụmakwụkwọ na adọba ndị ntorobịa n’otu ndị omekome. +U.S. kwesịrị iwegote ego A.I. ugboro abụọ +Ka China na adịkwu ire n’amamịghe echiche, ndị U.S. kwesịrị iwegotekwu ego ọ na emefu na nnyocha n’ogige ahụ, nke onye nkwado na onye na amụ AI bu Kai-Fu Lee kwuru, onye rugoro ọrụ na Google Microsoft na Apple. +Okwu ntụkwasa ahụ bịara ka ọtụtụ akụkụ nke gọọmentị U.S. mere nkwupute AI, ọbụlagodi na U.S. niile enweghị atụmatụ AI ama ama. +Otu aka ọzọ, China bubatara atụmatụ ya n’afọ gara aga: ọ na achọ ịbụ onye nke 1 na mweputa ọhụrụ AI tupu 2030. +“Iwegote ego nnyocha AI ugboro abụọ ga-abụ ezigbo mbido, ejiri n’aka na ndị obodo ndị ọzọ niile agateela aka ebe U.S. nọ, ma anyị na achọ ihe ịtụnanya na esote na AI,” Lee kwuru. +Iwegote ego ugboro abụọ nwere ike iwegote ohere na ntozu AI buru ibu na esote ga-abụ na U.S., Lee gwara CNBC n’ajụjụ ọnụ n’izu a. +Lee, onye akwụkwọ ya “AI Superpowers: China, Silicon Valley and the New World Order” nke ebipụtara n’ọnwa a site n’aka Houghton Mifflin Harcourt, bụ CEO nke Sinovation Ventures, nke tinyegoro ego n’ụlọ ọrụ AI akachasị mara na China, Face++. +Na 1980 na Mahadum Carnegie Mellon ọ rụrụ ọrụ na sistemụ AI nke meriri onye egwu Othello kachasị n’ọkwa na America, emechara ọ bụrụ onye isi oche na Microsoft Research yana onye isi nke ngalaba Google dị na China. +Lee kwenyere na asọmpi teknụzụ nke gọọmentị ndị U.S. dị ka Defense Advanced Research Projects Agency’s Robotics Challenge ma jụọ mgbe nke na esote ga-abụ, iji nyere aka chọpụta ndị agba ọhụụ na esote. +Ndị nyocha nọ na U.S. oge ụfọdụ na arụsị ọrụ ike iji rite elele ndị gọọmentị, Lee kwuru. +“Ọbụghị China na eweghara ndị isi agụmakwụkwọ; ọ bụ ndị ụlọ ọrụ,” Lee kwuru. +Facebook, Google na ụlọ ọrụ teknụzụ ndị ọzọ na ewere ndị ọkachamara na mahadum iji rụọ ọrụ na AI n’afọ nso nso a. +Lee kwuru na mgbanwe iwu mbata na ọpụpụ nwekwara ike ịnyere U.S. aka ịkwado mbọ AI ya. +“Echere m na ekwesịrị ịnye ndị nwere PhD na AI kaadị akwụkwọ ndụ na akpaghị aka,” ka o kwuru. +Nzụkọ Steeti nke China nyere Atụmatụ Ntolite Amamịghe Echiche Agbụrụ Na Esote na Julaị 2017. +National Natural Science Foundation nke China na enye ndị mmadụ nọ n’ewumewu agụmakwụkwọ ego otu ụzọ nke National Science Foundation na ọgbakọ gọọmentị ndị ọzọ si enye ndị nyocha U.S. ego, mana ogo nke ọrụ agụmakwụkwọ dị ala na China, Lee kwuru. +Na mbido afọ a ndị U.S. Ngalaba Nchedo mepụtara Njikọ Ọdụ Amamịghe Echiche, nke kwesịrị ijikọta ndị mmekọ si na ụlọ ọrụ yana agụmakwụkwọ, ndị White House kwuputere nhazi nke Ọgbakọ Ahọpụtara na Amamịghe Echiche. +N’ọnwa a DARPA kwuputere ntinye ego ijeri $2 n’ihe ọhụrụ akpọrọ AI Next. +Maka NSF, ugbu a ọ na etinye karịa nde $100 kwa afọ na nyocha AI. +Otu aka ọzọ, iwu U.S. chọrọ ịmepụta Ọgbakọ Nchedo Mba maka Amamịghe Echiche arụbeghị ọrụ ọ bụla n’ọtụtụ ọnwa. +Ndị Macedonia na atuli aka na nhọpụta ma a ga-agbanwe aha obodo ya +Ndị nke Macedonia tulili aka na nhọpụta na Sọnde ma a ga-agbanwe aha ya ka ọ bụrụ “Repọblik nke North Macedonia,” ihe ga-ekpezi esemokwu nọgoro ọtụtụ afọ n’etiti Greece ndị gbochigoro arịrịọ nsonye ya maka European Union na NATO. +Greece, nke nwere ogige akpọrọ Macedonia, na ekwusi ike na aha agbataobi ya nọ n’ugwu na egosipụta nzọrọ na mpaghara ya, o gbochiela mbanye ya na NATO yana EU. +Gọọmentị abụọ ahụ rutere nkwekọrịta na Juun dabere na aha ọhụrụ atụnyere, mana ndị iro bụ obodo n’isi na arụrịta ụka na mgbanwe ahụ ga-emebi njirimara agbụrụ nke ọnụọgụgụ ndị Slavic kachasị nke Macedonia. +Onye Isi Ala Gjorge Ivanov ekwuola na ọ gaghị atuli aka na nhọpụta ahụ, ọzọkwa mgbasa ozi mgbochi etinyela obi mgbagha ma ndị ga-apụta a ga-erukwa pasentị 50 achọrọ pekarịsịrị maka nhọpụta ahụ ịdị ire. +Ajụjụ dị n’akwụkwọ nhọpụta ahụ gụrụ: “Ị kwụnyere nsonye NATO na EU site na ịnabata nkwekọrịta dị n’etiti Greece.” +Ndị na akwado mgbanwe aha ahụ, gụnyere Praịm Minista Zoran Zaev, na arụrịta ụka na ọ bụ ụgwọ ekwesịrị ịkwụ iji sochie nnabata n’ewumewu ndị dị ka EU na NATO maka Macedonia, otu n’ime obodo ndị pụtara n’ọdịda nke Yugoslavia. +“Abịara m taa ituli aka maka ọdịnihu nke obodo anyị, maka ndị ntorobịa nọ na Macedonia ka ha nwee ike ibi ndụ otu ha chọrọ n’okpuru nche nke European Union n’ihi ọ pụtara ndụ ka mma maka anyị niile,” nke Olivera Georgijevska kwuru, 79, na Skopje. +Agbanyeghị ọdịghị n’okpuru iwu, ndị otu nke nzụkọ ọmeiwu zuru oke ekwuola na ha ga-asọpụrụ ndapụta nke ntuli aka ahụ iji mee ka ọ bụrụ ihe dị mkpa. +Mgbanwe aha ahụ ga-achọ ụzọ abụọ n’ọkara ụzọ atọ nke nzụkọ ọmeiwu dị ukwuu. +Ọgbakọ ntuli aka steeti kwuru na enwebeghị mkpesa nke mpụ n’ebe 1 ehihie. +Kaosiladị, mpụta dị naanị na pasentị 16, tụlee pasentị 34 na ntuli aka nzụkọ ọmeiwu gara aga na 2016 mgbe pasentị 66 nke ndị ntuli aka edebanyere n’akwụkwọ tinyere akwụkwọ ntuli aka ha. +“Apụtara m ituli aka n’ihi ụmụaka m, ọnọdụ anyị bụ na Europe,” ka Gjose Tanevski kwuru, 62, onye ntuli aka n’isi ala, Skopje. +PM nke Macedonia Zoran Zaev, nwunye ya Zorica na nwa nwoke ya Dushko tinyere akwụkwọ ntuli aka ha maka nhọpụta ahụ na Macedonia maka ịgbanwe aha nke obodo ahụ nke ga-emepe ụzọ maka ya isonye NATO yana Europenan Union in Strumica, Macedonia Septemba 30, 2018. +N’ihu nke nzụkọ ọmeiwu na Skopje, Vladimir Kavardarkov 54, nọ na akwadobe obere nyiwe, na ebute oche n’ihu ụlọ akanya nke ndị chọrọ igbochi nhọpụta ahụ tọrọ. +“Anyị kwụnyere NATO na EU, mana anyị chọrọ iji ugwu wee banye, ọbụghị site n’ụzọ ọrụ” Kavadarkov kwuru. +“Anyị bụ obodo na enweghị ego, mana anyị nwere ugwu. +Ọ bụrụ na ha achọghị ịnabata anyị ka Macedonia, anyị nwere ike ịchọ ndị ọzọ dị ka China na Russia ma bụrụ akụkụ nke ngwakọta Euro-Asia.” +Praịm Minista Zaev kwuru nsonye NATO ga-ebute ntinye ego achọrọ na Macedonia, nke nwere oke enweghị ọrụ karịrị pasentị 20. +“Ekwenyere m n’ọtụtụ ndị mmadụ ga-amasị ya n’ihi karịa pasentị 80 nke ndị amaala anyị chọrọ EU na NATO,” Zaev kwuru ka ọ tụchara akwụkwọ ya. +O kwuru na nsonaazụ “ee” ga-abụ “nkwenye nke ọdịnihu anyị.” +Nyocha ebipụtara na Mọnde gara aga sitere n’aka Ewumewu maka Nyocha Iwu nke Macedonia kwuru n’etiti pasentị 30 na 43 nke ndị ntuli aka ga-esonye na nhọpụta ahụ - na erughi mpụta achọrọ. +Nyocha ọzọ, Telma TV nke Macedonia mere, hụrụ na pasentị 57 nke ndị nzaghachi na ahazi ituli aka na Sọnde. +Na nke ahụ, pasentị 70 kwuru na ha ga-atụnye ee. +Ka nhọpụta ahụ gaa nke ọma ndị ga-apụta kwesịrị ịbụ pasentị 50 gbakwunye otu ntuli aka. +Ọdịda na nhọpụta ahụ ga-egosi nnukwu nsogbu izizi maka iwu nke gọọmentị na akwado ndị Odịda Anyanwụ kemgbe ọ nọchiri na Mey afọ gara aga. +Lelee: Sergio Aguero nke Manchester City gafere ndị defensị Brighton niile maka goolu +Sergio Aguero na Raheem Sterling tufuru defensị Brighton na mmeri 2-0 nke Manchester City na Satọde na Ama Egwuregwu Etihad na Manchester, England. +Aguero mere ka ọ dị nnukwu mfe iji nye goolu na nkeji nke 65. +Strịka nwa Argentina ahụ nwetara bọọlụ n’etiti ama egwuregwu na mbido nke usoro ahụ. +Ọ gbara ọsọ n’etiti defensi Brighton atọ, tupu ọ gbabanye n’ogige mepere emepe. +Aguero hụrụ onwe ya ka ndị yi uwe elu na acha agba akwụkwọ ndụ gbara ya okirikiri. +Ọ kwapụrụ otu defensị tupu ọ gbanarị ọtụtụ ndị ọzọ n’isi nke bọksị Brighton. +Mgbe ahụ ọ gbara bọọlụ n’akaekpe ya, chọta Sterling. +Nwa Bekee ahụ jiri mmetụ izizi ya n’ime bọksị ahụ iji nyeghachi Aguero bọọlụ ahụ, onye nke ji akpụkpụ ụkwụ akanri ya iji gafere kipa Brighton bụ Mathew Ryan site na iji otu ọgbụgba gara n’akụkụ akanri nke net ahụ. +“Aguero nwere ụfọdụ nsogbu n’ụkwụ ya,” Onye njikwa City Pep Guardiola gwara ndị nta akụkọ. +“Anyị kwuru maka ya ịgba ya nkeji 55, 60. +Nke ahụ bụ ihe mere. +Anyị nwere ihu ọma na ọ nyere goolu ahụ n’oge ahụ.” +Mana ọ bụ Sterling bụ onye nyere Sky Blues uru izizi na asọmpi Premier League. +Goolu ahụ bịara na nkeji 29. +Aguero nwetara bọọlụ n’ime ogige Brighton n’egwuregwu ahụ. +O zigara ọmarịcha bọọlụ n’akụkụ akaekpe gakwuru Leroy Sane. +Sane metụrụ ya ole ma ole tupu o duru Sterling gaa n’isi post ahụ. +Onye ihu Sky Blues ahụ kụbanyere bọọlụ ahụ n’ime net tupu ọ mịpụ n’ogige atọrọ. +City ga-ezute Hoffenheim n’ọkwa izizi nke Champions League na 12:55 ehihie, na Tusde na Rhein-Neckar-Arena dị na Sinsheim, Germany. +Scherzer chọrọ izute spoiler vs. Rockies +Ka ewepuru Nationals na asọmpi onye mmeri, enweghịzị ihe ga-eme iji kwanye mbido ọzọ. +Mana onye nnukwu asọmpi Scherzer na atụ anya irigo akwa na Sọnde n’egwuregwu yana Colorado Rockies, mana naanị ma ọ bụrụ na enwere ndapụta egwuregwu onye mmeri maka Rockies, ndị ji otu mmeri egwuregwu n’elu Los Angeles Dodgers na NL West. +Rochies ritere opekata mpe ohere kaadị nhọrọ site na iji mmeri 5-2 n’elu Nationals n’abalị Fraịde, mana ha ka na achọ ịkwechiri iko ngalaba izizi ha. +“Ọbụlagodi na anyị enweghi ihe anyị na achụ, opekata mpe anyị nwere ike igwu egwu mara na okirikiri ebe a na Denver dị n’etiti igwe mmadụ yana ndị otu ndị ọzọ ga-abụ igwu egwuregwu dị n’ọkwa kachasị n’oge ọ bụla m ga-ezute n’afọ a. +Gịnị kpatara na m agaghị achọ isonye na nke ahụ?” +Ndị Nationals ka na eche ikwupute onye mbido maka Sọnde, mana ekpesara na dabere na Scherzer tinye ọnụ n’ọnọdụ ahụ. +Scherzer, onye nke ga-eme mbido nke 34 ya, tinyere oge mgbatị ahụ na Tọsde, ọ ga-atụ bọọlụ na Sọnde bụ oge izu ike ya. +Onye akanri nke Washington bụ 18-7 nwere 2.53 ERA yana nkụpụta 300 na ịnịns 220 2/3 n’afo a. +Trump gbakọrọ ọhaneze na West Virginia +Onye isi ala rụtụrụ aka n’ụzọ ọzọ n’ọnọdụ ahụ metụtara nhọpụta Brett Kavanaugh maka Ụlọ Ikpe Kachasị ebe ọ na ekwu maka mkpa nke mpụta ndị Repọblikan na ntuli aka etiti afọ. +“Ihe niile anyị megoro nwere ike imebisi na Nọvemba. +Izu ise fọdụrụ tupu otu ntuli aka kachasị mkpa na ndụ anyị. +Nke a bụ otu n’ime ihe ndị buru ibu, buru ibu -- anaghị m apụta mana m na apụta ya mere m ji nọrọ n’ebe niile na alụ ọgụ maka ndị ahọpụtara mara oke mma, “o kwuru. +Trump gara n’ihu, “Ị hụrụ otu ndị nnupu isi a jọrọ oke njọ bụ Demokrats, ị na ahụ ka ọ na eme ugbu a. +Ha gbadosiri anya ike na iweghachi ike site n’ụzọ ọ bụla enwere ike, ị hụrụ obi akpọ ha, omume ọjọọ ahụ. +Ha achọghị ịma onye ha mejọrọ, onye ha ga-arị elu iji nweta ike na njikwa, nke ahụ bụ ihe ha chọrọ ike na njikwa, anyị agaghị enye ha ya.” +Demokrats, o kwuru, nọ na njem iji “gbochie ma kwụchibido.” +“Ma ị hụrụ n’ofe ụbọchị anọ gara aga,” o kwuru, na akpọ ndị Demokrats “ndị iwe, obi akpọ, ndị njọ yana ndị na anaghị ekwu eziokwu.’ +Ọ kpọrọ aha Demokrat dị elu Ọmeiwu Dianne Feinstein nke Ọgbakọ Ndị Ikpe Nzụkọ Ọmeiwu, nke nwetere nnukwu mkpu n’aka ndị igwe mmadụ ahụ. +“Ịchetara azịza ya? +I kpughepuru akwụkwọ ahụ? +Uh, uh, gịnị. +Mba, uh mba, m chere otu - enwere ngosi ahụ jọrọ njọ - ngosi ahụ kachasị njọ m hụgoro.” +Labour abughịzị ụka gbasara agbasa. +Ọ naghị anabata ndị na ekwu uche ha +Mgbe ndị nkwụgide Momentum nọ na ndọrọndọrọ mpaghara m tụnyere aka ka adachie ọnụ m, ọ bụghị ihe ntụmadị. +Elee anya, abụ onye nke kachasị ọhụrụ n’ahịrị nke MP ndị Labour agwara na anabataghị - naanị maka ikwu uche anyị. +Ka onye otu m na nzụkọ ọmeiwu Joan Ryan nwetara otu omume ahụ n’ihi na ọ kwụdosiri ike n’ịjụ semitism. +N’okwu nke m, ntimiwu mgbochi ahụ katọrọ m maka ịjụ Jeremy Corbyn. +Na mkpa nke iwu akụnụba obodo ziri ezi, nche obodo, yana Europe, n’ụzọ ọzọ otu nsogbu ndị Jeremy jiri na ekwenyeghị na ndị isi gara aga. +Ọkwa maka nzụkọ Nottingham East Labour na Fraịde kwuru na “anyị chọrọ nzụkọ ndị ahụ bụrụ nke dum ma mịpụta mkpụrụ.” +N’imirikiti afọ asatọ m ka MP Labour mpaghara ahụ, abalị Fraịde nzụkọ GC na abụkarị nke ahụ. +Na mwute taa, ọ bụghị olu nke imirikiti nzụkọ yana ndọrọndọrọ “obi ọma, ume ala” ekwere na nkwa bụ ihe ndị echefugoro kemgbe ma ọ bụrụ, n’ezie, o bidoro ma ncha. +Ọ bụ ihe pụtara ihie nke ukwuu na anaghị anabata nghọta dị iche iche na ndọrọndọrọ Labour, ọzọkwa a na ekpezi echiche ọ bụla ma a ga-anabata ya n’ọchịchị ndọrọndọrọ ahụ. +Nke a bidoro ozugbo Jeremy bụrụ onye isi, ndị ọrụ ibe m, ndị m chere na mụ na ha na ekekọrịta otu nghọta ndọrọndọrọ bidoro tụba anya na m ga-atụgharị ozugbo ma were ọnọdụ ndị m ga-agaghị ekwekọrịta na ya otu ọ bụla - ma ọ bụ na nchedo obodo ma ọ bụ otu ahịa EU. +Mgbe ọ bụla m kwuru okwu n’ọhaneze - ọ gaghị agbasata ihe m kwuru - a na enwe nkwụtọ dị ukwuu na esote ozugbo n’ebe mmerịkọta ọhaneze na akpọ maka mwepu, nkatọ ndọrọndọrọ nke etiti, na agwa m na m ekwesịghị ịnọ na ndọrọndọrọ Labour. +Ma nke a abụghị naanị m. +N’ezie, ama m na m ka nwee ihu ọma karịa ụfọdụ ndị ọrụ ibe m n’ihi asịsa ndị ezitere m na abụkarị maka ndọrọndọrọ. +Enwere m ntụmanya n’arụmọrụ na mkpebi nke ndị ọrụ ibe m ndị ahụ na enweta nkatọ okike mmadụ ma ọ bụ agbụrụ ya kwa ụbọchị mana ha anaghị agba ọsọ. +Otu n’ime akụkụ kachasị ada mmụọ nke oge ndọrọndọrọ a bụ otu okwu nkatọ ndị jọrọ njọ si buru ihe nkịtị. +Jeremy Corbyn na arịọ n’izu gara aga na ndọrọndọrọ Labour kwesịrị ịmụta omume nke ndidi. +Eziokwu bụ na anyị abụghịzị ụka ahụ gbasara agbasa, kwa ụkpụrụ “enweghị ntụkwasị obi” ọ bụla ma ọ bụ mgbanwe nke iwu nhọrọ, ndọrọndọrọ ahụ na akpụkọkwa akpụkọ. +Enwere m ọtụtụ ndụmọdụ n’ofe afọ abụọ gara aga na agwa m ka m owe isi n’ala, ịhapụ ikwu oke okwu mgbe ahụ ‘m agaghị enwe nsogbu.” +Mana nke ahụ abụghị ihe m banyere ndọrọndọrọ ọchịchị ịme. +Kemgbe m sonyere Labour afọ 32 ka nwa akwụkwọ, nke nlegharị anya gọọmentị Thatcher kpalitere, nke hapụrụ ime ụlọ akwụkwọ m na nnukwu mmebi, achọrọ m na mbụ idu ọrụ mara mma nke ọhaneze maka ndị kachasị chọọ ha - ma abụ m onye ndu obere mpaghara ma ọ bụ minista gọọmentị. +Ezobeghị m ndọrọndọrọ ọchịchị m na mbụ, gụnyere ntuli aka ikpeazụ. +Ọnweghị onye ọ bụla nọ na Nottingham East ga-enwe mgbagwoju anya gbasara ọnọdụ iwu m yana mpaghara ndị mụ ekwenyeghị n’ọchịchị dị ugbu a. +Maka ndị ahụ kwadoro ụkpụrụ ahụ na Fraịde, ihe niile m nwere ike ikwu bụ na mgbe obodo na aga ịnwe Brexit ga-enwe mmetụta adịghị mma n’ọtụtụ ezinụlọ, azụmahịa na ọrụ ọhaneze anyị, aghọtaghị m agụụ iji gbuo oge na ike maka nkwado m na ndị isi ndọrọndọrọ Labour. +Mana n’eziokwu otu ozi m nwere abụghị maka Nottingham Momentum, ọ bụ maka ndị mmebe m, ma ọ bụ ndị otu Labour ma ha abụghị: Enwere m afọ ojuju ijere unu ozi ma na ekwe nkwa na ọnweghị ihe egwu mwepu ole ma ọ bụ ngwangwa ndọrọndọrọ ga-akwụsị m ịme ihe m kwere kachasị dịịrị unu niile mma. +Chris Leslie bụ MP maka Nottingham East +Ayr 38 - 17 Melrose: Ayr na ahụbeghị ọdịda agaala n’isi +Ọnwụnwa abụọ na abịaghị n’oge emebiela nsonaazụ ikpeazụ obere, mana enweghị mgbagha na Ayr kwesịrị imeri na asọmpi nke taa Tennent’s Premiership a tọrọ oke ụtọ. +Ugbu a ha nọ n’isi tebul, naanị otu ndị emeribeghị n’asọmpi iri. +Na ngwụcha, ọ bụ difensị ha ka sie ike, yanakwa iwere ohere ha ka mma, nke burulu ndị ahụ nọ n’ụlọ, yana onye ndu Peter Murchie nwere ikike niile ịnwe obi ụtọ. +“Anwaala anyị n’ofe egwuregwu anyị ruo ugbu a, emeribeghị anyị, yabụ obi juru n’anụrị,” ka o kwuru. +Robyn Christie nke Melrose kwuru: “Ekele dịịrị Ayr, ha were ohere ha karịa ole anyị mere.” +Ọnwụnwa nkeji 14 nke Grant Anderson, nke Frazier Climo mezuru n’isi, tinyere Ayr n’ihu, enyere kaadị edo-edo maka onye isi Scotland Rory Hughes, nke ndị Warriors hapụrụ maka egwuregwu ahụ, nyere Melrose ohere ịme ka ọnụọgụ nyere ha aka, ma Jason Baggot nwetere ọnwụnwa emezughi n’isi. +Climo dọtịrị ndu Ayr ahụ site na iji penalti, tupu, ozugbo n’ọkara oge, ọ nyere goolu wee mezuo ọnwụnwa naanị ya iji mee ya 17-5 nke Ayr na nkejioge. +Mana Melrose bidoro agba nke abụọ nke ọma yanakwa ọnwụnwa Patrick Anderson, nke Bagoot mezuru n’isi, belatara oghere ahụ ka ọ bụrụ akara ise. +Enwere nnukwu ogbugbu oge maka nnukwu mmerụ ahụ Ruaridh Knott nwetara, onye nke ebupuru, na mmalitegharị, Ayr gatere aka site na ọnwụnwa Stafford McDowall, nke Climo mezuru n’isi. +Osote kaptịn Ayr bụ Blair Macpherson nwetara kaadị edo-edo, ọzọkwa, Melrose mekwara ka nwoke ọzọ baa uru site na ọnwụnwa Bruce Colvine emezughi, na ngwụcha nke oge nnukwu ọkụ ahụ. +Otu ahụ nọ n’ụlọ laghachitere, kaosiladị, mgbe enyere Struan Hutchinson kaadị edo-edo maka ịgba Climo ụkwụ onye na ejighi bọọlụ, na mpụga nke ahịrị penalti, MacPherson daturu n’azụ nke nsogbu Ayr na abịa ihu. +Climo gbanyere ya, dị ka ọ mechara ntakịrị ọzọ na mbidogharị, ka Kyle Rowe jidere ọgbụgba n’ime bọksị nke David Armstrong wee zipu onye nke akụkụ Gregor Henry maka ọnwụnwa nke ise nke otu ahụ nọ n’ụlọ. +Onye nke Still Game ama ama chọrọ ọrụ ọhụrụ n’ụlọ ọrụ oriri na ọṅụṅụ +Onye nke Still Game ama ama bụ Ford Kieran chọrọ ịbanye n’ụlọ ọrụ nlekọta ka achọpụtachara na akpọọla ya ka onye nduzi nke ụlọ ọrụ oriri na ọṅụṅụ enyere ikikere. +Onye afọ 56 ahụ mere Jack Darvis n’ihe ngosi BBC ama ama, nke ọ dere ma sonyere onye mmekọ ihe ọchị bụ Greg Hemphill. +Mmadụ abụọ ahụ ekwuputela na nsotanso nke itoolu na abịa ga-abụ nke ikpeazụ n’usoro ihe ngosi ahụ, ọ pụtara na Kiernan na ahazi maka ndụ mgbe Craiglang bịara na njedebe. +Site n’aka ndepụta ndekọ ziri ezi, ọ bụ onye nduzi nke Adriftmorn Limited. +Omenka ahụ jụrụ ikwu okwu maka akụkọ ahụ, agbanyeghị onye isi akụkọ Scottish Sun tụnyere na Kiernan na achọ isonye “n’azụmahịa ụlọ oriri na ọṅụṅụ nke Glasgow na eme nke ọma.” +“Osimiri ahụ bụ nke anyị’: Bolivia ala gbara okirikiri na atụ anya na ụlọ ikpe ga-emepegharị ụzọ gara Pasifik +Ndị ụgbọ mmiri na agagharị isi ụlọ ọrụ ndị agha mmiri ụgbọ juru na La Paz. +Ụlọ ọhaneze na efegharị ọkọlọtọ nnukwu osimiri na acha agba eluigwe. +Ọdụ ndị agha mmiri site na Titicaca ruo Amazon juputara na ekuku: “Osimiri ahụ bụ anyị site n’ikike. +Iweghachite ya bụ ọrụ.” +N’okirikiri Bolivia niile ala gbara okirikiri, ncheta nke akụkụ mmiri etufuru n’aka Chile n’esemokwu ekereụwa nke narị afọ 19 jọrọ oke njọ ka pụtara ihie - otu ahụ ka agụụ ịkwọ ụgbọ na Nnukwu Osimiri Pasifik otu ugboro ọzọ si dị. +Ntụmanya ndị ahụ ikekwe kachasị ugbu a n’ime afọ iri, ka Bolivia na eche mkpebi nke ụlọ ọrụ ofesi nke akwụmọtọ na Ọktoba 1 ka afọ ise nrụrịta ụka gachara. +“Bolivia ji agbamume ugbu a, mmụọ nke ịdị n’otu na ume ala, makwa jiri nlele dị mma wee na atụ anya ndapụta ahụ,” nke Roberto Calzadilla kwuru, onye nnọchite anya nke Bolivia. +Imirikiti ndị Bolivia ga-elele mkpebi ICJ n’ihuenyo buru ibu n’ofe obodo ahụ niile, na atụ anya na ụlọ ikpe ahụ dị na The Hague ga-eme nchọpụta na mmasị nke ebubo nke Bolivia na - ka ọtụtụ afọ iri nke okwu dị mma gachara - Chile nwere mmanye ịkparịta nkata na enye Bolivia ụzọ nnwere onwe gara n’osimiri. +Evo Morales, onye isi ala nke amaala Bolivia na adọrọ mmasị - onye na eche ọgụ siri ike maka nhọpụtagharị ntuli aka n’afọ na esote - nwekwara ọtụtụ ihe ọ na adabere na mkpebi nke Mọnde. +“Anyị nọ nso na ịlaghachi na Nnukwu Osimiri Pasifik,” ọ ṅwụrụ iyi na Ọgọst gara aga. +Mana ụfọdụ ndị nyocha kwenyere na ụlọ ikpe ahụ nwere ike ha agaghị enye mkpebi ga-amasị Bolivia - na obere ihe ga-agbanwe ma ọ bụrụ na ha mere. +Ewumewu ahụ nọ na Netherland nwere ikike iji nye mpaghara Chile, ọ kọwara na ọ gaghị ekpebi ndapụta nke okwu ndị nwere ike ịdị. +Na mkpebi nke ICJ na abịa naanị ọnwa isii ka anụchara ụbụbọ ndị ikpeazụ na egosi na okwu ahụ “agbagwojughi anya,” Paz Zárate kwuru, onye ọkachamara Chile n’iwu ofesi. +Nke tere aka na ịkwado ebumnuche ndị Bolivia, afọ anọ gara aga nwegoro ike ịdọghachi azụ. +“Okwu nke ịnweta ụzọ osimiri bụ nke ndị nchịkwa Bolivia nọ ugbu a weghagoro n’ike,” Zárate kwuru. +Okwu ụtọ bụ asị nke Morales na akpasu iwe amịala amara onye Chile ọ bụla fọdụrụ, ọ tụnyere. +Bolivia na Chile n’otu oge ga-amalitekwa na ekwu okwu, mana ọ ga-esi nnukwu ike ịnwe mkparịta ụka ka nke a mechara. +Obodo abụọ ahụ agbanwetabeghị onye nnọchite obodo kemgbe 1962. +Onye isi ala gara aga Eduardo Rodríguez Veltzé, onye nnọchite nke Bolivia na The Hague, jụrụ alo na ịme mkpebi nke ụlọ ikpe ahụ na adịkebe ọsọ. +Mọnde ga-ewetere Bolivia “ohere pụrụ nnukwu iche iji mepee oge ọhụrụ na mmerịkọta n’etiti Chile” yana ohere iji “kwụsị afọ 139 nke esemokwu nwere elele nwekọrịta,” o kwuru. +Calzadilla gọnarịkwara na Morales - onye ka bụ otu ndị isi ala nke Latin America akachasị mara - na eji okwu mmiri ahụ ka nkwado ndọrọndọrọ ọchịchị. +“Bolivia agaghị ahapụ ikike ya iji nweta ụzọ gara Nnukwu Osimiri Pasifik,” o tinyere. +“Mkpebi ahụ bụ ohere iji hụ na anyị kwesịrị imeri ihe ndị gara aga.” +Ndị North Korea ekwuola na nkwasa ngwa agha nuklịa agaghị eme belụsọ na ha enwere ntụkwasị obi na US +Minista Ofesi nke North Korea Ri Yong Ho kwuru na mba ya agaghị eburu ụzọ ma ncha kwasaa ngwa agha nuklịa ma ọ bụrụ na ọ nweghị ike ịnwe ntụkwasị obi na Washington. +Ri nọ na ekwu na Satọde na Mgbakọ Ezumezu nke United Nations. +Ọ kpọrọ ndị United States ka ha mezuo nkwa ha mere na n’ọgbakọ ahụ na Singapore n’etiti ndị isi ahụ na ama aka. +Okwu ya na abịa ka ndị US. Ọde Akwụkwọ nke Steeti Mike Pompeo dị ka ọ nọ nso na ibidogharị mkparịta ụka nuklịa kpọchiri akpọchi kemgbe n’ime ọnwa atọ ka Singapore gachara n’etiti Kim Jong Un nke North Korea. +Ri kwuru na ọ bụ “nrọ efu” na ntaramahụhụ gara n’ihu yana mgbochi U.S. na nkwupute nkwụsị nke Ọgụ Korea ga-ebute North n’ikpere ya. +Washington na akpachapụ nnukwu anya ịkwenye na nkwupute ebe Pyongyang emebeghị ihe doro anya na nkwasasị. +Kim yana U.S. Onye isi ala Donald Trump chọrọ nzụkọ nke abụọ. +Mana enwere obi mgbagha gbasara agbasa na Pyongyang dị njikere ịjụ ngwa agha nke obodo ahụ nwere ike ị na ahụ ka naanị ụzọ iji chedo onwe ya. +Pompeo na akwadobe ịga Pyongyang n’ọnwa na abịa iji kwadobe nzụkọ Kim-Trump nke abụọ. +Ihe ngosi ekike gosiri ahịrị kachasị ọhụrụ na nnukwu uwe isi na abịa Okporo Dị Elu nọketere gị +Ọ bụrụ na ị chọrọ iwegote mkpokọta okpu gị ma ọ bụ gbochie anwụ kpamkpam, achọna ebe ọzọ. +Ndị ọmebe ekike Valentino na Thom Browne kpughepuru ikpo uwe isi jọrọ njọ maka mkpokọta SS19 ha n’okporo nke masịrị nka atọrọ na Izu Ekike Paris. +Okpu ndị na atụ n’anya ejula Instagram n’ọkọchị a, ma ndị ọmebe ekike ndị a ezipula mmepụta ha dị egwu n’ụzọ warawara. +Okpu nke Valentino pụrụ iche bụ okpu beji dị egwu etinyere okpuru okpu dị obosara dị ka nku kpuchiri isi model ndị ahụ. +Ngwa ndị ọzọ buru oke ibu gụnyere anyụ akwanyere ọla mma, okpo amusu yana nfueru - mana emeghị ka ha nye isi gị okpomọkụ. +Thom Browne gosikwara ihe mkpuchi na ụtọ ụjọ - ọ bịara n’oge maka Halloween. +Imirikiti mkpuchi ihu ndị ahụ mara mma nwere egbugbere ọnụ akwachiri akwachi wee yie Hannibal Lecter karịa haute couture. +Otu mmepụta yiri uwe eji adakpu n’ala mmiri n’uju ma nwee snọkel na ugogbe anya, ebe ọzọ yiri iko aịs krim gbazere agbaze. +Ma ị gaa n’ihu na nkwupute ekike ahụ dị elu - ị nwere ihu ọma. +Ndị nlele ụdị ekike buru amụma na nnukwu mkpuchi ndị ahụ nwere ike ịbịarute n’okporo ndị dị elu nọketere gi. +Okpu ndị basara abasa na abịa ozugbo na ngafe ‘La Bomba’, okpu ahịhịa nwere okpuru dị nzọụkwụ abụọ n’obosara nke ahụgoro n’ahụ mmadụ niile bido na Rihanna ruo Emily Ratajkowski. +Akara nkwekọrịta kwadoro okpu ahụ na adịghị mma maka ojiji ebuputere n’ebe mgbasa ozi ọhaneze zipuru nnukwu mmepụta ọzọ n’okporo ngosipụta - agba akụkụ osimiri ahịhịa buru ibu ruo ka mọdel yi uwe eji egwu mmiri bu ya. +Akpa raffia orenji gbara ọkụ, eji gịrịgịrị raffia dozie ma tinye ya aka akpụkpụ anụahụ dị ọcha, bụ ihe kwụpụrụ iche na mkpokọta SS19 nke Jacquemus’ La Riviera na Izu Ekike Paris. +Onye na eyi ndị ama ama uwe bụ Luke Armitage gwara FEMAIL: “M na atụ anya ịhụ nnukwu okpu na akpa akụkụ osimiri irute n’okporo ụzọ dị elu maka ọkọchị na esote - ebe onye ọmebe ekike ahụ enweela nnukwu mmetụta ọ ga-esi ike ịleghara ọchụchọ nke ihe enyemaka ndị buru oke ibu.’ +John Edward: Nka asụsụ dị mkpa maka ndị amaala ụwa +Ụlọ akwụkwọ nnwere onwe nke Scotland dowere ndekọ nzọụkwụ nke agụmakwụkwọ kachasị, ma nke a gara n’ihu na 2018 site na iji nsonaazụ ule ndị mara oke mma, nke a na agụzogide site na mmeri ndị mmadụ na ndị otu n’egwuregwu, nka, egwu na mbọ ogbe ndị ọzọ. +Na mgbago ọnụọgụ nke ụmụ akwụkwọ 30,000 n’ofe Scotland, ụlọ akwụkwọ ndị a, nke The Scottish Council of Independent Schools (SCIS) na anọchite, na agba mbọ iwete ọkwa ọrụ kachasị maka ụmụ akwụkwọ ha na ndị nne na nna ha. +Ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe na agba mbọ ịkwadobe ụmụ akwụkwọ maka agụmakwụkwọ ọdịnihu na nke dị elu, ọrụaka ha họpụtara yana ọnọdụ ha ka ndị amaala ụwa. +Dị ka ngalaba agụmakwụkwọ nwere ike izube ma tinye usoro ọmụmụ nke ụlọ akwụkwọ dị elu, anyị na ahụ asụsụ ọhụụ ka ọ na aga n’ihu ka nke na akpọtụ yana isiokwu nke nhọrọ achọrọ n’ime ụlọ akwụkwọ. +Nelson Mandela kwuru: “Ọ bụrụ na ịgwa nwoke okwu n’asụsụ ọ matara, nke ahụ na aga n’isi. +Ọ bụrụ na ịgwa ya okwu n’asụsụ nke ya, nke ahụ na aga n’obi.” +Nke a bụ nnukwu ncheta na anyị enweghị ike ịdabere na Bekee mgbe anyị na achọ ịmebe mmekọrịta na ntụkwasị obi n’etiti ndị mmadụ si na obodo ndị ọzọ. +Bido na nsonaazụ ule nke afọ a dị nso nso, anyị nwere ike ịhụ na asụsụ na agachasị na tebul asọmpi ahụ nke nwere ogo ntozu kachasị n’ime ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe. +Mgbakọta nke pasentị 68 nke ụmụ akwụkwọ ndị gụrụ asụsụ ofesi nwetara akara A Dị Elu. +Data, anakọtara n’aka ụlọ akwụkwọ 74 sonyere na SCIS, gosiri na pasentị 72 nke ụmụ akwụkwọ nwetara akara A Dị Elu na Mandarin, ebe pasentị 72 nke ndị na agụ German, pasentị 69 nke ndị na agụ French na pasentị 63 na agụ Spanish nwetara A. +Nke a na egosi na ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe nọ na Scotland na akwado asụsụ ofesi ka nka dị mkpa nke ụmụaka na ndị ntorobịa ga-ejiriri n’ọdịnihu. +Asụsụ ugbu a, dị ka nhọrọ isiokwu, ka a na ahụta n’otu anya ka isiokwu ndị STEM (sayensị, teknụzụ, ịnjinịarịn na mgbakọ na mwepu) n’usoro ọmụmụ ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe yana n’ebe ndị ọzọ. +Nyocha nke Ụlọ Ọrụ UK maka Arụmọrụ na Nka na 2014 hụrụ na ihe ndị na ewe n’ọrụ nyere ka ihe na egbochi ha na ikpoju ohere ọrụ, ekenyere pasenti 17 na ụkọ nka asụsụ. +Ya mere ọtụtụ oge, nka asụsụ na abụkwazị ihe dị mkpa maka ndị ntorobịa iji kwadobe onwe ha maka ọrụaka ọdịnihu ha. +Ebe ọtụtụ ohere ọrụ ndị nwere ike ịpụta na achọ asụsụ, nka ndị a dị mkpa n’ụwa azụmahịa. +Agbanyeghị ọrụaka mmadụ họrọ, ọ bụrụ na ha mụtara asụsụ nke abụọ, ha ga-enwe nnukwu uru n’ọdịnihu n’ihi ịnwe nka ogologo ndụ dị ka nke a. +Ịnwe ike ikwukọrịta okwu ozugbo n’etiti ndị mmadụ si mba ofesi ga-etinye mmadụ na asụ ọtụtụ asụsụ n’ihu ndị ya na ya na ama aka ozugbo. +Site na nhọpụta YouGov nke ndị okenye karịrị 4,000 na 2013, pasentị 75 enwenwughi ike ịsụ asụsụ ofesi ole zuru oke iji kpaa nkata, ebe French bụ naanị asụsụ nwere mkpụrụọnụọgụ pasentị gbara mkpị, pasentị 15. +Nke a kpatara itinye ego na nkuzi asụsụ ugbu a dị mkpa maka ụmụaka taa. +Ịnwe ọtụtụ asụsụ, karịchara ndị akụnụba obodo na etolite, ga-akwadobe ụmụaka site na ịnye ha ohere ka mma na ịchọta ọrụ bara uru. +N’ime Scotland, ụlọ akwụkwọ ọ bụla ga-adị iche n’asụsụ ha na akuzi. +Ụfọdụ ụlọ akwụkwọ ga-agbado anya karịa n’asụsụ ọhụụ, ebe ndị ọzọ ga-akuzi asụsụ ndị a na ahụta ka ndị kachasị mkpa maka UK mgbe a na ele anya n’ihu na 2020, dị ka Mandarin ma ọ bụ Japanese. +Ihe ọ bụla bụ mmasị nwata gị, a ga-enwerịrị ọnụọgụ asụsụ ndị a ga-esi na ha họrọ n’ime ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe, ga-enwe ndị nkuzi bụ ọkachamara na mpaghara a. +Ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe nke Scotland wepụtara onwe ha na iwete gburugburu mmụta ga-akwadobe ụmụaka ma jiri nka ndị achọrọ wee kwadobe ha iji mee nke ọma, ihe ọ bụla ọdịnihu wetere. +Enweghị ike ịgọnarị ya n’oge a, na gburugburu azụmahịa ụwa, na asụsụ gara n’ihu na adị oke mkpa n’ọdịnihu nke obodo, yabụ ekwesịrị igosipụta nke a n’agụmakwụkwọ. +N’ezie, ekwesịrị ịhụta asụsụ ọhụụ ka “nka nkwukọrịta ofesi.” +Ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe ga-aga n’ihu na enye nhọrọ a, ndịiche na ọkachamma maka ndị ntorobịa nke Scotland. +Il faut bien le faire. +John Edward bụ Onye Nduzi nke Nzụkọ nke Ụlọ Akwụkwọ Ndị Nnwere Onwe nke Scotland +Lebron ga-apụta izizi maka ndị Lakers na Sọnde na San Diego +Ọchịche abịabele na njedebe maka ndị nsuso na eche ịhụ LeBron James mee mbido izizi ya maka Los Angeles Lakers. +Onye ndu ndị Lakers Luke Walton ekwuola na James ga-eso n’egwuregwu nke nkwadobe afọ asọmpi na Sọnde n’etiti Denver Nuggets na San Diego. +Mana nkeji ole ọ ga-egwu egwuregwu ka amatabeghị. +“Ọ ga-akarị otu mana ọ gaghị eru 48,” nke Walton kwuru na weebụsaịtị ndị Lakers ziri ezi. +Onye mkpesa akụkọ nke Lakers Mike Trudell dere na James nwere ike igwu obere egwuregwu. +Isochi nkwadobe na mbido nke izu a, ajụrụ James maka atụmatụ ya maka usoro nke nkwadobe afọ asọmpi egwuregwu isii nke Lakers. +“Achọghị m egwuregwu a na-eme n’oge mmalite n’ọnọdụ m ugbu a n’ọrụ m, iji dị nkwadebe,” o kwuru. +Oge nnọkọ ndọrọndọrọ Trump nke West Virginia. Youtube Channel +Onye Isi Ala Donald Trump malitere ọtụtụ nnọkọ ndọrọndọrọ ọchịchị na Wheeling, West Virginia. +Ọ bụ nke izizi n’ime nnọkọ ndọrọndọrọ ise achịkọbara Trump n’izu ise na-abịa, tinyere ebe nkwụsị nke ndị enyi tinyere Tennessee na Mississippi. +N’ijigide ntuli aka nkwado onye nhọrọ nke ya ịbanye n’ọkwa Ụlọ Ikpe Kachasị Elu ghe oghe,Trump na-atụ anya ịkwalite nkwado maka ntuli aka ọkara ọchịchị na-abịa, ebe ndị otu Repọblikan nọ n’ihe egwu nnarapụ njikwa Ụlọ Ọmebe iwu mgbe a ga-atụnye aka na Nov. +Kedu oge bụ nnọkọ ndọrọndọrọ West Virginia nke Trump n’abalị a, yana kedu ka ị ga-esi lelee ya n’ịntanetị. +Etinyere nnọkọ ndọrọndọrọ Trump nke Wheeling West Virginia na elekere 7 nke abalị. ET, Satọde, Septemba 29, 2018. +I nwere ike lelee nnọkọ ndọrọndọrọ Trump nke West Virginia n’ịntanetị, n���okpuru site na ihe nkiri ozugbo na Youtube. +Trump nwere ike ikwu maka nnụrịta ụka nke izu a banyere onye nhọpụta Ụlọ Ikpe Kachasị Elu Brett Kavanaugh, nke malitere ịdị ọgbaghara n’ihi ebubo ihe mmekọrịta nwoke na nwanyị yana ntuli aka nkwado Nzụkọ Ọmeiwu a na-atụ anya ya ejigidere ihe ruru otu izu mgbe ndị FBI na-eme nyocha. +Mana isi atụmatụ ọtụtụ nnọkọ ndọrọndọrọ a bụ inyere ndị otu Repọblikan aka na ntuli aka Nọvemba siri ike nwetakwa agbamume. +Ya mere, ndọrọndọrọ ọchịchị Onye Isi Ala Trump kwuru na nnọkọ ndọrọndọrọ nke izu ise a na-abịa bụ maka “ịgba ndị na-enyere aka akwụ ụgwọ na ndị nkwado ume, ka ndị otu Repọblikan na-agbalị ichekwa ma gbasaa na ịmịrịkịtị ha ji na Nzụkọ Ọmeiwu Iwu nke Nnukwu na nke Obere” dabere na ndị Reuter. +“Njikwa Ụlọ Ọmebe Iwu dị oke mkpa maka atụmatụ ya, nke na onye isi ala ga-eje ọtụtụ obodo ka ọ nwere ike, ka anyị na-abanye n’oge ndọrọndọrọ ọchịchị” onye nkwuchite okwu ndọrọndọrọ ọchịchị Trump nke achọghị ka akpọ aha ya gwara Reuters. +Etinyere na Ama Wesbanco Wheeling, nnọkọ ndọrọndọrọ abalị a nwekere ike ịkpọta ndị nkwado si “Ohio na Pennsylvania ma dọrọ mkpuchi site na mgbasa ozi Pittsburgh,”dabere na West Virginia Metro News. +Satọde ga-abụ ugboro nke abụọ n’ọnwa gara aga Trump gara West Virginia, obodo nke o meriri site na ihe karịrị akara pesentị 40 na 2016. +Trump na-agbali ịnyere onye ahọpụtara maka Nzụkọ Ọmeiwu Repọblikan West Virginia Patrick Morrisey aka, bụ onye nke na-akpụ akpụ na nyocha. +“Ọ bụghị ezigbo akara dịịrị Morrisey na onye isi ala ga-abịa iji kwalite ya na nyocha,” Simon Haeder kwuru, onye nyocha sayensị ndọrọndọrọ ọchịchị na West Virginia University, dabere na Reuters. +Ryder Cup 2018: Ndị otu USA gosiri afọ ịlụ ọgụ iji dobe olile anya were banye na asompi agba nke otu onye na Sọnde +Ka akụchara agba otu akụkụ ugboro atọ, agba mmadụ anọ nke ehihe Satọde nwere ike bụrụ ihe Ryder Cup a chọrọ. +Ike nke nkuli ihe bụ kpamkpam atụmatụ egwuregwu achọpụtara mana ọ bụ nke ndị na-egwu egwuregwu kwenyere na ya, nke pụtakarịrị ihie na ụdị asompi dị otu a. +Yabụ kedu ebe ha ga-ekwu na ike dị ugbu a? +“Ha ji akara isii aga ma ugbu a ọ bụ anọ, yabụ anyị ga-ebu nke ahụ dịka obere agbamume, a na m eche,” Jordan Spieth kwuru ka ọ na-apụ maka ụbọchị ahụ. +Mba Europe nwere uru, n’ezie, akara anọ n’ihu yana iri na abụọ a ka na-akụ akụ. +Ndị America, dịka Spieth kwuru, chere na ha nwere obere ikuku n’ubu ha ma nwee ọtụtụ ihe agbamume, na abụghị opekempe ụdịdị Spieth na Justin Thomas, bụ ndị gwukọrọ egwuregwu ọnụ ụbọchị niile, na onye ọ bụla ga-anya isi akara atọ n’ime anọ. +Spieth dị mmerụ ahụ kemgbe akụpụrụ na tee ruo na ama ndu ndu ma na-aga dịka ọmụmatụ. +Mkpu ike nke anurị dasibere ike ka agba nke ya na-aga n’ihu, n’ịkụbanye bọọlụ dị mkpa iji mee ka egwuregwu nke anọ nọrọ n’otu akara mgbe ya na Thomas jiri ọkụkụ abụọ ‘na-akpụ akpụ ka ha kụchara ugboro abụọ. +Ụdị olu mkpu ahụ zutere ya na nkụbanye nke nyere ha mmeri na 15, ụdị nke na-agwa gị na ọ kwenyere na ndị America apụbeghị na nke a. +“Ị ga-enyobanye anya n’ime were na-atụ uche maka egwuregwu nke gị,” Spieth kwuru. +Ọ bụ naanị ihe ndị niile na-akụ egwuregwu a nwere ugbu a. +Oghere18 iji nwee akara. +Naanị ndị na-akụ egwuregwu a nwere akara karịa Spieth na Thomas n’ime ụbọchị abụọ gara aga bụ Francesco Molinari na Tommy Fleetwood, akụkọ nke Ryder Cup enweghị mgbagha. +Njikọ mara mma ma na atụghị anya nke Europe bụ anọ n’ime anọ n’enweghị ike ime ihe ọjọọ ọ bụla. +“Moliwood” bụ naanị njikọ na-akụfeghị na ehihe Satọde, mana ha zenarịrị nkụfe n’ụtụtụ Satọde, ehihe Fraịde yana ngwucha oghere itoolu n’ụtụtụ Fraịde. +Ọkụkụ ahụ, na ka ike ha si aga ma na-abịa site na ndị igwe mmadụ a na-eme mkpọtụ gosipụtara na ha bụ ndị egwuregwu a ga-achọ imeri na Sọnde, nke n’agaghị enwe onye egwuregwu ọzọ ama ama nwere ike bute mmeri nke mba Europe ka anwụ na-ada na Le Golf National karịa Fleetwood na Molinari. +Ọ kacha mma ha abụọ n’otu oge n’oghere dị iche iche. +Okwu ebube mba Europe erubeghị, agbanyeghi. +Bubba Watson na Webb Simpson jiri Sergio Garcia mere ihe egwuregwu na bọọlụ otu mmadụ abụọ n’ụtụtụ, mgbe etinyekọrọ yana Alex Noren. +Ịkụfe otu ugboro na ịkụfe ugboro abụọ n’ọkụkụ ugboro itoolu kụnyere onye mba Spain na Sweden n’olulu nke ha enweghị ike ịrịpụta. +Na Sọnde, agbanyeghị n’onweghị onye ga-enyere gị aka ịpụta n’olulu gị. +Bọọlụ otu mmadụ abụọ na agba mmadụ anọ bụ ihe ịtụ n’anya ịnọ nso lelee n’ihi mkparịta ụka dị na etiti njikọ a, ndụmọdụ ha na-enye, ndụmọdụ ha anaghị enye na otu atụmatụ na-esi agbanwe ozugbo ozugbo. +Mba Europe akụọla nke ọma dịka otu ruo ugbu a ma werekwa isi pụtara ihie ruo n’ụbọchị ikpeazụ mana agba mmadụ anọ a gosiri na otu USA nwere afọ ilụ ọgụ nke na ụfọdụ, ọ kachasị ndị Stateside na-agbagha mgbagha. +Mba Europe ji 10-6 aga, were banye Ryder Cup n’ụbọchị ikpeazụ +Mba Europe ga-eji uru mara abụba were banye ụbọchị ikpeazụ nke Ryder Cup ka ha jichara 10-6 aga United State na bọọlụ otu mmadụ abụọ yana agba mmadụ anọ nke Satọde. +Ndị abụọ a akpalitere mmụọ ha, Tommy Fleetwood na Francesco Molinari bu ụzọ site na mmeri abụọ emeriri Tiger Woods n’agbalị mgbalị, n’iji akara anọ aga na Le Golf National. +Ndị otu mba Europe nke Thomas Bjorn, na-achụ ijigide iko mmeri anapụrụ ha na Hazeline afọ abụọ gara aga, nọgidere ndị mba America na-akụgheri akụgheri ike na bọọlụ otu mmadụ abụọ n’ụtụtụ, were 3-1 merie agba nke ahụ. +Ndị US zọgidere nke ukwuu na agba mmadụ anọ, wee merie na asompi abụọ, mana ha enweghị ike ibelata ọnụọgụ mmeri. +Otu Jim Furyk chọrọ akara asatọ site na asompi 12 agba nke otu onye mere na Sọnde iji jigide iko mmeri ha. +Fleetwood bụ onye ọhụrụ mbụ mba Europe meriri akara anọ ugboro ugboro ebe ya na Molinari, agụrụ aha “Molliwood” ka izu ụka pụrụ iche gachara bụ otu abụọ jiri akara anọ merie na asompi izizi anọ ha na hịstrị Ryder Cup. +Ebe ha merigoro Woods na Patrick Reed na bọọlụ otu mmadụ abụọ, ha were jikọọ nke ọma were merie Woods dagoro mba na onye ọhụrụ mba America, Bryson Dechambeau site na 5&4 dara ụda. +Woods, bụ onye dọgidere onwe ya na asompi abụọ na Satọde gosiri anya nka ya na adanye adanye mana o tufuola asompi 19 n’ime 29 na bọọlụ otu mmadụ abụọ yana agba mmadụ anọ na nke asaa ugboro ugboro. +Justin Rose zuru ike bọọlụ otu mmadụ abụọ nke ụtụtụ, were laghachi isonyere Henrik Stenson na agba mmadụ anọ nke ejiri 2&1 were merie Dustin Johnson na Brooks Koepka-ndị nọ n’ọkwa nke mbu na nke atọ na mba ụwa. +Mba Europe enwetachaghị ya ka ha siri chọọ, agbanyeghị n’ụbọchị ikuku ọma mgbada ọdịda anyanwu nke Paris. +Jordan Spieth onye mmeri ugboro atọ na Justin Thomas jiri akara abụọ were tọọ ọkọlọtọ maka mba America na Satọde. +Ha nwetara mmeri siri ike nke 2&1 na Jon Rahm na Ian Poulter nke mba Spain na bọọlụ otu mmadụ abụọ were laghachi ọzọ imeri Poulter na Rory Mcllroy 4&3 na agba mmadụ anọ, ebe emerigoro ha n’oghere mmalite abụọ. +Naanị ugboro abụọ na hịstrị Ryder Cup ka otu laghachiri azụ site na akara anọ ejiri emeri ha na mbanye agba nke otu onye, n’agbanyeghị dịka ndị ji iko, otu Furyk chọrọ naanị ịgbata onye laba, onye laba iji jigide iko mmeri ha. +Mgbe ha gbachara ndị nke abụọ n’ụbọchị abụọ, kosiladị, mbuso agha nke Sọnde dị ka ihe karịrị ha. +North Korea kwuru “ọ gaghị eme” ịgbarapụ ngwa ọgụ na anataghị nkwenye +Onye Mịnịsta nke mba ofesi North Korea gwara United Nations na Satọde na ịga n’ihu amachibido ha na-ebute atụkwasịghị obi na United State nke na ọ nweghịkwa ka obodo ha ga-esi gbarapụ ngwa ọgụ nuklịa ha n’ụdị ọnọdụ ahụ. +Ri Yong Ho gwara otu mba ụwa na Mgbakọ Ezumezu ha kwa afọ na North Korea esorola “ezigbo ụzọ pụtara ihie” n’afọ gara aga, dị ka nkwụsị nlele ngwa nuklịa na ogbunigwe, ntọsa ebe nlele ngwa nuklịa ma kwee nkwa na ọ gaghị arụkasị ngwa ọgụ nuklịa na teknụzụ nuklịa. +“Kosiladị, anyị ahụghị asịsa na-esote ya sitere na U,S” o kwuru. +“N’enweghị ntụkwasị obi na U.S, agaghị enwekwa okwukwe na nchekwa nke obodo anyị, na n’ụdị ọnọdụ a, ọ nweghị ka anyị ga-esi buru ụzọ gbarapụ ngwa ọgụ anyị.” +Ebe Ri gbanwere mkpesa ndị North Korea banyere ọjụjụ nke Washington ime usoro “agba” mgbarapụ ngwa nuklịa n’okpuru nke North Korea ga-erite elele dịka ọ na-esonye usoro obere obere, okwu ya bara uru n’ihi na ọ jụghị mgbarapụ ngwa nuklliya ozugbo dịka Pyongyang siri mee n’oge gara aga. +Ri rụtụrụ aka na nkwuputa Kim Jong Un na Donald Trump kwukọrịtara na ọgbakọ nke izizi n’etiti onye isi ala U.S nọ n’ọchịchị na onye ọchịchị North Korea na Singapore na Juun 12, mgbe Kim kwere nkwa ịhụ banyere “mgbarapụ ngwa nuklịa nke okirikiri Korea” ebe Trump kwere nkwa nchekwa nke North Korea. +North Korea na-achọ njedebe agha 1950-53 nke Korea, mana United States ekwuola na Pyongyang ga-ebu ụzọ gbarapụ ngwa ọgụ nuklliya ya. +Washington ajụkwala oku ibelata mmachibido mba ụwa a siri ike nke North Korea. +“U.S kwụgidere na “mgbarapụ ngwa nuklịa-izizi” ma bulikwuo nkwanye ya site na mmachibido iji mezuo ebumnuche ha n’ụzọ nkwanye, ma jụkwuo “nkwuputa nke njedebe agha” Ri kwuru. +“Nghọta na mmachibido ga-akputu anyị n’ikpere anyị bụ nrọ efu nke ndị na amaghị anyị. +Mana nsogbu bụ na ịganihu eme machibido na-emina enweghị ntụkwasị obi anyị.” +Ri ekwughị maka atụmatụ ọgbakọ nke abụọ n’etiti Kim na Trump nke onye ọchịchị U.S kwuturu na United Nation n’izu ahụ. +Kama mịnịsta ahụ kwuturu maka nzụkọ atọ n’etiti Kim na onye ọchịchị South Korea Moon Jae-in n’ime ọnwa ise gara aga were tinyekwa: “Ọ bụrụ na ndị ọ metutara n’okwu nke mgbarapụ ngwa nuklịa bụ South Korea na ọ bụghị U.S, mgbarapụ ngwa nuklịa nke okirikiri Korea agaghị abịa n’ụdị nkụchikọ a.” +Ọbụlagodi otu a, olu okwu Ri tụgharịrị nke ukwuu site na afọ gara aga, mgbe ọ gwara Mgbakọ Ezumezu U.N. kwuru na iji rọketị ndị North Korea wee nweta isi ala U.S. apụghị ime, ka “Ajọ Onye Isi Ala” Trump kpọrọ Kim “nwoke rọketị” nọ n’ọrụ igbu ọchụ. +N’afọ a na United Nations, Trump onye nke majara n’afọ gara aga “imebi kpam kpam” North Korea, kpokwasara Kim otito maka obi ọ nwere n’isoro usoro mgbarapụ ngwa agha, mana o kwuru na a ka nwere ọtụtụ ọrụ nke na mmachibido ka ga-adịgide ruo mgbe North Korea kwụsịrị ngwa nuklịa. +Na Wenesde, Trump kwuru na ọ nweghị oge ewepụtara maka nke a, na-ekwu “ọ bụrụ na ọ ga-ewe afọ abụọ, afọ atọ ma ọ bụ ọnwa ise- ọ nweghị ihe ọ pụtara.” +China na Russia na-arụrịta ụka na Ọgbakọ Nchekwa U.N. kwesịrị inye Pyongyang elele maka usoro ndị ha megoro. +Kosiladị, U.S Mike Pompeo gwara Ọgbakọ Nchekwa U,N Na Tọsde na “Mmanye nke mmachibido Ọgbakọ Nchekwa ga-aga n’ihu ike n’ike na-adaghị mba ruo mgbe anyị mezuru mgbarapụ ngwa nuklịa kpam kpam, na njedebe.” +Ọgbakọ Nchekwa ahụ jikọrọ aka ọnụ kwalite mmachibido North Korea kemgbe 2006, n’ụzọ ịgbachi ego maka mmemme ngwa nuklịa na ogbunigwe Pyongyang. +Pompeo zutere Ri n’akụkụ nke Mgbakọ Ezumezu U.N. wee gwa ya ka emechara na ọ ga-abịa Pyongyang ọzọ n’ọnwa na-abịa iji kwado maka ọgbakọ nke abụọ. +Pompeo ejeela North Korea ugboro atọ n’afọ a, mana njem ikpeazụ ya agaghị nke ọma. +Ọ hapụrụ Pyongyang na Julaị na-ekwu na enwela agamnihu, naanị ka North Korea jụ ya n’ime awa ole ma ole maka iti “iwu yiri nke ndị agboro.” +North Korea kwere nkwa na nzụkọ yana Moon mere n’ime ọnwa a ịtọsa ebe ogbunigwe nakwa ụlọ ọrụ nuklịa ma ọ bụrụ na United States esoro “usoro dabara.” +O kwuru na Kim gwara ya, “usoro dabara” nke ọ na-achọ bụ nkwa nchekwa Trump kwere ya na nkwa na Singapore yana ịga n’ihu mee ka mmekọrịta dị n’etiti Washington dị mma. +Ụmụ akwụkwọ Harvard na-eme mmụta ka-esi enwe ezumike zuru ezu +Mmụta ọ hụrụ dị na Mahadum Harvard n’afọ a mere ụmụ akwụkwọ niile na-agụ akwụkwọ ịrahụzu ụra, ime ka echere omenala iji kafin agụ akwụkwọ ‘abalị niile’ aka mgba.’ +Onye mmụta chọpụtara na ụmụ akwụkwọ enwere na Mahadum mbu n’ụwa niile anaghị amakarị ihe kwesịrị ma abịa n’ilekọta onwe ha anya. +Charles Czeisler, ọkammụta ahụike nke ụra na Havard Medical School yana onye ọkachamara na Brigham yana Women Hospital haziri mmụta ahụ, nke ọ kwenyere na ọ bụ ụdịdị ya mbu na US. +Ọ nwetara echiche ịmalite mmụta ahụ ka ọ nyechara nkuzi banyere nsonazụ arahụghị ụra na-eme mmụta. +‘Ka emechara nke ahụ otu nwa agbọghọ biakwutere m nwee sị: ‘Kedu ihe kpatara o jiri bụrụ ugbu a ka a na-agwa m ihe a, n’afọ senịọ m?’ +O kwuru na ọ nwebeghị onye gwara ya uru ụra bara- bụ ihe tụrụ m n’anya.’ ọ gwara The Telegraph. +Nkuzi ahụ, nke ebupụtara n’izizi ya n’afọ a, kọwaara ụmụ akwụkwọ ka uru akparamagwa ezigbo ụra si enyere agumakwụkwọ yana ime mmemme egwuregwu aka, ma dozikwaa ahụ ha niile. +Paul Barreira, ọkammụta ọrịa ọgụgụ isi na mmụọ na Harvard Medical School yana onye isi oche ọrụ ahụike nke mahadum, kwuru na mahadum ahụ kpebiri ịmalite mmụta ahụ ka achọpụtara na ụmụ akwụkwọ anaghị arahụzu ụra n’ime izu. +Mmụta ahụ ruru otu awa tinyere usoro ọrụ mkparịta ụka. +N’otu ngalaba enwere onyonyo ime ụlọ ụra, ebe ụmụ akwụkwọ na-apịdo n’iko kọfị, akwa mgbochi, akpụkpụ ụkwụ egwuregwu yana akwụkwọ iji gwa ha banyere nsonazụ kafin na ihie yana ka arahụghị ụra siri emetụta mmemme egwuregwu, n’uru mmemme oge ụra dị. +Na ngalaba ọzọ, agwara ndị sonyere ka arahụghị ụra ogologo oge siri akpalite ihe egwu obi nkolopu, mkpọnwu ahụ, mmụọ ịda mba yana oria mkpụrụ akụ. +Maapu ụlọ akwụkwọ nwere akara ngosi mkparịta ụka, wee na-akwado ndị sonyere ka ha chee banyere ihe ha na-eme kwa ụbọchị. +‘Anyị maara na ọ gaghị agbanwe agwa ụmụ akwụkwọ ozugbo. +Mana anyị kwenyere na ha nwere ikike ịmata- dịka inwere ikike ịmata nsonazụ nhọrọ ise siga n’ahụike,’ Ọkammụta Czeisler gbakwunyere. +Omenala ngala ‘ịmụ anya abalị niile’ ka dịkwa, o kwuru, tinyere teknụzụ agbara ọhụrụ yana mbawanye nkwanye na-adakwasa ụmụ akwụkwọ, pụtara na arahụghị ụra bụ nsogbu n’ebuwaye. +Ịgba mbọ hụ na inwetara ụra zuru ezu, dị mma, kwesịrị ịbụ ngwa agha nwata akwụkwọ’ iji chere mgbakasị ahụ, ike ọgwụgwụ na obi mmapụ aka mgba, o kwuru - ọbụlagodi izenari ntinye ahụ, ka arahụghị ụra na-etinye ụbụrụ n’ọnọdụ oke agụụ, na-eme ha agụụ kwa mgbe. +Raymond So, nwata gbara afọ 19 nke California na-agụ kemikal na fisikal baịyọlọji nyere Ọkammụta Czeisler aka ịhazi mmụta ahụ, ebe o megoro otu klaasị ya n’afọ gara aga n’ime oge afọ izizi ya na Harvard. +O kwuru na mmụta ahụ mepere anya ya wee kpalite echiche ya ịkwanye ka mmụta a bụrụ maka ụlọ akwụkwọ niile. +Nke na-esote ya, ọ na-enwe olile anya ịrịọ ụmụ akwụkwọ ndị gụchagoro mmụta izizi ka ha mejuputa mmụta yitebere nke a tupu ha abanye n’ụlọ akwụkwọ ahụ. +Ọkammụta Czeisler kwadoro ka ụmụ akwụkwọ chee banyere itinye otimkpu maka mgbe ha chọrọ ịrahụ ụra, yana mgbe ha chọrọ ikuli, ma marakwa maka nsonazụ mmerụ ahụ ihuenyo ngwa eletrọnịk “ihie agba elu igwe” na-ebute yana ihie LED, nke nwere ike kụpụ usoro ka ahụ gị si akpa agwa, we bute nsogbu ịrahụ ụra. +Livingston 1-0 Rangers: Goolu Menga buturu ndị nke Gerrard +Rangers natara ihe mgbu ka ọgbụgba Dolly Menga kwanyere akụkụ Steven Gerrard ghasara aghasa na mmeri 1-0 emeriri ha na Livingston. +Akụkụ Ibrox ahụ na-achọ inweta mmeri nke izizi ha n’ụzọ kemgbe ha meriri 4-1 na Febuarị na St Johnstone, mana ndị otu Gary Holt nyere Gerrard mmeri nke abụọ emeriri ha n’egwuregwu 18 dịka onye njikwa jiri akara asatọ esegharị n’elu nke ndị mbu na Ladbrokes Premiership, Hearts. +Menga jiri tupu nkeji asaa nke ọkara oge were gbanye ọkpụ, na ndị Rangers n’enweghị mkpalite mmụọ adịghị ka ndị ga-agbanyekwa nke ha. +Ebe ndị Rangers gbadara na ndị nke isii, Linvingston gbagoro na ndị nke atọ ma jiri ndịiche dị na goolu nọrọ naanị n’azụ Hibernian. +Na enwere ike inwe nsogbu n’ọdịnihu maka ndị Rangers ka agwọchara onye na-akwụ n’akụkụ Calum Spencem merụ ahụ n’isi, mgbe atụchara ihe si n’akụkụ nke ndị ọbịa. +Gerrard mere mgbanwe asatọ n’akụkụ nke gbafere Ayr were banye n’agba na-esote nke ikpeazụ nke Iko Betfred. +Holt, n’aka nke ya, jiri otu 11 Livi wee gaa, nke napụrụ ndị Hearts otu akara izu gara aga, na ọ gaara ịmasịkwa ya otu ndị nke ya gbasiri ike siri sogide ndị iro ha n’ebe niile. +Rangers nwere ike bụrụ ndị kacha jide bọọlụ mana Livingston kacha jiri bọọlụ ha nwetere wee mere ihe. +Ha kwesịrị iji nkeji abụọ ha jiri banye nye goolu mgbe obere ọkpụkpa izizi nke Menga mere zipuru Scott Pittman na goolu nke Allan McGrego, mana onye nke ahụ na-agba n’etiti gbafuru nnukwu oghere ya. +Ọgbụgba Keaghan Jacobs mere zutere onye na-eche goolu Craig Halkett mana onye mgbachibido otu ya Alan Lithgow nwere naanị ike ịgbafu ya n’azụ. +Rangers nwetara njikwa mana ọ dịka enwere olile anya karịa ka enwere nkwenye ka otu ha si agba na ngwucha nke atọ. +Alfredo Morelos chere na ọ kwesịrị ịgba penaliti n’akara nkeji iri na ise ka ya na Steven Lawless kụtara mana onye njikwa egwuregwu Steven Thomson lefere mkpesa onye Columbia ahụ anya. +Rangers gbalịrị naanị ịgbata na postu ugboro abụọ n’ọkara nke mbu mana onye na-echeburu ndị Ibrox goolu Liam Kelly enweghị ihe mmekpa ahụ ọ bụla na nke Lassana Coulibaly jiri isi kụọ yana ọgbụgba adaghị ụda Ovie Ejaria gbara. +Ebe goolu nkeji 34th ndị Livi gbara nwere ike bụrụ ndapụta, ọ nweghị onye ga-ekwu na ọ dabarọ ha naanị maka mbọ ha gbara. +Ọzọkwa Rangers enweghị ike metụta ọkpụkpa Jacob miri emi. +Scott Arfield enweghị ihe ọ mere ka Declan Gallagher gbanyere Scott Robinson bọọlụ, bụ onye dara juu were họrọ Menga maka ịgbachapụ ya. +Gerrard megharịrị na oge ezumike dị ka o jiri Ryan Kent gbanwee Coulibaly nke metụrụ mmetụta ozugbo, ka onye nke na-agba n’akụkụ fanyere Morelos mana Kelly na-agba nke ọma gbara ọsọ site na ebe ọ nọ bịa gbochie. +Mana Livingston gara n’ihu ime ka ndị ọbịa ahụ na-agba ụdị egwuregwu na-amasị ha, ebe Lithgow na Halkett na-agba bọọlụ ote aka kwa mgbe. +Akụkụ Holt kaara ịgbatị mmeri ha n’oge ikpeazụ mana McGregor kwuchiri wee jụ Jacobs, tupu Lithgow ewere isi kụpụ bọọlụ n’akụkụ. +Onye nnọchite nke Rangers Glenn Middleton nwere mkpesa maka penaliti nke abịaghị n’oge ka ya na Jacobs kụkọrọ mana Thomson lefere anya ọzọkwa. +Almanak: Onye mepụtara ngụ Geiger +N’Ugbu a otu ibe sitere na Almanak “Ụtụtụ Sọnde” anyị: Septemba 30, 1882, afọ136 gara aga taa, wee Na-agụ ... ụbọchị nke amụrụ onye nke ga-abụ onye fiziks n’ọdịnihu Johannes Wilhem “Hans” na Germany. +Geiger mepụtara ụzọ esi achọpụta ma lelee nha redioaktiviti, nchọpụta nke mechara bute ngwa a na-akpọ Ngụ Geiger. +Ebe ndabere sayensi kemgbe, Ngụ Geiger mechara bụrụkwa ndabere agbụrụ ọhụrụ, dịka n’ihe nkiri 1950 “Bells of Coronado.” ndị nọ na ya adịchaghị ka ndị nyocha sayensi na-achị ehi Roy Rogers na Dale Evans: +Nwoke: “Ọ gịnị n’elu ụwa nke a bụ ihe ahụ?” +Rogers: “Ọ bụ ihe Ngụ Geiger, ejiri achọpụta ebe ihe nnweta dị n’ala nọ dịka uranium. +Mgbe ịgbanwuru ngwa nti a, i nwere ike ịnụ nsonazụ atọm na-enye sitere na redioaktiviti dị na ihe nnweta dị n’ala.” +Evans: “Kwuo, ọ na-eme eme ugbu a!” +“Hans” Geiger nwụrụ n’afọ 1945, naanị mkpụrụ ụbọchị ole ma ole ruo ụbọchị ọmụmụ 63 ya. +Mana nchọpụta nke bu aha ya dịịrị gaba. +Ọgwụ mgbochi ọrịa mkpụrụ akụ ọhụrụ nwere ike ikuziri sistem nchekwa ahụ ka ọ “hụ” selụ na-emebi ihe +Ọgwụ mgbochi ọrịa mkpụrụ akụ ọhụrụ nwere ike ikuziri sistem nchekwa ahụ ka ọ “hụ” selụ na-emebi ihe ma gbuo ha +Ọgwụ mgbochi na-akuziri sistem nchekwa ahụ ka ọ mata selụ na-emebi ihe dịka ụzọ ọgwụgwọ ọrịa +Ụzọ a tinyere ịmịpụta selụ nchekwa ahụ n’ahụ onye ọrịa, were gbanwee ya n’ụlọ nyocha +Ha nwere ike ‘ịhụ’ protin na-adịkarị n’ọtụtụ ọrịa mkpụrụ akụ, were gbaghachi ya azụ +Ọgwụ mgbochi eji eme nlele na-egosi ndapụta nyere afọ ojuju na ndị ọrịa nwere ọrịa mkpụrụ akụ dị iche iche. +Otu nwanyị ejiri ọgwụ mgbochi ahụ were gwọ, nke na-akuziri sistem nchekwa ahụ ịmata selụ na-emebi ihe, hụrụ ka ọrịa mkpụrụ akụ nke akpa akwa ya pụrụ ihe karịrị ọnwa 18. +Ụzọ ahụ tinyere ịmịpụta selụ nchekwa ahụ n’ahụ onye ọrịa, were gbanwee ya n’ụlọ nyocha ka ha were ‘hụ’ protin na-adịkarị n’ọtụtụ ọrịa mkpụrụ akụ a na-akpọ HER2, wee gbaghachi selụ ndị ahụ azụ. +Ọkammụta Jay Berzofsky nke US National Cancer Institute dị na Bethesda Maryland, kwuru: “Ndapụta anyị na-egosi na anyị nwere ọgwụ mgbochi nyere afọ ojuju.” +HER2 ”na-akwa uto nke ọtụtụ ọrịa mkpụrụ akụ,” tinyere ọrịa mkpụrụ akụ nke ara, akpa akwa, ngu na ọwa nsi, Ọkammụta Berzofsky kọwara. +Usoro yitebere inwepụ selụ nchekwa ahụ n’ahụ onye ọrịa were “kuziere” ha ka-esi achọpụta selụ ọrịa mkpụrụ akụ arụọla ọrụ n’ịgwọ otu ụdị ọrịa ụmị ọkpụkpụ. +Kanye West Gara Njem Okwu Iwe Binyere Trump, Yiri Okpu MAGA, Ka Ọ Pụtachara na SNL. +Ọ Gaghị Nke Ọma +Etikporo Kanye West mkpu n’ụlọ egwu ahụ n’oge Saturday Night Live ka ọ mechara ihe nkiri ọ na-atagheri ọnụ nke otoro Onye Isi Ala Donald Trump nke U.S. were kwuo na ọ ga-apụta zọọ ọkwa na 2020. +Ka ọ gụchara egwu nke atọ ya n’abalị ahụ, akpọrọ Ghost Town nke oyi okpu Make America Great, ọ gara n’ihu ikwutọ ndị Demokrat were kwuputakwa nkwado ya maka Trump. +“Ọtụtụ oge m na onye ọcha kparịtara ụka, ha ekwuo: “Kedu ka isi nwee mmasị na Trump, ọ bụ onye kpọrọ onye isi ojii asị?” +N’ezie, ọ bụrụ na omume ịkpọ onye isi ojii asị na-emetụta m, agaara m apụ na America kemgbe.” o kwuru. +SNL jiri obere ihe ịkpa ọchị wee malite ihe nkiri ahụ nwere Matt Damon, ebe onye ama ama nke Hollywood ahụ mere akaja nkwuputa Brett Kavanaugh n’ihu Ọgbakọ Ndị Ikpe nke Nzụkọ Ọmeiwu maka ebubo mwakpo nwanyị Christine Blasey Ford boro ya. +N’agbanyeghị na agbasaghị ya n’ikuku, onye mkpa ọchị Chris Rock bugoro ihe nkiri okwu iwe West ahụ na ụzọ mgbasa ozi mmekọrịta ọha. +O doghị anya ma Rock ọ chọrọ ime West akaja site na mbusa ozi ahụ. +Ọzọkwa, West kpesara ndị n’elele ihe nkiri ahụ na emechuru ya ihu n’azụ ụlọ banyere okpu isi ya. +“Ha gwara okwu m ọjọọ n’azụ ụlọ. +Ha sịrị, ‘eyikwala okpu ahụ were pụọ ebe ahụ.’ +Ha gwara m okwu ọjọọ! +Ha wee kwukwa ọzọ, na m nọ n’ime ebe omimi.” o kwuru, dabere na Washington Examiner. +West gara n’ihu. “Ị chọrọ ịhụ ebe ihe omimi ahụ?” na-ekwu na ya ga-eyibe uwe superman ya, nke pụtara na ịgaghị agwa m ihe m ga-eme. Ị chọrọ ka ụwa gaa n’ihu? +Nwalee ịhụnanya.” +Okwu ya kpalitere mkpu site na ndị n’elele ihe nkiri ahụ opekempe ugboro abụọ na ndị ọrụ SNL mere ka ndị emechuru ihu, Variety na-ekwu, nke otu onye na-agwa akwụkwọ ozi ahụ: “Ụlọ egwu ahụ niile dara juu.” +Ewebatara West dịka onye nnọchi anya onye ọgụ egwu Ariana Grande n’oge ikpeazụ, bụ onye nke enyi ya nwoke na mbu, na-akụ egwu rap Mac Miller nwụrụ na mkpụrụ ụbọchị ole ma ole gara aga. +West tinyere ọtụtụ mmadụ na mgbagwoju anya n’iyi uwe dịka Kalama Perrier were kụọ egwu I Love it ahụ. +West nwetara nkwado site na onye isi otu TPUSA, Candace Turner, bụ onye nke dere na twitter: “Maka otu n’ime ndị nwere mmụọ siri ike: DAALỤ MAKA ỊKWỤGIDE N’IHU NDỊ IGWE MMADỤ.” +Mana onye nchịkọba ihe nkiri okwu Karen Hunter dere na twitter na West naanị “bụ onye ọ bụ, na nke a bụ ihe mara oke mma.” +“Mana A họrọ m na m “AGAGHỊ” enye mmadụ elele (site na ịzụ egwu ya ma ọ bụ uwe ya ma ọ bụ kwado “nka” ya} bụ Onye nke m kwenyere na ọ na-amakọ ma na-ekwuputa nkwenye dị mmerụ ahụ n’obodo. +Ọ nwegoro onwe ya. +Yabụ ma anyị onwe anyị,” ọ gbakwunyere. +Tupu ihe nkiri ahụ onye ọkụ egwu rap a, kwuputara na Twitter na ya agbanwego aha ya,na-ekwu na ọ bụ “onye nke amaara na mbu ka Kanye West.” +Ọ bụghị onye na-eme ihe egwuregwu izizi nke gbanwere aha ya, na-esonye na nzọ ụkwụ Diddy, onye amakwara ka Puff Daddy, Puffy na P.Diddy. +Onye ọkụ egwu rap ibe ya, Snoop Dogg enwela mgbe ọ zara Snoop Lion, ọzọkwa onye ọkụ egwu bụ ọkaibe Prince, gbanwere aha ya ka ọ bụrụ akara yana onye na-eme ihe egwuregwu amaburu dịka Prince. +Ịgba akwụkwọ maka ịnwa igbu ọchụ n’ihi ịsụ mma n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ Belfast. +Agbaala otu nwoke dị afọ 45 akwụkwọ maka ịnwa igbu ọchụ, ka asụchara otu nwoke mma n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ dị na ọwụwa anyanwụ Belfast na Fraịde. +Ihe mmereme ahụ mere na Ballyhackamore, onye uwe ojii kwuru. +A tụrụ anya na onye ahụ nke na-agọrọ onwe ya ga-abịa n’obere ụlọ ikpe Belfast na Mọnde. +Ndị Ọrụ Ịgba Akwụkwọ Ọhaneze ga-enyocha akwụkwọ ahụ agbara. +Onye na-eme ihe nkiri Game of Thrones Kit Harrington akụsuola n’ihi ọrụ dịrị nwoke dị njọ +Ejiri ịpịa mma mara Kit Harrington dịka Jon Snow na ihe nkiri HBO Game of Thrones nwere ihe egwu nke dabere na echiche agba ochie. +Mana nwoke ahụ na-eme ihe nkiri a, 31, akụsuola ejirimara enwere maka ndị dike, na-ekwu na ụdị ime ejije a n’ihuenyo pụtara na ụmụaka ndị nwoke ga-eche na ha kwesịrị isi ike tupu ha enweta nsọpụrụ. +Mgbe ọ na-agwa The Sunday Times Culture, Kit kwuru na ọ kwenyere ‘n’ihe emebiela’ wee jụọ ka a ga-esi were luso nsogbu ọrụ dịrị nwoke dị njọ ọgụ n’oge #MeToo. +Kit, onye nke lụrụ onye ya na ya na-emekọ ihe nkiri Game of Thrones Rose Leslie, dịkwa 31, kwetara na ọ ‘na-emetụta ya nke ukwuu’ banyere ịkpatụ aka n’okwu ahụ. +‘N’onwe m, ọ na-emetụta m nke ukwuu, ugbu a - kedu ebe anyị gabigara n’ọrụ dịrị nwoke?,’ o kwuru. +‘Kedu ihe anyị na-akuziri ụmụ-nwoke mgbe ha na-etolite etolite, n’ihe banyere nsogbu anyị na-ahụ ugbu a?’ +Kit kwenyere na igwe ihe nkiri ketere obere oke maka mbawanye ọrụ dịrị nwoke dị njọ, ekele dịịrị agwa ụmụ-nwoke n’ihe nkiri. +Ọ gara n’ihu: ‘Kedu ihe bụ ọnatarachi na nke akuziri akuzi? +Kedu ihe a na-akuzi n’igwe ihe nkiri, yana n’ime ogbe na-eme ka ụmụaka ndị nwoke chee na ha kwesịrị ịdị ụdị akụkụ a na nwoke? +A na m eche na nke ahụ bụ nnukwu ajụjụ n’oge anyị a -kedu ka anyị ga-esi gbanwee ya? +N’ihi o doro anya na ọ nwela ihe mebiri n’ụmụaka ndị nwoke anyị.’ +N’ajụjụ ọnụ ahụ ọ kwetara na ya agaghị eme akụkọ mmalite ma ọ bụ nke nsochi Game of Thrones ma ejije ahụ bịa na njedebe n’oge okpomọkụ na-abịa, na-ekwu na ya na ama ịlụ agha na ịnyịnya emechela’. +Site na na Novemba Kit ga-apụta na mmegharị Sam Shepard True West nke bụ akụkọ maka onye na-emepụta ihe nkiri na nwanne ya nwoke, bụ onye ohi. +Nwoke ahụ na-eme ihe nkiri kwuputara n’oge adịghị anya na ọ na-eche na izute nwunye ya Rose bụ ihe kachasị mma mere ya na Game of Thrones. +‘Ezutere m nwunye m n’ihe nkiri a, yabụ n’ụzọ nke ahụ o nyere m ezinụlọ m n’ọdịnihu, ya na ndụ m were dịrị gaba.’ o kwuru. +Rose mere Ygritte, bụ onye Kit na eṅomi, Jon Snow hụrụ n’anya, n’ejije nwetara awọdụ Emmy. +Di na nwunye ahụ lụrụ na Juun 2018 n’ala ogige be Leslie na Scotland. +HIV/Ọrịa obiri n’aja ọcha: China n’akọ na-enwere mgbali 14% n��okwu ọhụrụ +China mara ọkwa na-enwere mgbali 14% n’ọnụọgụ ndị amaala ya nwere HIV na Ọrịa obiri n’aja ọcha. +Ihe karịrị mmadụ 820,000 ka ọ metụtara n’obodo ahụ, ndị ọrụ ahụike na-ekwu. +Ihe ruru okwu 40,000 ọhụrụ ka ekpesara naanị n’ime agba nke abụọ na nkeji anọ 2018. +Ọtụtụ n’ime okwu ọhụrụ a bụ site na n’ụzọ mmekọrịta nwoke na nwanyị ka esiri bufee ya, na-egosi mgbanwe n’oge gara aga. +N’omenala, HIV gbasara ngwangwa n’akụkụ ụfọdụ China n’ihi ọbara ndị butere ọrịa agbanyere ha. +Mana ọnụọgụ ndị na-ebute HIV n’ụzọ a, ebelatala ihe ruru efu, ndị ọrụ ahụike China kwuru n’ọgbakọ emere n’okirikiri Yunnan. +Afọ n’elu afọ, kosiladị, ọnụọgụ ndị nwere HIV na Ọrịa obiri n’aja ọcha ejirila mmadụ 100,000 gbalie. +Nbufe HIV site na mmekọrịta nwoke na nwanyị bụ okwu siri ike n’ogbe LGBT ndị China. +Ewepuru ịda iwu dị n’okwu mmekọrịta nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwaanyị na China na 1997, mana mkpachapụ ndị LGBT ka dị nnukwu. +N’ihi ụkpụrụ nchekwa nke obodo ahụ, mmụta nyocha na-ama amụma n’ihe ruru 70-90% ụmụ nwoke ndị na-enwe mmekọrịta nwoke na nwoke ga-emecha lụọ nwanyị. +Ọtụtụ n’ime mbufe ọrịa ndị ahụ na esite na-emeghị mkpuchi mmekọrịta nwoke na nwanyị zuru oke n’ime ịme enyi ndị a. +Kemgbe 2003, gọọmentị China ekwela nkwa nweta ọgwụ HIV bụ ozurumba dịka mbọ ha imegide okwu ahụ. +Maxine Waters agọla agụgọ na onye ọrụ ya bụ onye busara data ndị ọmebe iwu GOP, kwutọọ ‘asị ọjọọ’ na ‘amụma ịkpa nkata’ +U.S. Onye ọmebe iwu Maxine Waters na Satọde gọnarịrị ebubo na otu onye ọrụ ya tinyere ozi nkeonwe nke ndị ọmebe iwu atọ Repọblikan U.S. na ibe ọmebe iwu Wikipedia. +Onye Los Angeles Demokrat ahụ kwusiri ike na ndị na-ebusa ebubo ahụ bụ ndị otu “ultra-right wing” na ndị websaịtị. +“Asị, asị, na asị ọjọọ,” Waters kwuru na nkwuputa na Twitter. +Ozi nke ahụ ewepụtara nwere adreesị ụlọ na akara ekwentị maka Ndị Ọmebe Iwu U.S Lindsey Graham nke South Carolina, na Mike Lee yana Orrin Hatch, ha abụọ bụ ndị Utah. +Ozi ahụ pụtara n’ịntanetị na Tọsde, nke amaghị onye tinyere ya na Capitol Hill n’oge nnụrịta ụka ọgbakọ Nzụkọ Ọmeiwu banyere ebubo mmekọrịta nwoke na nwanyị eboro onye nhọpụta Ụlọ Ikpe Kachasị Elu Brett Kavanaugh. +Mbusa ahụ pụtara mgbe ndị ọmebe iwu mmadụ atọ gbara Kavanaugh ajụjụ. +Ndị saịtị nchekwa ụkpụrụ dịka Gateway Pundit na Redstate kwuputara na adreesị IP ejiri mara ebe ozi ahụ siri busa metụtara ụlọ ọrụ Waters, wee wepụta ozi nke onye ọrụ Waters, Hill kwuputara. +“Ebubo a n’enwegh isi bụ ụgha kpamkpam yana asị zuru ezu,”Waters gara n’ihu. +“Onye ọrụ m nke emebigoro nzuzo onye ọ bụ, ozi nkeonwe na nchekwa ya n’ihi ebubo aghụghọ na ụgha ndị a - enweghị ka aka ya siri dị na mbusa ozi ahụ. +Ebubo a n’enweghị isi bụ ụgha kpamkpam yana asị zuru ezu.” +Nkwuputa Waters kpalitere nkọcha ozugbo n’ịntanetị, tinyere onye n’ahụ maka mgbasa ozi White House gara aga Ari Fleischer. +“Ngọnarị a dị iwe,” Fleischer dere. +“Nke a pụtara na ọ nweghị ụdị mmụọ eji a bụ Onye Ọmebe Iwu. +Mgbe eboro mmadụ ihe ha emeghị, ha ekwesịghị iwe iwe. +Ha ekwesịghị ịrụ ụka. +Ha ekwesịghị ịjụ ebumnuche onye boro ebubo. +Ha kwesịrị ịdị nwayọọ ma daa jụụ.” +Ọ bịara dịka Fleischer na-atule omume Waters na nkọcha ndị Demokrat mere Ọka Ikpe Kavanaugh, bụ onye nke ndị nkọcha boro ebubo na ọ dịka ọ were nnukwu iwe n’oge nnụrịta ụka Tọsde. +Omar Navarro, bụ onye nke Repọblikan na-achọ ịnapụ Waters oche n’oge ntuli aka ọkara ọchịchị, kwuputakwara echiche ya na Twitter. +“Nnukwu ma ọ bụrụ eziokwu,” ọ dere. +Na nkwuputa ya, Waters kwuru na ụlọ ọrụ ya akpọturugo “ ndị ikike dị n’aka na ndị mmanye iwu banyere ebubo ụgha ndị a. +“Anyị ga-ahụ na ndị mere ya ga-apụta ihie,” ọ gara n’ihu “na iwu ga-ejide ha maka omume ha niile nke na-emerụ ahụ ma dị egwu ebe onye na ndị ọrụ m niile nọ. +Nyocha Johnny English Strikes Again - buturu ihe nkiri nzuzo ịkpa ọchị Rowan Atkinson +Ọ bụ omenala ugbu a ịchọ mkpa Brexit n’ihe nkiri ọhụrụ ọ bụla nwere nribama Britain, na nke a dịka ọ metụtara mmegharị ihe nkiri ịkpa ọchị nke Johnny English - bụ nke ejiri Johnny English malite na 2003, wee laghachikwa azụ na 2011 ka Johnny English Reborn. +Ọ pụtara na ihe nkiri njakịrị nke isiokwu otu anyị siri bụrụ ndị iberibe pụtara ihie, bụzi oghere nbufe ahịa ọhụrụ anyị? +Kosiladị, onye nzuzu anya ọkpụ, ihu rọba Johnny English emegharịala ikike ya ịkwalite ihe nke ugboro abụọ - aha ya karịa ihe ọ bụla na-egosi na ọ bụ nchepụta ihe ịkpa ọchị emebere maka akụkụ obodo ndị anaghị asụ Bekee. +N’ezie ọ bụ onye iberibe ọrụ nzuzo nke agbanyeghị ṅṅomi ya gbagwojuru anya, nwere obere Clouseau, ntakịrị Mr Bean na nfechalụ nke nwoke ahụ n’etinye otu olu na isiokwu Chariots of Fire na mmalite mmemme Olympics London 2012. +N’izizi ọ dabere n’onye njem yana nwoke nzuzo mba ụwa Atkinson nke emere na ihe mgbasa ozi Barclaycard TV echefugoro, na-ahapu ọgbaghara n’azụ ya. +Enwere otu oge ma ọ bụ abụọ mara mma na JE ọhụrụ a. +Ọ masịrị m ka Johnny English na-erute nso n’ụgbọ elu ebe oyi uwe agha ndị agba ochie, igwe nkucha were na-akụta n’okpu agha ya. +Onyinye Atkinson nwere maka ịkpa ọchị a na-ahụ anya pụtara ihie, mana ịkpa ọchị ahụ esighi ike ma mafee oke, tụmadị ihe nkiri ndị ahụ “anaghị akpa ọchị” dịka 007 na Mission Impossible n’onwe ha na-enwekwa ihe ịkpa ọchị n’ime ya ugbu a. +Ihe ịkpa ọchị ahụ dịka ọ bụ ụmụaka ka emebere ya karịa ndị okenye, maka mụ onwe m njegheri Johnny English enweghị ihe nchepụta pụrụ iche yana ebumnuche ya dịka ihe nkiri anaghị ekwu okwu nke Atkinson, n’onye nke Bean. +Ebe mgbado ukwu isiokwu ugbu a bụ na Great Britain nọ n’oke nsogbu. +Onye nbanye ịntanetị anataghị ikike banyere na netwọk ndị ọrụ nzuzo kachasị dị nzuzo nke Britain, kpughee ndị ọrụ nzuzo niile nọ n’ọrụ, na mgbagwoju anya onye ọrụ nzuzo nọ ọrụ - obere ihe omume maka Kelvin Eldon. +Ọ bụ nke ikpeazụ maka onye isi ala bụ onye mpako nwere nsogbu, nke enweghịzi nkwado ọchịchị ọ bụla kpamkpam: Emma Thompson nwara ike ya na ime ihe omume a yitebere Teresa-May mana enwekebeghị ihe dị n’akwụkwọ ọ ga-eji rụọ ọrụ. +Ndị na-enye ya ndụmọdụ nchekwa gwara ya na ebe amagoro ndị ọrụ nzuzo ya niile, ọ ga-akpọpụta onye lagoro ezumike nka. +Nke ahụ pụtara Johnny English na-emegheri emegheri n’onwe ya, onye nke ewere n’ọrụ dịka onye nkuzi n’ụlọ akwụkwọ ndị ọgaranya, mana na-enye nkuzi nke adịghị n’akwụkwọ ka-esi a bụ onye ọrụ nzuzo: ọmalịcha odide ebe a, dịka English nyere ụdị ụlọ akwụkwọ nzuzo School of Rock. +Ebughachiri English na Whitehall maka inye ntuziaka ntụmadị were zukọta yana onye nke abụọ ya tagbugoro onwe ya n’ahụhụ Bough, bụ Ben Miller mere ya ọzọ. +Bough abụrụla onye lụrụ nwunye, ejikọrọ ya na onye isi ngwa ọgụ mmiri, bụ ihe omume onye nwere agba Vicki Pepperdine mere ka onye mmanya na-egbu. +Yabụ na Batman na Robin nke na emebi ihe mgbe niile N’ọrụ Nzuzo Her Majesty amalitekwala, na-ezute Olga Kurylenko dịka ọmalicha Ophelia Bulletova. +Kosiladị, onye isi ala na-adanye na anwansi nke onye ọgaranya tech, bụ onye nke kwuru na ọ nwere ike idozi nsogbu kọmputa ndị Britain nwere: onye ọjọọ Jason Volta bụ Jake Lacy mere ya. +English na Bough malitere njem nke egwuregwu nzuzu ịkpa ọchị ha: gbanwee dịka onye na-eke nri, ha mụnyere ọkụ n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ French; ha butere ọgbaghara izunye onwe ha n’ime ụgbọ mmiri ezumike Volta; English kpalitere mgbagwoju anya ka ọ nwara iji ngwa isi Virtual Reality nwere mata ime ụlọ Volta. +Eji ihe niile were mee agba nke ikpeazụ ahụ, ma obi uto na egwumegwu niile dị ya, enwere obere TV ụmụaka dị n’ihe niile ahụ. +Ọmalịcha ihe agafeghị oke. +Dịka n’ihe nkiri Johnny English ndị ọzọ, ọ naghaghị m ịche: ndị na-eme ihe nkiri nke Britain enweghi ike nye Rowan Atkinson ihe omume ga-ebuputa onyinye ya nke ọma? +Labour na-agọnarị na ha anaghị akpa nkata atụmatụ ka ndị Britain na-arụ ọrụ ụbọchị anọ n’izu ma nara ụgwọ ọrụ maka ụbọchị ise +Labour Party nke Jeremy Corbyn na-atule atụmatụ ga-agbanwe ihe nke ga-ahụ na ndị Britain rụọ ọrụ ụbọchị anọ n’izu ha anara ụgwọ ọrụ maka ụbọchị ise. +Ndị otu a chọrọ ka ndị isi nwe ụlọ ọrụ na-enyefe akụ ha chekwabara n’aka ndị ọrụ siterena mgbanwe artificial intelligence (AI) site na inye ha ụbọchị ụma agaghị arụ ọrụ. +Ọ ga-eme na ndị na-arụ ọrụ ga-erite elele ụbọchị atọ n’izu ụka ma welakwaa otu ụgwọ ọnwa. +Ndị nzuputa okwu kwuru na echiche a “ga-adaba” na ebumnuche yana atụmatụ akụnụba nke otu a ime ka ọ dabaara ndị ọrụ. +Ndị otu Trades Union Congress akwadola ịmalite ụbọchị anọ n’ime izu dịka ụzọ ndị ọrụ ga-esi rite elele na akụnụba na-agbanwe. +Onye senịọ nzuputa okwu nke Labour Party gwara Sunday Times: ‘A na-atu anya ịma ọkwa nyocha amụma tupu ngwucha afọ a. +‘Ọ gaghị eme ozugbo mana ịrụ ọrụ ụbọchị anọ n’izu bụ ebumnobi ndị otu a dabara n’usoro ihazi akụnụba ka ọ dabaara ndị ọrụ yana mkpokota ụzọ nrụpụta ihe nke ndị otu ahụ.’ +Labour Party agaghị abụ ndị izizi kwadoro echiche a, ebe Green Party kwere nkwa ịrụ ọrụ ụbọchị anọ n’izu n’ime oge ndọrọndọrọ ọchịchị 2017. +Labour Party anaghị akwado ebumnuche ahụ ugbu a dịka otu, kosiladị. +Onye nkwuchite okwu Labour Party kwuru: ‘Ọrụ ụbọchị anọ n’izu abughị amụma ndị otu a nke na ndị otu a anaghị atule ya.’ +Shadow Chancellor John McDonnell jiri ọgbakọ Labour mere izu gara aga were kọwapụta echiche ya maka mgbanwe na akụnụba. +Mazị McDonnell kwuru na o kpebiri iweghachite ikike site na n’aka ndị ‘isi ụlọ ọrụ amaghị’ yana “ndị nrite oke uru’ n’ụlọ ọrụ ndị eji ebi ndụ. +Atụmatụ shadow chancellor ahụ pụtakwara na ndị nwere oke n’ụlọ ọrụ mmiri nwere ike ha agaghị enwetacha isi ego ha, maka gọọmentị Labour nwere ike ‘ime mwepu’ na ndabere ebumnobi ihe ezighi ezi. +O kwuputakwara atụmatụ itinye ndị ọrụ na bọdụ ụlọ ọrụ ma mepụta Inclusive Ownership Fund ga-enyefe pesenti 10 n’oke ụlọ ọrụ ndị nkịtị n’aka ndị ọrụ, ndị nwere ike inweta uru isi ego ruru £500. +Lindsey Graham, John Kennedy gwa “60 minutes” ma nyocha ndị FBI enwere ike ịgbanwe obi ha +Nyocha ndị FBI na-eme banyere ebubo eboro Ọka Ikpe Brett Kavanaugh egbuola oge ime ntuli aka ikpeazụ na nhọpụta ya maka Ụlọ Ikpe Kachasị Elu opekempe otu izu, wee bulite ajụjụ na nchọpụta ụlọ ọrụ ahụ enwere ike ịgbanwe obi ndị ọmebe iwu Repọblikan ịdọrọkwa nkwado ha. +N’ajụjụ ga-eme na Sọnde, onye akụkọ “60 Minutes” Scott Pelley jụrụ ndị Ọmebe Iwu Repọblikan John Kennedy na Lindsey Graham ma FBI enwere ike bọlite ihe ọ bụla ga-eme ka ha gbanwee obi ha. +Kennedy meghere onwe ya karịa onye otu ya si South Carolina. +“Ana m eche, ee,” Kennedy kwuru. +“E kwuru m na nbanye na nnụrịta ụka ahụ, E kwuru m, A gwara m Ọka Ikpe Kavanaugh okwu. +Akpọrọ m ya ka nke a mechara, ka ebubo ahụ pụtara, kwuo sị, ‘Ị mere ya? +Ọ kụjaghị, ọ nwere mkpebi, na enweghị mgbagha.” +Ntuli aka Graham, kosiladị, dịka edeela ya ede. +“Obi m ekpebiela gbasara Brett Kavanaugh, na ọ ga-ewe ebubo dasiri ike,” o kwuru. +“Dr. Ford, Amaghị m ihe mere mana a ama m nke a: Brett gọnarịrị nke ukwuu,” Graham gbakwunyere, na-arụta Christine Blasey Ford aka. +“Na ndị niile ọkpọrọ aha enweghị onye kwetara ya. +Ọ gbaala afọ 36. +Anaghị m ahụ ihe ọhụrụ na-agbanwe.” +Gịnị bụ Mmemme Global Citizen, na Ọ nwela Ihe Ọ Bụla Ọ Mere Iji Belata Ụbịam? +Satọde nke a New York ga-achịkọba Global Citizen Festival,emume ịgụ egwu a na-eme kwa afọ nke na-enwe ahịrị ndị ama ama na-atụ n’anya nke ukwuu na-eme ihe nkiri, yana ebumnobi dịkwa ịtụnanya; ịkwụsị ụbịam n’ụwa. +Ugbu a n’afọ nke asaa ya, Global Citizen Festival ga-ahụ puku kwụrụ puku mmadụ ga-ezute na Ama Central Park, nke abụghị naanị inweta ọṅụ n’ihe nkiri ndị a dịka Janet Jackson, Cardi B, Shawn Mendes, ma ka ha kwalitekwa mmata ezigbo ebumnuche mmemme ịkwụsị ụbịam na 2030. +Global Citizen Festival nke kwuputara na 2012, bụ alaka nke Global Poverty Project, otu nkwalite amụma mba ụwa nwere olile anya ịkwụsị ụbịam site na ịbawanye ọnụọgụ ndị na-alụso ya ọgụ. +Ka ị were nweta tịketị n’efu maka mmemme ahụ (beluso ma ọ masịrị gị ịkwụ ụgwọ tịketị), ndị ga-abịa ihe nkiri a ga-arụ ụfọdụ ọrụ, ma ọ bụ ‘mee ihe’ dịka nwepụta onwe n’ọrụ, izigara onye isi obodo ozi ịntanetị, ịkpọ oku ekwentị ma ọ bụ ụzọ ọ bụla bara uru iji were kpalite mmata ebumnuche ha ịkwụsị ụbịam. +Mana, kedu ka o si agara Global Citizen nke ọma ebe ha nwere naanị afọ 12 imejuputa ebumnuche ya? +Echiche inye ndị mmadụ tịketị n’efu, a bụ ụzọ ziri ezi iji kwanye ndị mmadụ ka ha kpọọ oku mmepụta ihe, ka ọ bụ naanị ụzọ ọzọ ihe akpọrọ “kliktivizm” - ndị chere na ha nwere ihe pụrụ iche ha na-eme n’ezie site na ibinye aka na mkpesa ịntanetị ma ọ bụ zipu tweet? +Kemgbe 2011, Global Citizen kwuru na ha enweela ”mmepụta ihe” nde 19 site n’aka ndị nkwado ya, na-akwa maka mmezu ebumnuche dị iche iche. +O kwuru na mmepụta ihe ndị a enyerela aka mee ndị na-achị achị na mba ụwa ka ha maa ọkwa nkwa yana amụma ruru ihe karịrị ijeri $37, nke ga-emetụta ndụ mmadụ karịrị ijeri 2.25 na 2030. +Na mbido 2018, otu ahụ rụtụrụ aka nkwa na ọkwa 390 nke malitere site na mmepụta ihe ya, opekempe ijeri $10 bụ nke ekesagoro ma ọ bụ tụta n’ego. +Otu ahụ na-ama amụma n’ego ndị echekwabara emetụtala n’ahụ mmadụ ruru nde 649 n’ụwa gbaa gburugburu. +Ụfọdụ nkwa ndị ekwere tinyere Power of Nutrition, mmekọrịta ndị ego nkwado dị na U.K yana ndị ntinye n’ọrụ wepụtara onwe ha “inyere ụmụaka aka itozu etozu ihe ha ga-abụ,” na-ekwe Rwanda nkwa nde $35 iji nyere ha aka kwụsị erighị nri na-edozi ahụ dị n’obodo ahụ ka ha nwetachara tweet karịrị 4,700 sitere na Global Citizen. +“Na nkwado sitere na gọọmentị UK, ndị na-enye onyinye na gọọmentị mba ọzọ, na Global Citizen dịka gị, anyị ga-eme mmeremme ezighi ezi nke erizughị nri na-edozi ahụ ka ọ bụrụ ozi mgbakwunye na hịstrị.” Onye nnọchi anya Power of Nutrition Tracey Ullman gwara igwe mmadụ n’oge emume egwu na London na Eprel 2018. +Otu ahụ kwukwara nke a ka emechara ihe mmepụta 5,000, na-akpọ U.K oku ka ha meziwanye nri ndozi ahụ maka ndị nne na ụmụaka, gọọmentị mara ọkwa inye ego maka ọrụ, Power of Nutrition, nke ga-eji enyemaka nri ndozi ahụ rute ụmụ-nwanyị na ụmụaka nde 5 aka. +N’azịza otu n’ime FAQ dị na ịntanetị ya, na-ajụ, “kedu ihe mere iji chee na anyị nwere ike ịkwụsị oke ụbịam?” +Global Citizen zara: “Ọ ga-abụ ụzọ tere aka ma sie ike - mgbe ụfọdụ anyị ga ada ma daa mba. +Mana, dị ka oke ndọrọndọrọ ikike dịịrị mmadụ yana mmegide ịkpa oke mere tupu anyị, anyị ga-emeri, n’ihi na anyị siri ike karịa ma ejikọọ ọnụ. +Janet Jackson,The Weeknd, Shawn Mendes, Cardi B, Janelle Monáe bụ otu n’ime ndị ga-eme ihe nkiri na mmemme nke afọ a na New York, bụ nke Deborra-Lee Furness na Hugh Jackman ga-achịkọba. +US nwere ike iji Ndị Agha Mmiri maka “mgbachi” were gbochie nbufe ahịa Ike ndị Russia- Ọde Akwụkwọ Obodo +Washington nwere ike “ma ọ dị mkpa” jiri Ndị Agha Mmiri ha nwere gbachie ike Russia ibanye ahịa, tinyere Middle East, Ọde Akwụkwọ US Ryan Zinke kwuputara, dịka arụtụrụ aka na Washington Examiner. +Zinke boro ebubo na itinye aka nke Russia na Syria - nke ama ama, bụ ebe ọ na-arụ ọrụ n’ihi akpọmoku nke gọọmentị ziri ezi - bụ ụzọ aghụghọ iji nyochaa ahịa ike ọhụrụ. +“Ekwenyere m n’ihe kpatara ha jiri nọrọ na Middle East bụ ka ha zụọ ahịa ike dị ka ha na-eme na ọwụwa anyanwụ Europe, mgbada Europe,” o kwuru nke a. +Ma, dabere na onye ọrụ ahụ, enwere ụzọ na ka-esi agba ya mgba. +“United States nwere ike, jiri Ndị Agha Mmiri anyị, hụ na okporo ụzọ mmiri anyị ghe oghe, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa, gbachie, iji hụ na ike ha abaghị ahịa.” o kwuru. +Zinke na-agwa ndị bịara emume ndị Consumer Energy Alliance chịkọbara, otu anaghị achọ uru nke dobere onwe ya dịka “olu ndị na-eri ike” na US. +Ọ gara tulee usoro Washington ji emeso Russia na Iran omume, chọpụta na ha abụọ bụ otu. +“Nhọrọ akụnụba Iran na Russia bụ, dabere naanị, ịgbazinye na iweghachi mmanụ ọkụ ụgbọ ala,” o kwuru, ebe ọ na-arụtụ Russia aka dị ka “ọgba otu egwu” nwere akụnụba dabere na mmanụ ọkụ na unyi ekereụwa. +Nkwuputa ndị a pụtara ka ọchịchị Trump na-agbalị ịkwalite ibufe ahịa mmiri gaasị ọnatarachi ha na Europe, ịnọchi Russia, bụ nke ka dị ọnụala maka ndị na-eri ahịa nke Europe. +Maka imezu nke a, ndị ọrụ ọchịchị Trump tinyere Onye Isi Ala US Donald Trump n’onwe ya, na-agbalị ịkwanye Germany ka ọ pụta na atụmatụ ọwa mmiri Nord Stream 2 “adịghị mma”, bụ nke dabere na Trump, mere Berlin “onye nke Moscow ji eji. +Moscow ekwuola ugboro ugboro na ijeri $11 ọwa mmiri Nord Stream 2 ahụ, bụ nke emebere ka o bulie ike ọwa mmiri nke dị adị ruo ijeri 110 kubik mita, bụ naanị atụmatụ maka akụnụba. +Kremlin na-arụ ụka na oke mgbachi nke Washington n’atụmatụ ahụ bụ naanị n’ihi akụnụba bụ ihe kpatara ya ma bụrụ ọmụmatụ asompi n’adịghị mma. +“Ekwenyere m na anyị na-ahụkọrịta na ike enweghị ike ịbụ ngwaọrụ eji eme nkwanye, ndị na-eri ahịa kwesịrị ịhọrọ onye mbunye ahịa ya,” Mịnịsta Ike nke Russia Aleksandr Novak kwuru, sotere nnọkọ ya na Ọde Akwụkwọ Ike nke US Rick Perry na Moscow na Septemba. +Ọnọdụ US ebutela nkwụtọ si Germany, bụ nke kwuputakwara nkwado ha n’atụmatụ ahụ. +Ụlọ ọrụ na-achị na Germany maka ụlọ nrụpụta ihe, Federation of German Industries (BDI), akpọkuola US ka ha wepu aka na amụma ike nke Europe yana nkwekọrịta obodo na obodo dị n’etiti Berlin na Moscow. +“Enwere m nnukwu nsogbu mgbe obodo nke atọ n’etinye anya na mbunye ahịa ike anyị,” Dieter Kempf onye isi Federation of German Industries (BDI) kwuru, sotere nnọkọ dị n’etiti German Chancellor Angela Merkel na Onye Isi Ala Vladmir Putin. +Elizabeth Warren “Ga-elebe Anya Nke Ukwuu” Na Ịzọ Maka Onye Isi Ala na 2020, Onye Ọmebe Iwu Massachusetts Kwuru +Onye ọmebe iwu Massachusettes Elizabeth Warren kwuru na Satọde na ya “ga-elebe anya nke ukwuu” ịzọ maka onye isi ala, sotere ntuli aka ọkara ọchịchị. +N’oge nzụkọ obodo na Holyoke, Massachusetts, Warren kwuputakwara na ya ga-atule ịzọ ọkwa. +“O ruola oge ụmụ-nwanyị ga-aga na Washington were jee dozie gọọmentị anyị mebiri emebi, bụ nke tinyere ụmụ-nwanyị ịnọ n’isi.” o kwuru, dabere na The Hill. +“Nọvemba 6 gachaa, A ga-elebe anya nke ukwuu n’ịzọ maka onye isi ala.” +Warren tinyere ọnụ na Onye Isi Ala Donald Trump n’ime oge nzụkọ obodo ahụ, na-ekwu na ọ “na-eduba obodo a n’ụzọ adịghị mma. +“Uche na-eche m ruo n’ọkpụkpụ banyere ihe Donald Trump na-eme ọchịchị onye kwuo uche ya nke anyị,” o kwuru. +Warren na-ekwuwapụta nkọcha ya maka Trump yana onye nhọpụta Ụlọ Ikpe Kachasị Elu ya, Brett Kavanaugh. +Na tweet Fraịde Warren kwuru ”n’ezie anyị chọrọ nyocha FBI tupu ntuli aka.” +Nyocha ewepụtara na Tọsde, kosiladị, gosiri ọtụtụ ndị okpuru ọchịchị ntuli aka nke Warren echeghị na ọ kwesịrị ịzọ ọkwa na 2020. +Pesentị Iri ise na asatọ nke “ndị nwere ike” ime ntuli aka nke Massachusetts kwuru na ọmebe iwu ahụ ekwesịghị ịzọ ọkwa, dabere na nyocha nke Suffolk University Poilitical Research Center/Boston Globe. +Pesentị Iri atọ na abụọ kwadoro yabụ ịzọ ọkwa. +Nyocha ahụ gosiri nkwado karịa maka ịzọ ọkwa nke Governor Deval Patrick chịburu ọchịchị, nke nwere pesentị 38 na-akwado ya ịzọ ọkwa ebe pesentị 48 megidere ya. +Aha ndị Demokrat ndị ukwuu ekwutere banyere ịzọ ọkwa nke 2020 tinyere Osote Onye Isi Ala Joe Biden chịburu ọchịchị na Onye Ọmebe iwu Vermont Bernie Sanders. +Biden kwuru na ya ga-eme mkpebi nke ya na Jenuarị, Associated Press kwuputara. +Sarah Palin rụtụrụ aka na PTSD Track Palin na nnọkọ ndọrọndọrọ Donald Trump. +Track Palin, 26, nọrọ otu afọ na Iraq ka ọ banyechara na Sept. +Anwudoro ya wee gbaa ya akwụkwọ maka ime ihe ike n’ụlọ n’abalị Mọnde +“Ihe nwa m nwoke na-agabiga, ihe ọ na-agabiga na nlaghachi azụ, Enwere m ike inwe nghọta ezinụlọ ndị ọzọ n’ahụ nsonazụ PTSD yana ụfọdụ ihe mmerụ ahụ ndị agha anyị na-eji alata,” ọ gwara ndị nọ na nnọkọ ndọrọndọrọ a maka Donald Trump na Tulsa, Oklahoma. +Palin kpọrọ nwudo ya ‘enyi nọ n’ime ụlọ” wee kwuo maka nwa ya nwoke na ndị ọzọ gara agha, ha na-alaghachi azụ dị obere iche, ha na-alaghachi azụ nwee obi ike, ha na-alaghachi na-ajụ ma enwere nsọpụrụ enwere maka ndị agha ibe ya, ndị agha ikuku, na ndị ọ bụla nọ n’otu ndị agha, n’ihe ha nyegoro obodo ha.” +Anwudoro ya na Mọnde na Wasilla, Alaska, wee gbaa ya akwụkwọ maka imeso nwanyị ihe ike n’ụlọ, mgbochi na mkpesa nke ime ihe ike n’ụlọ yana iji ngwa ọgụ ka oriri ihe na-egbu egbu, dabere na Dan Bennett, onye nkwuchite okwu ndị Wasilla Police Department. +Obodo 18, D.C na-akwado ịche aka mgba nke amụma mgbata ọsọ ndụ ọhụrụ +Obodo iri na asatọ yana District of Colombia na-akwado ịche aka mgba n’ụzọ iwu nke amụma U.S ọhụrụ nke anaghị enye nchekwa maka ndị na-agbata ọsọ ndụ n’ihi otu ndị ike ma ọ bụ ihe ike ime ụlọ. +Ndị nnọchi anya si obodo 18 ahụ na district gbara akwụkwọ ndị ọ metụtara inyere aka na Fraịde na Washington iji kwado onye mgbata ọsọ ndụ nke na-echere amụma ahụ aka mgba, NBC News kwuputara. +Ekwuputabeghị aha ndepụta n’uju nke onye na-agba akwụkwọ n’okwu Grace v. Sessions nke American Civil Liberties Union gbara na Ọgọst megide amụma etiti obodo. +O kwuru na onye ya na ya bi “na ndị otu ike ụmụ ya nwoke” megburu ya, ma ndị ọrụ U.S gbachibidoro arịrịọ ya maka mgbata ọsọ ndụ na Julaị 20. +Akpọchiri ya na Texas. +Ndị ọka iwu obodo nke na-akwado Grace kọwara na El Salvador, Honduras na Guatemala, mebere ọnụọgụ kacha na ndị na-etinye akwụkwọ maka mgbata ọsọ ndụ na U.S, dịka mba na-alụso ọgụ mbawanye otu ndị ike na ihe ike ime ụlọ. +Amụma ọhụrụ nke U.S megharịrị mkpebi 2014 nke Board of Immigrant Appeals mere na-anabata ndị mbịambịa ejighị akwụkwọ na-agba ọsọ ihe ike ime ụlọ itinye akwụkwọ mgbata ọsọ ndụ. +Onye Isi Ọka Iwu District of Columbia Karl Racine kwuru na nkwuputa Fraịde na amụma ọhụrụ ahụ “n’eleghara anya iwu nke obodo, etiti obodo na mba ofesi nke afọ kwụrụ afọ.” +“Iwu etiti obodo chọrọ na a ga-eme mkpebi na mkpesa ndị mgbata ọsọ ndụ ọ bụla n’ihe akaebe na ọnọdụ mkpesa ahụ, nke n’ụdị mgbachi ahụ na-emegide usoro iwu ahụ, “ịgba akwụkwọ ndị ọ metụtara inyere aka” kwuru. +Ndị ọka iwu gara n’ihu na-arụ ụka n’akwụkwọ ha gbara na amụma ah��� ịgbachi ndị mbịambịa ịbata na-emerụ akụnụba U.S ahụ, na-ekwu na ha na-abụkarị ndị nọrọ onwe ha azụ ahịa ma “na-enye ndị ọrụ ngo achọrọ.” +Onye Isi Ọka Iwu Jeff Sessions nyere ndị ọka ikpe iwu gbasara ndị mbịambịa, ka ha ghara inyezi nchekwa maka ndị mgbata ọsọ ndụ na-agbanarị mmegbu ihe ike ime ụlọ na otu ndị ike na Juun. +“Nchekwa mgbata ọsọ ndụ dịịrị ndị na-ahapụ obodo ha n’ihi mkpagbu ma ọ bụ ụjọ n’ihi agbụrụ, okpukpe, obodo onye si, ma ọ bụ nsonye n’otu mmekọrịta ọha ma ọ bụ echiche gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị,” Sessions kwuru na ịma ọkwa amụma ya na Juun 11. +Emebeghị nchekwa mgbata ọsọ ndụ ka obeleta nsogbu niile enwere - ọbụlagodi nsogbu niile siri ike - nke ndị mmadụ n’ahụ n’ụwa niile. +Mbọ agwụ ike ịzọpụta ndị gbanarịrị ihe mberede na Palu dịka ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ na-agbago +Maka ndị gbanarịrị ihe mberede, ọnọdụ ahụ na-esiwanye ike. +“Ọ na-adị oke echiche,” Risa Kusuma kwuru, nne nke gbara afọ 35, na-agụgụ nwa nwoke ya na-amajiji n’ebe ndị gbapụrụ ọsọ n’obodo Palu mebiri emebi nọ. +“Nkeji ọ bụla ụgbọ ala ihe mberede na-ebute ozu. +Mmiri dị ọcha dị ụkọ.” +Ahụrụ ndị bi n’obodo ka ha na-alaghachi n’ụlọ ha mebiri emebi, na-atụta ihe n’arịa ndị mmiri juru, na-agbalị ịzọpụta ihe ndị ọ bụla ha nwere ike. +Narị kwụrụ narị mmadụ merụrụ ahụ na ụlọ ọgwụ nke ala ọmajiji ruru 7.5 mebiri, juputara. +Ụfọdụ ndị merụrụ ahụ tinyere Dwi Haris, onye nke azụ na ubu ya gbajiri, nọ n’ihu ilo Palu Army Hospital ezu ike, ebe a na-elete ndị merụrụ ahụ n’ilo n’ihi ọmajiji siri ike ka na-aga n’ihu. +Anya mmiri juru ya anya ka ọ na-akọ ka ajọ ala ọmajiji ahụ siri kwaa elu ụlọ nke ise ụlọ nkwari akụ ya na nwunye ya na nwa ya nwanyị nọ. +“Oghere adịghị ịzọtakwa onwe anyị. +Echere m na afanyere m n’ime mgbawa dị n’ahụ aja, Harris gwara Associated Press, na-agbakwunye n’ezinụlọ ya batara n’obodo ịga agbamakwụkwọ. +“A nụrụ m ka nwunye m bere akwa maka enyemaka, ọzọ bụ ịda jụụ. +Amaghị m ihe mere ya na nwa m. +A na m atụ anya na ha nọ nke ọma.” +Onye nnọchite anya U.S na-ebo China Ebubo “mmegide” site na ‘mgbasa ozi asị’ +Otu izu akwụkwọ akụkọ China buchara ozi n’ibe akwụkwọ anọ n’akwụkwọ mgbasa ozi U.S na-ekwu maka elele mmekọrịta azụmahịa U.S.-China, onye nnọchite anya U.S na China boro Beijing ebubo iji ndị mgbasa ozi America were ebusa ozi asị. +U.S. Onye Isi Ala Donald Trump na Wenesde gara aga rụtụrụ aka na mgbakwunye akwụrụ ụgwọ nke China Daily na Des Moines Register - akwụkwọ akụkọ obodo Iowa kacha ere ahịa - ka o bochara China ebubo ịchọ itinye aka na ntuli aka ndị ọmebe iwu U.S na Nọvemba 6, ebubo nke China gọnarịrị. +Ebubo Trump na Beijing na-agbalị itinye aka na ntuli aka U.S gosiri ihe ndị ọrụ U.S gwara ndị Reuters na ọ bụ agba nke ọhụrụ na mgbakiri ala Washington na-abawanye ịkwagide China. +Ebe ọ bụ ihe nkiti gọọmentị mba ofesi itinye mgbasa ozi iji kwalite ahịa, Beijing na Washington nọ na ndọrọndọrọ azụmahịa na-abawanye nke megoro ka ha tinye ụtụ ngwahịa na ahịa mbubadata ha. +Ntinye ụtụ ngwahịa nke China mere na mbido agha azụmahịa ka emebere ka ọ metụta ndị na ebupu ahịa n’obodo dịka Iowa kwadoro otu ndọrọndọrọ Repọblikan nke Trump, ndị ọkammara China na U.S kwuru. +Terry Branstad, onye nnọchite anya U.S na China bụkwa onye chịburu Iowa, onye mbupu ahịa nri ubi nke ukwuu na China, kwuru na China merụrụ ndị ọrụ, ndị ọrụ ugbo na azụmahịa nke America ahụ. +China, Branstad dere n’echiche ya na Des Moines Register na Sọnde, “na-ekwusi ike maka mmegide ahụ site na itinye mgbasa ozi n’akwụkwọ mgbasa ozi anyị.” +“N’ịgbasa ozi asị a, gọọmentị China na ewere oghere omenala America hụrụ n’anya bụ nke onye kwuo uche ya na mgbasa ozi enweghị mkpagbu were tinye mgbasa ozi akwụrụ ụgwọ na Des Moines Register.” Branstad dere. +“Ma ịtụlee ya n’ọdụ akwụkwọ mgbasa ozi dị n’okporo beijing ebe a, ịga ahụ na enwere obere olu ndịiche nke na ịghaghị ahụ ihe n’egosi n’ezie echiche di iche ndị China nwere ike nwee maka usoro akụnụba China nọ na nsogbu, ebe ọ bụ n’ụlọ mgbasa ozi nọ na njikwa nke China Communist Party,” ọ dere. +Ọ gbakwunyere na “otu n’ime akwụkwọ akụkọ ama ama na China zenarịrị ibiputa” ederede ya, n’agbanyeghị na o kwughị akwụkwọ akụkọ nke ọ bụ. +Ndị Repọblikan Na-akpachapụ Ndị Ntuli Aka Ụmụ-nwanyị Tupu Ntuli Aka Ọkara Ọchịchị Maka Ọgbaghara Kavanaugh, Ndị Nyocha Dọrọ Aka na Ntị +Dị ka ọtụtụ ndị isi Repọblikan kwụnyere ma kwuchitere Onye nhọpụta Ụlọ Ikpe Kachasị Elu Brett Kavanaugh n’ihu ebubo dị iche iche nke mmekọrịta nwoke na nwanyị, ndị nyocha adọọla aka na ntị na ha ga-ahụ ndapụta iwe ga-esite ọkachasị n’aka ụmụ-nwanyị, n’oge ntuli aka ọkara ọchịchị na-abịa. +Mmetụta sochiri nke a dị elu nke ukwuu, na ọtụtụ ndị Repọblikan ka edekọbara na ha egosila na ha chọrọ ịga n’ihu mee ntuli aka. +Enweghị ike iweghachi ihe ndị ahụ,” Grant Reeher, onye ọkammụta nke sayensị ndọrọndọrọ ọchịchị na Syracuse University Maxwell School gwara The Hill maka ederede nke ebiputara na Satọde. +Reeher kwuru na ya na-agbagha n’ọkwụkwa ikpeazụ nke Onye Ọmebe Iwu Jeff Flake (R-Arizona) mere maka nyocha FBI a ga-ezu iji wetuo iwe ndị ntuli aka. +“Ụmụ-nwanyị agaghị echefu ihe mere ụnyahụ - ha agaghị echefu echi niile ma Nọvemba, “ Karine Jean-Pierre, onye ndụmọdụ senịọ na onye nkwuchite okwu obodo maka otu ọganihu MoveOn kwuru na Fraịde, dabere na akwụkwọ akụkọ Washington, D.C. +N’ụtụtụ Fraịde, ndị ngagharị iwe kwere ukwe “Nọvemba na-abịa!” ka ha na-agagharị ngagharị iwe n’ogologo ụzọ Nzụkọ Ọmeiwu ebe ndị Repọblikan ji Ọgbakọ Ọka Ikpe họrọ ịga n’ihu na nhọrọ Kavanaugh agbanyeghị nkwuputa Dr. Christine Blasey Ford, Mic kwuputara. +“Ịnụ ọkụ n’obi na mkpalite mmụọ nke Demokrat ga-apụ iche,” Stu Rothenberg, onye nyocha ndọrọndọrọ ọchịchị enweghị otu o binyere gwara ndị akụkọ. +“Ndị mmadụ na-ekwu na ọ dịla elu; nke a bụ eziokwu. +Mana ọ nwere ike ịgbagokwu ọkachasị n’etiti ụmụ-nwanyị n’enweghị otu ha binyere n’ime obodo yana ndị ntuli aka na-etolite etolite, gbara afọ 18- ruo 29-, bụ ndị ebe onye isi ala anaghị amasị, anaghị eme ntuli aka kwa mgbe.” +Ọbụlagodi tupu nkwuputanke ọha Ford mere na-akọwa ebubo mmekọrịta nwoke na nwanyị megide onye nhọpụta Ụlọ Ikpe kachasị Elu, ndị nyocha na-atụ elo na ndapụta iwe nwere ike sote ma ọ bụrụ na ndị Repọblikan gaa n’ihu mee nkwado ahụ. +“Nke a abụrụla ọgbaghara dịịrị GOP,” Michael Steele kwuru, onye isi chịburu Ọgbakọ Otu Repọblikan, na mbido izug ara aga, dabere na NBC News. +“Ọ bụghị naanị maka ntuli aka ndị ọgbakọ ma ọ bụ maka ntuli aka ikpeazụ ma ọ bụ ma etinyere Kavanaugh n’oche, ọ bụkwa maka otu ndị Repọblikan siri jikwaa ihe a ma ka ha siri meso ya omume,” Guy Cecil, onye isi Priorities USA, otu na-enyere aka ahọpụta ndị Demokrat, rụtụrụ ndị akụkọ aka. +Kaosiladị, Ndị America dị ka ndị kewara ekewa n’onye ha ga-ekwenyere na ndapụta nkwuputa Ford na Kavanaugh, ebe ndị karịrị kwụnyere onye nke ikpeazụ. +Nyocha ọhụrụ sitere na YouGov gosiri na pesentị 41 ndị zara ajụjụ kwenyere kpamkpam ma ọ bụ kwenyetụrụ nkwuputa Ford, ebe pesentị 35 kwuru na ha kwenyere kpamkpam ma ọ bụ kwenyetụrụ Kavanaugh. +Na mgbakwunye, pesentị 38 kwuru na ha chere na Kavanaugh eleghị anya sịrị asị ma ọ bụ sịa asị kpamkpam n’oge nkwuputa ya, ebe naanị pesentị 30 kwuru otu ihe ahụ maka Ford. +Ka Flake mechara nkwanye, ndị FBI na-eme nyocha ugbu a n’ebubo Ford boro, yana opekempe otu onye ebubo ọzọ, Deborah Ramirez mere, The Guardian kwuputara. +Ford mere nkwuputa n’ihu Ọgbakọ Ndị Ikpe Nzụkọ Ọmeiwu n’okpuru iyi n’izu gara aga na Kavanaugh dakporo ya n’anya mmanya mgbe ọ gbara afọ 17. +Ramirez boro ebubo n’onye nhọpụta Ụlọ Ikpe Kachasị Elu ahụ gosiri ya ike ya mgbe ha na-eme ọgbakọ oriri na ọṅụṅụ n’oge ha na-agụ akwụkwọ na Yale n’ime 1980s. +Onye Mmepụta World Wide Web Na-ama Atụmatụ Ịmalite Ịntanetị Ọhụrụ Iji Sonyere Google na Facebook +Tim Berners-Lee, onye mmepụta World Wide Web, na-amalite ụlọ ọrụ ọhụrụ nke ga-achụso Facebook, Amazon na Google. +Atụmatụ ọhụrụ ahụ nke ọkaibe teknụzụ, Inrupt, bụ ụlọ ọrụ na-agbakwasa ụkwụ na ngwanro ghe oghe Berners-Lee, Solid. +Solid na-enye ndị ọrụ oghere ịhọrọ ebe ha ga-echekwa data ha yana ozi ndị mmadụ nwere ike nweta. +N’ajụjụ ọnụ pụrụ iche Fast Company mere, Berners-Lee mara njakịrị na ebumnuche ejiri mebe Inrupt bụ “ịchị mba ụwa.” +“Anyị ga-eme ya ugbu a,” o kwuru maka ụlọ ọhụrụ ahụ. +“Ọ bụ oge a ga-edebanye na akụkọ.” +Ngwa ahụ na-eji teknụzụ Solid enye ndị mmadụ oghere imepụta “ebe nchekwa data nkeonwe n’ịntanetị” ma ọ bụ POD. +Ọ nwere ike inwe ndepụta kọntaktị, ndepụta ihe omume, kalenda, ọba egwu yana ngwa nkeonwe na nke eji arụ ọrụ. +Ọ dị ka Google Drive, Microsoft Outlook, Slack na Spotify dị n’otu nchọgharị ma ha niile n’otu oge. +Ihe pụrụ iche na ebe nchekwa data nkeonwe n’ịntanetị bụ na ọ dịịrị naanị onye ji ya arụ ọrụ ịhọrọ onye ga-enweta ozi nke ọ bụla. +Ụlọ ọrụ ahụ na-akpọ ya “ikike nkeonwe site na data.” +Ebumnuche Inrupt, dabere na CEO John Bruce, bụ ka ụlọ ọrụ kpokọba, akụrụngwa, usoro na nka dabara daba iji nyere aka mee ka Solid rute onye ọ bụla. +Ụlọ ọrụ ahụ nwere naanị Berners-Lee, Bruce, ebe nchekwa IBM zụtara na ya, ndị ọrụ nrụpụta ewere n’ọrụ ịrụ n’atụmatụ ahụ yana ọgbakọ ndị koodu wepụtara onwe ha. +Site n’izu a, ndị nrụpụta teknụzụ ụwa gbaa gburugburu ga-enwe ike mebe ngwa agaghị ekpokọba ọnụ nke ha site n’iji ngwa mebere na websaịtị Inrupt. +Berners-Lee kwuru na ya ndị otu ya anaghị agwa ndị “Facebook na Google okwu banyere ma ha a ga-amalite ma ọ bụ hapụ mmalite mgbanwe kpamkpam ebe ụdịdị azụmahịa na-atụgharị ozugbo na ntabi anya. +“Anyị anaghị anata ha ikike.” +Na mbipụta emere na Medium na Satọde, Berners-Lee dere na “ebumnuche Inrupt bụ inye ike azụmahịa na gburugburu inyere aka chekwaa ntụkwasị obi na ịdị mma weebu ọhụrụ ahụ arụrụ na Solid.” +Na 1994, Berners-Lee gbanwere Ịntanetị mgbe ọ mepụtara World Wide Web Consortuim na Massachusetts Institue of Technology. +N’ọnwa ndị adịbeghị anya, Berners-Lee bụ olu na-ada ụda na arụmarụ ụka nnwere onwe ọrụ ịntanetị. +Ọbulagodi mgbe a na-ebuputa Inrupt, Berners-Lee ga-anọrọ dịka onye Mmepụta na Onye Isi nke World Wide Web Consortuim, Web Foundation na Open Data Institute. +“A na m enwe olile anya nke ukwuu maka oge na-abịa n’ihu nke weebu,” Berners-Lee gbakwunyere. +Bernard Vann: Emere emume onye ụkọchukwu Victoria Cross WW1 +Emeela emume nke naanị ụkọchukwu Church of England nwetara mmeri Victoria Cross n’oge World War One dị ka onye agha n’obodo ya ka afọ gbara 100. +Lt Col Ụkọchukwu Bernard Vann nwetara awọdụ na 29, Septemba 1918 na mbuso agha emere na Bellenglise na Lehaucourt. +Kaosiladị, mgbọ ọkaibe n’ịgba egbe tụrụ ya ka ụbọchị anọ gachara na ọ maghị ncha ncha na etubere ya ugo ndị agha kachasị na Britain. +Ụmụ ụmụ ya ndị nwoke abụọ kpughere okwute iji na-eme ncheta ya na ngarube emere na Rushden, Northamptonshire, na Satọde. +Otu n’ime nwa nwa ya Michael Vann, kwuru na ọ bụ “ihe nrịbama pụrụ iche nke ukwuu” na a ga-ekpughe okwute ahụ ka afọ gbara 100 kpọmkwem site na mgbe nna ya ochie kpara ike o jiri nweta awọdụ. +Dabere na London Gazette, na 29 Septemba 1918 Lt Col Vann kpọọrọ ndị otu agha ya gafee Canal de Saint-Quentin “n’etiti urukpuru ojii yana n’ime nnukwu ọkụ ọgbụgba sitere na ama yana egbe.” +Ọ mechara gbara ọsọ gbabanye na ndị na-akwa mgbọ ma “kpaa ike ọkpara” duru ahịrị na-aga ihu tupu ọ chụrụ egbe naanị ya were kụpụ mmadụ ndị agha atọ nọpụrụ iche. +Onye ọkaibe n’ịgba egbe nke Germany gburu Lt Col Vann na 4 Oktoba 1918 - naanị otu ọnwa tupu agha akwụsị. +Michael Vann, 72 kwuru na omume nna ya ochie mere “bụ ihe ọ maara na ya agaghị emenwu ma ncha mana ọ bụ ihe na-eme mmadụ obi umeala.” +Ya na nwanne ya nwoke Dr James Vann tụkwasara ihe ifuru ncheta ka emechara ngarube ahụ, bụ nke Imperial Youth Band Brentwood duru na ya. +Michael Vann kwuru na “obi dị ya mma nke ukwuu na nkwanyị ugwu isonye na ngarube ahụ” wee kwukwaa sị na “a na-egosi site na nkwado nke ndị mmadụ kwanyere ike nke dike n’ezie kpara.” +Ndị nkwado MMA mụrụ anya abalị niile iji kiri Bellator 206, kama ha nwetara Peppa Pig +Chegodi nke a, ịmụrụ anya abalị niile ka ikirie Bellator 206 juputara ejuputa, naanị ka agọnarị gị ikiri isi emume. +Akwụkwọ ozi sitere San Jose nwere mgba 13, tinyere isii dị na isi kaadị wee na-egosi ya ka ọ na-eme abalị niile na Uk na Channel 5. +N’elekere 6 ụtụtụ, ozugbo Gegard Mousasi na Rory MacDonald chọrọ icherịta onwe ha ihu n’ihu, ndị nkiri nọ UK nwere mgbagwoju anya ka nweta ahụ gbanwere bụrụ Peppa Pig. +Ọ masịghị ụfọdụ ka ha mụchagoro anya abalị ruo isi ụtụtụ tụmadị maka mgba ahụ. +Otu onye nkwado na Twitter kọwara mgbanwe banye n’ihe nkiri ụmụaka ahụ ka “nnukwu njakịrị atọghị ọchị.” +“Ọ bụ iwu gọọmentị na ka ọ kụrụ elekere 6 ụtụtụ na ihe nkiri ahụ adịghị mma maka ụmụaka, ya mere ha jiri banye n’ihe mmemme ụmụaka,” Dave Schwartz kwuru, senịọ na-esote onye isi maka ahịa na mgbasa ozi Bellator, mgbe ajụrụ maka ngosi ihe nkiri ahụ. +“”Peppa the Pig,” ee.” +Onye isi ụlọ ọrụ Bellator, Scott Coker kwuru na ha ga-arụ ọrụ na nhazi ha ka ewere gbakwunye ndị nkiri UK n’ọdịnihu. +“A na m eche mgbe m na-eche maka mmegharị ya, A na m eche na anyị nwere ike eleghị anya dozie ya,” Coker kwuru. +“Mana ọ bụ elekere nke isii n’ụtụtụ Sọnde ebe ahụ na anyị enweghị ike idozi ya ruo Sọnde nke anyị, Mọnde nke ha. +Mana anyị na-arụ ọrụ na ya. +Kwenyere m, mgbe ọ gbanwere ebe ahụ, enwere ọtụtụ ederede gara ihu na azụ nke na ha niile abụghị nke enyi na enyi. +Anyị nọ na-agbalị idozi ya, anyị chere na ọ bụ mmebi siri na teknụzụ. +Mana ọ bụghị, ọ bụ okwu gbasara ndị gọọmentị. +A ga m ekwe gị nkwa na ọ gaghị eme mgbe ọzọ. +Anyị ga-ewetu ya ka ọ bụrụ mgba ise kama isii - dịka anyị na-emekarị - na anyị na-agba mbọ inyezu ndị nkwado ihe ha chọrọ were gafezie. +Ọ bụ ọnọdụ mwute.” +Desert Island Discs: Ọ metụtara Tom Daley ka “onye adịghị mma “ n’ihe gbasara ụdị mmekọrịta nwoke na nwanyị +Onye na-amanye na mmiri nke Olympic Tom Daley kwuru na ya toputara na mmetụta na ya adịghị mma na-ebe onye ọ bụla nọ n’ihi ụdị mmekọrịta nwoke na nwanyị ya- mana nke ahụ nyere ya mkpali ịbụ onye mere nke ọma. +Nwata ahụ gbara afọ 24 kwuru na ya amataghị ruo mgbe ọ gara skuul sekọndịrị na “ọ bụghị onye ọ bụla dị ka ya.” +Mgbe ọ na-ekwu okwu na Radio 4 Desert Island Discs nke izizi, nke Lauren Laverne gosipụtara, o kwuru na ya kwuputara gbasara ikike ndị na-enwe mmekọrịta nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị iji nye ndị ọzọ “olile anya.” +O kwukwara na ịbụ nna mere ya o tinyechaghị mmụọ n’imeri na Olympics. +Onye ngosi ihe mmemme ahụ kwa mgbe nke megoro ogologo oge, Kirsty Young, enwerela ọnwa ole ma ole n’ihi ahụ ọnwụnwụ. +Na-apụta dịka onye ajụrụ ajụ n’ihe mmemme izizi nke Laverne, Daley kwuru na ọ metụtara ya dịka “onye erughị” ka ndị ọzọ mgbe ọ na-etolite etolite n’ihi “anabataghị na mmekọrịta ọha inwe mmasị na nwoke na nwanyị.” +O kwuru: “Ruo taa, mmetụta ahụ nke na emetụta ka onye erughị eru, na mmetụta ịdị iche, bụ ihe ndị nyere m ike iji mee nke ọma.” +Ọ chọro ka ya gosi na ya bụ “ihe”, o kwuru, ka ya ghara ịgbawa mmadụ niile obi mgbe ha ga-achọpụta gbasara ụdị mmekọrịta nwoke na nwanyị ya. +Onye mmeri ọla nchara ugboro abụọ na Olympics abụrụla onye ndọrọndọrọ LGBT gbagotere, ma were mpụta ya na Commonwealth Games na Australia were rịọ ka ọtụtụ mba ndị ọzọ wepu ịda iwu dị na mmekọrịta nwoke na nwoke ma ọ bụ nwanyị na nwanyị. +O kwuru na ya kwuputara okwu n’ihi na ọ chere na ya nwere chiọma inwe ike na-ebi ndụ ghe oghe na-enweghị ndapụta ọ bụla ma chọọ inye ndị ọzọ “olile anya.” +Onye mmeri ugboro atọ ahụ n’ụwa kwuru na ịhụ nwoke n’anya - onye na-eme ihe nkiri US, Dustin Lance Black, bụ onye nke ya zutere na 2013 - “mere ya na ntụmadị.” +Daley lụrụ onye ahụ were mmeri Oscar, bụ onye jiri afọ 20 were tọọ ya, n’afọ gara aga mana o kwuru na ndịiche dị n’afọ ha enwebeghị mgbe ọ pụtara okwu. +“Mgbe ịgabigara ọtụtụ ihe n’oge ịbụ nwata” - ọ gara Olympics ya nke izizi ka ọgbara afọ 14, nna ya nwụrụ n’ihi ọrịa mkpụrụ akụ ka afọ atọ gachara - o kwuru na o siri ike ịhụ onye ya na ya gbara otu afọ nke nwegoro ụdị ahụmihe dị elu ma dịkwa ala ka ya. +Mmadụ abụọ ahụ bụrụ nna nwa nwoke akpọrọ Robert Ray Black-Daley na Juun- nke na Daley kwuru na “ka ya si ahụta ihe” gbanwere. +“Ọ bụrụ na ịjụrụ m n’afọ gara aga, ọ bụ naanị gbasara “Inwe mmeri ọla edo’. o kwuru. +“Ọ kwa ịma, na-enwere ihe ndị karịrị ọla edo Olympics. +Ọla edo m bụ Robbie.” +Nwa ya nwoke nwere otu aha dị ka nna ya Robert, bụ onye nwụrụ na 2011 ka ọgbara afọ 40, ka achọpụtara na ọ nwere ọrịa mkpụrụ akụ nke ụbụrụ. +Daley kwuru na nna ya ekwetaghị na ọ ga-anwụ, na otu n’ime ihe ikpeazụ ọ jụrụ bụ ma ha gbatala tịketị ha maka London 2012 - dịka ọ chọrọ ịnọ n’ịhu ihu. +“Enweghị m ike ịgwa ya na ọ gaghị anọ ndụ ịnọ n’ihu ihu’.” o kwuru. +“Eji m ya aka ka ọ kwụsịrị iku ume na ọ bụ mgbe ọ kwụsịrị iku ume n’ezie ma nwụọ ka M kwetara na ọ bụghị anwụ anwụ,” o kwuru. +N’afọ na-esote ya, Daley sọrọ mpi na 2012 Olympics were rite ọla nchara. +“A maara m na nke a bụ ihe m rọgoro na nrọ ndụ m niile - ịmanye na mmiri n’ihu igwe mmadụ ndị ụlọ m na Olympics Game, enweghị mmetụta karịrị ya,” o kwuru. +Ọ kpalitere nhọrọ egwu ya izizi - Proud site na Heather Small - bụ nke metụtara ya n’oge nkwadobe nke Olympics ma na-enyekwa ya akpata oyi. +Desert Island Discs dị na BBC Radio 4 na Sọnde na 11:15 BST. +Ahapụrụ Mickelson ahụ ezuchaghị oke n’oche na Ryder Cup na Satọde +Onye America Phil Mickelson ga-etinye ndekọ na Sọnde mgbe ọ ga-akụ egwuregwu Ryder Cup nke ugboro 47 ya, mana ọ ga-atụgharị ụdị ya iji zenarị ịbụ ihe mmezu agaghị enye anụrị. +Kaptịn Jim Furyk nọchiri Mickelson, ịkụ n’ihe mmemme a na-eme otu ugboro n’afọ abụọ nke ugboro 12 ya, na Satọde maka bọọlụ otu mmadụ abụọ na agba mmadụ anọ. +Kama ịnọ n’etiti ihe na-eme, ka o si anọbu maka ndị United States, onye mmeri ugboro ise ahụ kere ụbọchị ya ịbụ onye na-akụ aka ma na-edozikwa egwuregwu ya n’ama ahụ n’olile anya imezi ihe na-arịa ya. +Ọ nwebeghị mgbe ọ bụ onye na-akụ ihe gara larịị ọbụlagodi mgbe ọ nọ n’isi ọrụ egwuregwu ya, nwoke a gbara afọ 48 adabaghị n’ụdị ama Le Golf National kpara mkpa, ebe ama ahụ toro ogologo na-ata ọkụkụ etoghi ogologo ahụhụ. +Na ọ bụrụgodi na ama ahụ anaghị atụ egwu n’onwe ya, Mickelson, na egwuregwu nke itoolu na Sọnde ga-ezute onye mmeri British Open Francesco Molinari na-akụ nke ọma, bụ onye ya na onye ọhụrụ Tommy Fleetwood jikọrọ ọnụ merie egwuregwu anọ ha niile n’izu a. +Ọ bụrụ na ndị America, jiri akara anọ n’akpụ n’azụ malite egwuregwu 12 agba nke otu onye, bido n’ọkụ ọkụ, egwuregwu Mickelson nwere ike ịdị oke mkpa. +Furyk kwuputara ntụkwasị obi na onye nke ya, ọ bụghị na ọ nwere ihe ọzọ ọ nwere ike ikwu. +“Ọ họtara ọrụ ọ nwere taa nke ọma, tie m aka n’azụ were konye m aka wee sị, ọ ga-adị nkwadebe echi,” Furyk kwuru. +“Ọ nwere nnukwu ntụkwasị obi n’onwe ya. +Ọ bụ onye nọ na Hall of Fame, na o tinyekwala ọtụtụ ihe na ndị otu a n’oge gara aga na n’izu a. +Eleghị anya atụghị m anya na ọ ga-akụ egwuregwu abụọ. +Atụrụ m anya karịa, mana ọ bụ otu a ka o siri dapụta ma bụrụkwa otu anyị chere na anyị ga-esi gaa. +Ọ chọrọ ịnọ n’ihu ebe ahụ, dị ka onye ọ bụla.” +Mickelson ga-agafe ndekọ Nick Faldo maka egwuregwu Ryder Cup kacha na Sọnde. +Ọ nwere ike bụrụ ngwucha ọrụ egwuregwu Ryder Cup ya bụ nke na-erughị elu ndekọ nkeonwe ya. +Mickelson nwere mmeri 18, mmefu 20 na onye laba onye laba asaa, agbanyeghị na Furyk kwuru ọnụnọ ya butere ihe enweghi ike nkọwa n’otu ahụ. +“Ọ na-akpa ọchị, na-eme akaja, na-ekwu okwu ọchị, ọ na-amasị ya ịkpa ndị mmadụ ọchị, ọ bụ ezigbo mmadụ inwe n’ime ụlọ ndị otu a,” ọ kọwara. +“Echere m na ndị egwuregwu ndị obere nwere obi anụrị ịkpasu ya n’izu a, bụ ihe nyere obi anụrị ịhụ. +Ọ na-enye ihe karịrị naanị ịkụ egwuregwu.” +Kaptịn Europe Thomas Bjorn maara na iji nnukwu akara buru ụzọ nwere ike fuo n’oge adịghị anya +Thomas Bjorn, kaptịn Europe, maara site na ahụmihe na iji nnukwu akara buru ụzọ na-abanye agba nke otu onye n’ụbọchị nke ikpeazụ na Ryder Cup nwere ike tugharịa bụrụ ụgbọ agaghị atọ ụtọ. +Onye Denmark ahụ pụtara izizi na egwuregwu 1997 na Valderrama, ebe akụkụ nke Seven Ballesteros bụ Captain jiri akara ise gafee ndị America mana ha nwere ike ịgafe ebe ngwucha naanị na imi ha dị n’ihu site na ntakịrị oghere, were merie 14½-13½. +“Ị ga-agba mbọ ichetere onwe gị n’iji nnukwu akara aga na Valderrama; anyị ji nnukwu akara aga na Brookline, ebe emeriri anyi, na Valderrama ebe anyị meriri mana ọ bụ ntakịrị ihe,” Bjorn kwuru, esetere ka elelechara mgbe Klaasị 2018 meriri 5-3 na Fraịde yana ụnyahụ, iji 10-6 aga na Le Golf National. +Yabụ na hịstrị ga-egosi m na onye ọ bụla n’otu ahụ na nke a agwụbeghị. +Ị ga-agbalị si ike echi. +Pụọ ebe ahụ mee ihe niile kwesịrị ekwesị. +Nke a agwụbeghị ruo mgbe inwetara akara ahụ na bọdụ. +Anyị nwere ebumnuche, bụ ka anyị gbalịa nweta iko mmeri a, ya bụ ebe ahụ ka anya anyị tụkwasara. +Ekwubuola m kemgbe na, A na m elekwasa anya na ndị egwuregwu 12 nọ n’akụkụ anyị, mana anyị maara nke ọma ihe kwụ n’akụkụ nke ọzọ - ndị egwuregwu kachasị na mba ụwa.” +N’obi anụrị ka ndị egwuregwu ya siri mee na ama gọlfụ siri ike, Bjorn gbakwunyere: “Agaghị m agbanarị onwe m n’ọsọ na nke a. +Echi bụ ajọ anụ dị iche. +Echi bụ mmemme otu onye nke na-abịa n’ihu, na nke ahụ bụ ihe dị iche ime. +Ọ dị mma inwe onye mmekọrịta n’ihu ebe ahụ mgbe ihe na-aga nke ọma, mana mgbe ịnọ naanị gị n’ihu ebe ahụ, mgbe ahụ ka a ga-anwale gị n’uju dịka onye na-akụ gọlfụ. +Nke ahụ bụ ozi ịkwesịrị ime ka ndị na-eme egwuregwu mara, bụ wepụta n’ime onwe gị nke kacha mma echi. +Ugbu a, ịhapụrụ onye mmekọrịta gị n’azụ ọ ga-agakwa wepụta onwe ya nke kacha mma.” +Na ndịiche Bjorn, nọmba ncherịta ihu nke Jim Furyk ga-achọ ka ndị egwuregwu ya mee nke ọma n’onwe ha karịa ka ha nwere onye mmekọrịta, ewezuga Jordan Spieth na Justin Thomas bụ ndị nwetere akara atọ n’ime anọ. +Furyk n’onwe ya anọrọla na ngwucha nnukwu ụbọchị ntugharị ahụ, ka o osochara n’otu meriri na Brookline tupu ọ bụrụ onye emeriri ka Europe mere ihe ebube “Miracle at Medinah.” +“Echetara m okwu ya niile,” ọ zara ka ajụrụ ya ka Ben Crenshaw kaptịn 1999 siri chịkọba ndị otu ya n’ịbanye ụbọchị ikpeazụ. +“Anyị nwere egwuregwu 12 dị mkpa echi niile, mana ọ ga-adị mma ịmalite n’ike dịka ịhụrụ na Brookline, dịka ịhụrụ na Medinah. +Mgbe ọ gabara otu ụzọ n’ike, ọ na-akwanye nnukwu nkwanye na egwuregwu ndị etiti ahụ. +Anyị na-ahazi ahịrị anyị ka ọ kwesịrị ma tinye ndị nke anyị n’ụdị masịrị anyị, ịma, anyị na-agbalị ime ihe anwansi echi niile.” +Enyela Thomas ọrụ ịgbalị ibu ụzọ na mgba ahụ wee cherịta Rory McIlroy ihu n’isi egwuregwu ahụ, yana Paul Casey, Justin Rose, Jon Rahm, Tommy Fleetwood na Ian Poulter na ndị Europe ndị ọzọ nọ na mgbago usoro ahụ. +“Ejiri m otu ụmụ nwoke ndị a were gaa n’ihi na E chere m na enwetechara m ihe niile,” Bjorn kwuru maka nhọrọ agba nke otu onye ya. +Ebugharịrị ngwa ọgụ ọhụrụ Germany ọzọkwa +Ekwesịrị itinye n’ọrụ Frigate ọhụrụ nke Ndị Agha Mmiri nke Germany na 2014 iji nọchie ngwa ọgụ oge Cold War kabagoro nka, mana ọ gaghị anọ ebe ahụ ruo opekempe afọ na-abịa n’ihi sistem adịghị mma yana ọnụahịa dị oke ọnụ, ụlọ mgbasa ozi nke obodo kwuputara. +Ebugharịala itinye n’ọrụ nke “Rheinland-Pfalz,” isi ụgbọ nke Baden-Wuerttemberg-class frigate ọhụrụ ka o ruo ọkara afọ mbu nke 2019, dabere na akwụkwọ akụkọ Die Zeit, na-arụtụ onye nkwuchite okwu ndị agha aka. +Ụgbọ ahụ kwesịrị isonye Ndị Agha Mmiri na 2014, mana ihe nsogbu mbute ya sochiri oke atụmatụ ahụ. +Ụgbọ Baden-Wuerttemberg-class anọ Ndị Agha Mmiri tụrụ ahịa ya na 2007 ga-abịa dịka nnọchi anya Bremen-class frigate kabagoro nka. +Emere ka aghọta na ha ga-enwe isi egbe siri ike nke ukwuu, ngwa ọgụ ụgbọ elu dị iche iche na ogbunigwe ụgbọ mmiri yana ụfọdụ teknụzụ nzuzo, dị ka radar eweturu ewetu, infrared na ndakọrịta ụda. +Nrụọrụ ndị ọzọ dị mkpa tinyere oge nrụkwa ya tere aka - ọ kwesịrị na ọ ga-ekwe omume itinye n’ọrụ frigate ndị ọhụrụ ahụ ihe ruru afọ abụọ pụọ na ọdụ ụgbọ mmiri. +Kosiladị, igbu oge niile a pụtara na ngwa ọgụ ahụ pụrụ iche - nke ekwuru na ọ ga-enye Germany oghere igosi ike na mba ofesi -ga-abụ ihe megoro ochie mgbe ha ga-amalite ọrụ, Die Zelt tụrụ aka. +Frigate F125 ahụ juputara na nsogbu pụtara n’isi akụkọ n’afọ gara aga mgbe Ndị Agha Mmiri nke Germany jụrụ itinye ụgbọ ahụ n’ọrụ wee bughachi ya na ọdụ nrụpụta ụgbọ mmiri Blohm & Voss dị na Hamburg. +Nke a bụ nke mbụ Ndị Agha Mmiri na-ebughachi ụgbọ mmiri azụ na ndị rụpụtara ya ka ebutechara ya. +Ntakịrị ka amatara maka ihe kpatara eji bughachi ya, mana ndị ụlọ mgbasa ozi Germany rụtụrụ aka ọnụọgụ ihe ole ma ole “mmebi ngwanro na ngwaike “ dị oke mkpa, nke mere na ngwa ọgụ ahụ abaghị uru ma ọ bụrụ na-ebupu ya ka ọ gaa agha. +Ezughị oke ngwanro dị oke mkpa ebe ọ bụ ndị na-akwọ ụgbọ mmiri 120 ga-akwọ Baden-Wuerttemberg-class ahụ - naanị ọkara mmadụ na-akwọ Bremen class frigate ndị ochie. +Ọzọkwa, ọ pụtakwara na ụgbọ mmiri ahụ buru oke ibu nke weturu ike ọrụ ya ma gbachie ndị Agha Mmiri ịgbakwunye ihe nkwalite n’ọdịnihu. +Ekwenyere na 7,000-ton “Rheinland-Pfalz jiri ugboro abụọ karịa ibu ụdị ụgbọ mmiri ndị yana ya n’otu klaasị nke ndị Germany jiri na Second World War. +Ewezuga ngwaike adịghị mma, ọnụego atụmatụ ọrụ ahụ niile - tinyere ịzụpụta ndị ga-akwọ ya - na-apụtakwa okwu. +Ekwuru na oruola ihe mmaja ijeri €3.1 (ijeri $3.6) - gbagoo site na ijeri €2.2 izizi. +Nsogbu jidere frigate ọhụrụ ndị ahụ pụbara oke mkpa n’ihi ịdọ aka ntị emere n’oge adịghị anya na ike Ndị Agha Mmiri nke Germany na-ebeleta. +Na mbido afọ a, Hans-Peter Bartels, onye isi ọgbakọ nchekwa ndị ọmebe iwu nke Germany, kwuputara na n’ezie Ndị Agha Mmiri “enwezughịzi ụgbọ mmiri enwere ike zipu n’ọrụ.” +Onye ọrụ ahụ kwuru na okwu ahụ abawanyela ọsọọsọ ka n’oge na-aga, n’ihi na ewepụrụ ụgbọ mmiri ndị ochie n’ọrụ mana enweghị ụgbọ ewepụtara iji nọchie ha. +O bekuru mbeku na ọ nweghị Baden-Wuerttemberg-class frigate nke nwere ike isonye Ndị Agha Mmiri. +National Trust tinyere ntị na ndụ nzuzo nke ụsụ +Nyocha ọhụrụ a an-eme n’otu ogige dị na Scottish Highlands chọrọ igosipụta otu ụsụ siri eji gburgburu ahụ akpa nri. +A na-atụ anya na nchọpụta ahụ ga-agbakwasa ihie na omume ụmụ-anụmanụ a na-anụ ara pụrụ iche were nyere aka n’ihazi ọrụ nchekwa ọdịnihu. +Mmụta ahụ ndị nyocha sayensị National Trust for Scotland na-eme ga-esoro ụsụ pipistrelles ama ama na soprano pipistrelles yana brown long-eared na Daubenton na Inverewe Gardens dị na Wester Ross. +A ga-edebe igwe ndekọ pụrụ iche n’akụkụ ebe dị mkpa n’okirikiri ogige ahụ iji sochie omume ụsụ ndị a n’ime oge niile. +Ndị ọrụ NHS na ndị wepụtara onwe ha ga-emekwa nyocha mkpagharị site na n’iji igwe nchọpụta a na-eji n’aka. +Nyocha ụda nke ọkammara nke ndekọ niile ga-egosi ugboro ole ụsụ n’akpọ oku na ihe ụdị nke ọ bụla na-eme. +A ga-emepụta mapụ ebe obibi na ndekọba iji mebe ihe eserese gburugburu nke omume ha n’uju. +Rob Dewar, onye ndụmọdụ banyere nchekwa ekereụwa maka NTS, nwere olile anya na nsonazụ ndị a ga-egosi akụkụ ebe obibi ahụ kacha dị ụsụ mkpa na ka ụdị nke ọ bụla si eji ya eme ihe. +Ozi nke a ga-enyere aka ime mkpebi n’uru ọrụ njikwa ebe obibi dị ka mmepụta ala ahịhịa yana otu kacha mma iji chekwaa ala osisi maka ụsụ na ụdị ndị ọzọ metụtara ha. +Ọnụọgụ ụsụ na Scotland yana UK agbadaala nke ukwuu n’ime afọ iri gara aga. +Ha nọ n’ihe iyi egwu sitere na ọrụ ịrụ ụlọ na mmepe nke na-emetụta ebe ụra na ofufu ebe obibi. +Turbine Ikuku na inye ihie nwere ike ibute ihe ize ndụ, yana flypaper na ụfọdụ kemikal nchekwa ngwaọrụ eji arụ ụlọ, yana kwa mbuso agha sitere na nwamba na-ebi n’ụlọ. +N’ezie ụsụ ekpughị isi. +Kosiladị, n’ihi omume ịkpa nri n’abalị, ntị ha dị mkpa karịa anya ha mgbe oruru n’inwude anụ oriri. +Ha na-eji usoro nchọpụta ndaghachi ụda were nweta ahụhụ na ihe mgbachi dị n’ụzọ ofufe ha. +NTS, bụ ndị ọ dị n’aka ilekọta ihe karịrị ụlọ ochie 270, ubi 38 dị mkpa na hectare ala 76,000 n’okirikiri obodo, kpọrọ ụsụ oke mkpa. +Ọ nwere ndị ọkammara iri azụrụ azụ bụ ndị na-eme nyocha kwa mgbe, na-enyocha ebe ụra ma mee nzọpụta mgbe ụfọdụ. +Ụlọ ọrụ ahụ edobela ebe pụrụ iche na Scotland izizi ewepụtara maka ụsụ n’ogige Threave dị na Dumfries na Galloway, bụ be ụdị ụsụ asatọ n’ime iri enwere na Scotland bi. +Onye njikwa ogige ahụ David Thompson kwuru na ogige ahụ bụ ebe kacha mma maka ha. +“Na Threaves ebe a, anyị nwere akụkụ mara mma maka ụsụ,” o kwuru. +“Anyị nwere ụlọ ochie, osisi kagoro nka na ebe obibi niile dị mma. +Mana a ka nwere ọtụtụ ihe gbasara ụsụ amatabeghị, ya mere na ọrụ anyị na-arụ ebe a yana n’ogige ụlọ ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọta karịa banyere ihe ha chọrọ iji n’ebi nke ọma.” +O kwukwara mkpa ọ dị ilele maka ụsụ tupu emebe ndozi n’ogige ụlọ maka enwere ike mebie n’amaghị ama otu ebe ụra nne na nwa, nwere ike gbuo ihe ruru ndị nwanyị 400 na ụmụ ha, nwere ike ikpochapu ọnụọgụ niile bi ebe ahụ. +Echekwabara ụsụ na ọ bụ mpụ igbu, mekpa ha ahụ ma ọ bụ nye ha nsogbu ma ọ bụ mebie ebe ụra ha. +Elisabeth Ferrell, onye ọrụ Scot maka Bat Conservation Trust, enyela ndị ọhaneze nkwado ka ha tinye aka. +O kwuru: “Anyị ka nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụ banyere ụsụ anyị yana ọtụtụ ụdị anyị, nke anyị amaghị ka ọnụọgụ ha si ebi.” +Ronaldo jụrụ ebubo ndakpo n’ike dịka ndị ọka iwu ya dị nkwadobe ịgba akwụkwọ akụkọ Germany akwụkwọ +Cristiano Ronaldo akpọọla ebubo ndakpo n’ike eboro ya dịka “akụkọ ụgha,” na-ekwu na ndị mmadụ “chọrọ ịkwalite onwe ha” site na iji aha ya. +Ndị ọka iwu ya adịla nkwadobe ịgba akwụkwọ akụkọ Germany, Der Spiegel akwụkwọ, bụ ndị biputara ebubo ahụ. +Eboro onye nke ahụ na-agba ihu na Portugal na Juventus ebubo idakpo nwanyị America n’ike aha ya bụ Kathryn Mayorga, n’ime ụlọ ụlọ nkwari akụ dị na Las Vegas, na 2009. +Eboro ebubo na ọ kwụrụ ya $375,000 iji mee ya ka ọ nọrọ nwayọọ gbasara ihe mere, Der Spiegel kwuputara na Fraịde. +Mgbe ọ na-agwa nde 142 ndị na-eso ya okwu na vidiyo Instagram Live ka ekwuputachara ebubo ahụ, Ronaldo, 33, kpọrọ akụkọ ahụ “akụkọ ụgha.” +“Mba, mba, mba, mba, mba. +Ihe ha kwuru taa, akụkọ ụgha,” onye mmeri Ballo d’Or ugboro ise ahụ kwuru na igwefoto. +“Ha chọrọ ịkwalite onwe ha site na iji aha m. +Ọ na-emebu eme. +Ha chọrọ ka amara ha iji aha m, mana o so n’ọrụ a. +A bụ m onye anụrị juputara obi ma dịkwa mma,” onye egwuregwu ahụ gbakwunyere, na-achị ọchị. +Ndị ọka iwu Ronaldo na-akwadobe ịgba Der Spiegel akwụkwọ n’ihi ebubo ahụ, bụ nke ha kpọrọ “akụkọ agaghị anabata maka nyocha banyere ndụ nzuzo,” dabere na Reuters. +Onye ọka iwu Christian Schertz kwuru na onye egwuregwu ahụ ga-anara ego iti aka n’obi maka “ mmebi ụkpụrụ n’ọnụego dabara n’ihe emebiri, bụ eleghị anya otu n’ime ịda iwu kachasị nke ikike nkeonwe n’afọ adịghị anya.” +Ekwuru na ihe ebubo ahụ mere na Juun 2009 n’ime ụlọ Palms Hotel and Casino dị na Las Vegas. +Ka ha zutechara n’ụlọ ịgba egwu, Ronaldo na Mayorga laghachiri azụ n’ime ụlọ onye egwuregwu ahụ, ebe ọ dakporo ya n’ike site na ike, dabere na akwụkwọ agbara na Clark County District Court dị na Nevada. +Mayorga kwuputara na Ronaldo mere nsekpu ala ka ọ mechara ihe ebubo ahụ were gwa ya na ọ bụ “pesentị 99” “ezigbo mmadụ” “ otu pesentị mechuru ihu.” +Akwụkwọ ahụ na-ekwuputa na Ronaldo kwenyere na ha nwere mmekọrịta nwoke na nwanyị mana onye ọ bụla kwenyere. +Mayorga kwuputakwara na ya gara na ndị uwe ojii na esetere foto mmerụ ahụ ya n’ụlọ ọgwụ, mana emechara ya kwenye ikpebi n’agaghị ụlọ ikpe n’ihi “n’ujo mmegwara tụrụ ya” na “echiche chebere ya maka imebọ ya n’ọhaeze.” +Nwata nwanyị a gbara afọ 34 kwuru na ya-chọrọ ka atụgharịa mkpezi ahụ ebe ọ ka na-enwe ihe mgbu sitere n’ihe ebubo ahụ. +Ronaldo na-achọ ka ọ banye Real Madrid site na Manchester United oge ndakpo ahụ mere, na n’oge okpomọkụ a, ọ gara nnukwu otu Italy, Juve na nkwekọrịta nde €100. +Brexit: UK “ga na-enwe nwute dịrị gaba ma ndị na-arụ ụgbọ ala funari ha +UK “ga-enwe nwute dịịrị gaba” ma ọ bụrụ na o tufuo ọkwa ya dị ka onye ọchịchị n’ịrụpụta ụgbọ ala n’ụwa ma Brexit gachaa, Ọde Akwụkwọ Azụmahịa Greg Clark kwuru. +Ọ gbakwunyere na ọ bụ ihe “na-atụ uche” na Toyota UK gwara BBC na ọ bụrụ na Britain apụọ na EU na-enweghị nkwekọrịta, na ha ga-akwụsị nwa oge ịrụpụta ihe n’ụlọ nrụpụta dị na Burnaston, n’akụkụ Derby. +“Anyị chọrọ nkwekọrịta,” Mr Clark kwuru. +Onye ọrụ ụgbọ ala nke Japan ahụ kwuru na ndapụta nke igbu oge n’oke ala ma ọ bụrụ na enweghị nkwekọrịta Brexit nwere ike napụ ọrụ. +Ụlọ nrụpụta nke Burnaston - bụ nke na-arụpụta Toyota Auris na Avensis - rụpụtara ihe ruru ụgbọ ala 150,000 n’afọ gara aga nke ebupuru 90% ya na mba European Union ndị ọzọ. +“Echiche m bụ na ọ bụrụ na Britain apụọ na EU na ngwucha Maachị, anyị ga-ahụ na nrụpụta kwụsịrị n’ụlọ nrụpụta anyị” Marvin Cooke onye isi njikwa Toyota na Burnaston kwuru. +Ndị ọzọ na-arụpụta ụgbọ ala na UK na-atụ egwu banyere ịhapụ EU na-enweghị nkwekọrịta ka azụmahịa na-agafe oke ala ga-esi rụọ ọrụ, tinyere Honda, BMW na Jaguar Land Rover. +BMW, maka ọmụmatụ, kwuru na ya ga-emechi Obere ụlọ nrụpụta ya dị na Oxford maka otu ọnwa ma emechaa Brexit. +Mkpatụta kacha gbasara ihe ndị na-arụ ụgbọ ala kwuru bụ n’ihe egwu mbunye ahịa ma ọ bụrụ na enwetaghị nkwekọrịta. +A na-eme nrụpụta na Toyota n’ahiri usoro “ọ bịa ozugbo”, ebe akụkụ ụgbọ ala na-eji nkeji 37 nwere esi n’aka ndị mbunye ahịa abịa, ma UK na EU maka ụgbọ ala atụrụ ahịa ya. +Ọ bụrụ na UK ahapụ EU n’enwetaghị nkwekọrịta na Maachị 29, enwere ike inwe ọgbaghara n’oke ala bụ nke ụlọ nrụpụta kwuru na ọ nwere ike bute igbu oge yana ezughị ezu akụkụ ụgbọ ala. +Ọ gaghị ekwe omume na Toyota ga-ahapụ ngwaahịa karịrị nke otu ụbọchị n’ụlọ nrụpụta ha dị na Derbyshire, ụlọ ọrụ ahụ kwuru, yamere na nrụpụta ga-akwụsị. +Mr Clark kwuru na atụmatụ Chequers nke Theresa May maka mmekọrịta ha na EU n’ọdịnihu bụ “nke emebere ka ọ zenarị nyocha niile ahụ n’oke ala.” +“Anyị chọrọ inwe nkwekọrịta. Anyị chọrọ inwe nkwekọrịta kacha mma ga-enye anyị oghere dịka m na-ekwu, nke abụghị naanị inweta ọganihu ugbu a ma ka anyị jidekwa oghere a,” ọ gwara ihe mmemme BBC Radio 4 Today. +“Akaebe sitere n’abụghị naanị Toyota ma ndị ọzọ na-eme nrụpụta bụ na ekwesịrị ịga n’ihu soro usoro mbunye ahịa nke na-aga nke ọma kpamkpam.” +Toyota enweghị ike ikwu ogologo oge ole a ga-akwụsị ime nrụpụta, mana n’ote aka, ha na-adọ aka na ntị mgbakwunye ọnụego ga-ebelata ike asompi ya na emechaa a ga-anapụ ọrụ. +Peter Tsouvallaris, bụ onye rụgoro ọrụ na Burnaston afọ 24, bụrụkwa onye nchịkọba otu ndị ọrụ n’ụlọ nrụpụta ahụ, kwuru na ndị otu ya na-atụ uche nke ukwuu: “N’ahụmihe m, ozugbo ọrụ ndị a lara, ha anaghị alaghachi azụ. +Otu onye nkwuchite okwu gọọmentị kwuru: “Anyị eweputala atụmatụ doro anya were ntụkwasị obi maka mmekọrịta anyị na EU n’ọdịnihu. +Enwere ike budaa oge nzụkọ Trump na Rosenstein ọzọ, White House kwuru +Enwere ike ibuda nzụkọ ahụ dị oke mkpa nke Donald Trump na osote onye isi ọka ikpe Rod Rosenstein nwere “izu ọzọ na-abịa” ebe mgba maka onye nhọpụta ụlọ ikpe kachasị elu Brett Kavanaugh na-aga n’ihu, White House kwuru na Sọnde. +Rosenstein na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche Robert Mueller bụ onye na-eme nyocha ntinye aka ndị Russia na ntuli aka, njikọ dị n’etiti ndị inyeaka Trump na Russia yana mgbachi nke inweta ikpe nkwumọtọ sitere na onye isi ala. +Ma Trump a ga-achụ ka ọ ga-ahapụ osote onye isi ọka ikpe ahụ, n’ihi ya tinye nnwere onwe Mueller n’ihe egwu, mụnyere ọkụ na asịrị Washington n’ọtụtụ ọnwa. +Na mbido ọnwa a, New York Times kwuputara na Rosenstein kwuru maka iyi eriri okwu iji dekọba nrụrịta ụka Trump na iwepu onye isi ala site n’ụzọ mmegharị 25th. +Rosenstein gọnarịrị akụkọ a. +Mana Mọnde gara aga ọ gara na White House, n’etiti mkpesa na ọ chọrọ irutu. +Kama, ekwuputere nzụkọ n’etiti Trump, onye nke nọ na United Nations na New York maka Tọsde. +Trump kwuru na “ọ gaghị amasị” ya ịchụ Rosentein mana mgbe ahụ egbuturu oge nzụkọ ahụ iji zere ịkụkọta n’ọnụnụ ọgbakọ ndị ọkaikpe Nzụkọ Ọmeiwu nke Kavanaugh na otu n’ime ụmụ nwanyị ndị boro ya ebubo nke omume arụrụ ala, Dk Christine Blasey Ford, ha abụọ nyere akaebe. +Na Fraịde, Trump tiri iwu nke nyocha FBI n’otu-izu maka ebubo chere Kavanaugh, nke gbukwuru oge nke ntuli aka Nzụkọ Ọmeiwu n’uju. +Ọdee Akwụkwọ mgbasa ozi nke Trump, Sarah Sanders, pụtara na Fox News na Sọnde. +Ajụrụ ya maka nzụkọ Rosentein, o kwuru: “Atọọla ụbọchị maka nke ahụ, ọ nwere ike ịbụ n’izu na abịa, m na ahụ ka nke ahụ laghachiri otu izu n’ihi ihe niile na eme ugbu a na ụlọ ikpe kachasị n’obodo. +Mana anyị ga-ahụ, ọ na amasị m oge niile ịme ka ndị mgbasa ozi mara ihe na eme ozugbo.” +Ụfọdụ ndi nta akụkọ ga-adọkpụ ngozusike ahụ: Sanders emebeghị nchịkọta akụkọ nke White House kemgbe Septemba 10. +Onye nlekọta Chris Wallace jụrụ ihe kpatara ya. +Sanders kwuru na ụkọ nchịkọta akụkọ bụ n’ihi nleda anya maka “nnukwu ọchụchọ nlebanye anya” nke ndị nta akụkọ TV,” agbanyeghi na o kwuru: “Agaghị m ekwenye n’ezie ha na ha na achọ oke nlebanye anya.” +Ọ tụnyere nkwukọrịta ozugbo n’etiti Trump na ndị mgbasa ozi ga-agbagote. +“Onye isi ala na enwe oge njụrịkọta ajụjụ ọnụ karịa onye isi ala ọ bụla bịara tupu ya,” o kwuru, tinye na arụtụghị aka n’ihe akaebe: “Anyị elenyela anya na nọmba ndị a.” +Nchịkọta akụkọ ga na eme, Sanders kwuru, mana “ọ bụrụ na ndị mgbasa ozi nwee ohere ịjụ onye isi ala nke United States ajụjụ ozugbo, nke ahụ ka ịgwa m okwu mma karịa. +Anyị na anwa ịme nke ahụ ọtụtụ oge, unu ahụla ka anyị mere nke ahụ n’izu ole ma ole gara aga, nke ahụ ga-anọchikwa nchịkọta akụkọ mgbe ị nwere ike ịgwa onye isi ala nke United States okwu.” +Trump kwa oge na aza ajụjụ mgbe ọ na ahapụ White House ma ọ bụ sonye n’oge njụajụjụ ma ọ bụ ọgbakọ ndị mgbasa ozi mgbe enwere ndị mbịambịa ndị ọchịchị. +Ọgbakọ mgbasa ozi naanị ya anaghị adịkebe. +Na New York n’izu a onye isi ala ikekwe kọwara ihe kpatara ya, na eme mpụta na adịghị mma, oge ụfọdụ mpụta jọrọ njọ n’ihu ndị nta akụkọ. +Ọde Akwụkwọ Ahụike degara ndị ọrụ EU akwụkwọ na NHS Scotland maka ihe egwu Brexit +Ọde Akwụkwọ Ahụike edegala akwụkwọ maka ndị ọrụ EU na arụ ọrụ na NHS nke Scotland iji gosi ekele nke obodo ahụ ma rịọ ka ha nọrọ mgbe Brexit gachara. +Jeane Freeman MSP zigara leta n’ime ọnwa isiii iji ruo mgbe ndị UK ga-apụ na EU. +Gọọmentị ndị Scotland ewepụtala onwe ha iji kpuchie ụgwọ nke akwụkwọ anamachọihe ọkwa ndị bigoro n’obodo maka ndị amaala EU n’ọrụ ọhaneze ya ekewara ekewa. +Na leta ya, Nwada Freeman dere: “N’oge ọkọchị, ụbụbọ n’etiti UK na EU na nsepụ aka agaala n’ihu, na aga irute mkpebi atụrụ anya n’ọtọm a. +Mana Gọọmentị UK na ewelitekwa nkwadobe ya maka ọnọdụ enweghị nkwekọrịta ọ bụla. +Ama m na nke a ga-abụ oge mgbakasị ahụ maka unu niille. +Ya kpatara m ji chọọ ikwuputegharị ugbu a nnukwu ugwu m na akwanyere ndị ọrụ niile maka enyemaka ha, agbanyeghị obodo ha. +Ndị ibe m si n’ofe EU, ma gafere, na eweta ahụmịhe na nka dị mkpa na agbatị ma melite ọrụ nke ọrụ ahụike, ma nyere ndị ọrịa na ogbe anyị na arụrụ ọrụ aka. +Scotland bụ be gị n’ezie, anyị chọrọ ka unu nọrọ ebe a.” +Christion Abercrombie Na Agabiga Ịwa Ahụ Mberede Ka Ọ Nwechara Mmerụ Ahụ N’isi +Onye azụ nke Tennessee State Tigers Christion Abercrombie mere ịwa ahụ mberede ka ọ nwechara mmerụ ahụ n’ihi na mmeri 31-27 n’aka Vanderbilt Commodores, Mike Organ nke Tennessee kpesara. +Onye isi ndu Tennessee State bụ Rod Reed gwara ndị nta akụkọ na ahụ mmerụ ahụ mere obere oge ka agachara ọkara oge egwuregwu. +“Ọ bịara n’akụkụ wee tụsa ebe ahụ, “Reed kwuru. +Ndị ọzụzụ na ndị ahụike nyere Abercrombie oxygen n’akụkụ ahụ tupu edowe ya n’ihe ndọkpụrụ wee buru ya laghachi maka nyocha ndị ọzọ. +Otu onye ọrụ si na Tennessee State gwara Chris Harris nke WSMV dị na Nashville, Tennessee, na Abercrombie apụtala n’ụlọ ịwa ahụ na Vanderbilt Medical Center. +Harris tinyere na “enwebeghị nkọwapụta n’ụdịrị/ogo nke ahụ mmerụ ahụ” na ndị Tennessee State na anwa ịmata mgbe ahụ mmerụ ahụ mere. +Abercrombie, onye nke abụọ na kọleji na eyi uwe ọbara ọbara, nọ n’afọ nke izizi ya na Tennessee State ka o sichara Illinois gafete. +Ọ nwere mgbakọta mgbochi ise na Satọde tupu ọ pụọ n’egwuregwu ahụ, nke wetere mgbakọ afọ asọmpi ya na mgbochi 18. +A ga-agba ndị azụmahịa ofesi ụgwọ ọrụ stampụ ka dị elu mgbe ha zụtara akụ n’ime UK +A ga-agba ndị azụmahịa ofesi ụgwọ ọrụ stampụ ka dị elu mgbe ha zụtara akụ n’ime UK ma jiri ego ahụ mara n’elu wee nyere ndị na enweghị ụlọ aka n’okpuru atụmatụ Tory +Omume ahụ ga-emebi ọganihu nke agbamume Corbyn ịdọta ndị ntuli aka na etolite +A ga-agba ụgwọ mwelite ọrụ stampụ n’isi ndị na anaghị akwụ ụgwọ ụtụ isi na UK +Ụlọ Akụ na atụ anya ka ọ gbagote nde £120 kwa afọ - iji nyere ndị na enweghị ụlọ aka +A na achọ ịgba ndị azụmahịa ofesi ụgwọ ọrụ stampụ dị elu mgbe ha zụtara akụ n’ime UK - a ga-eji ego mara n’elu wee nyere ndị na enweghị ụlọ aka, Theresa May ga-ekwupute nke a taa. +A ga-ahụta nke ahụ ka ọnwụnwa iji mebie ọganihu nke agbamume Jeremy Corbyn iji dọta ndị ntuli aka na etolite eto site na iji nkwa ịnyekwu ụlọ dị ọnụ ala ma chụwa ndị na erite nnukwu ụgwọ ọnwa. +A ga-agba ụgwọ ọrụ stampụ n’isi ndị mmadụ na ụlọ ọrụ ndị na anaghị akwụ ụgwọ ụtụ isi na UK, ego mara n’elu ga-ebuwanye mbọ Gọọmentị iji luso enweghị ụlọ agha. +Mgbakwunye ụgwọ ahụ - nke bụ mgbakwunye n’ọrụ stampụ dị ugbu a, gụnyere ọkwa ndị dị elu ebubatara n’afọ abụọ gara aga n’ụlọ nke abụọ yana ịzụta-maka-ịgbazinye - nwere ike irucha pasentị atọ. +Ụlọ Akụ na atụ anya ka ọ gbagote nde £120 kwa afọ. +Ekpebiri na pasentị 13 bụ ndị na abụghị ndị bi na UK na azụta akụ ndị London arụrụ ọhụrụ, na ebugo ụgwọ ma na eme ka o sie ike maka ndị na eme nzụta izizi ha iji nweta ọganihu n’nzọụkwụ obibi ụlọ. +Imirikiti mpaghara ndị nwere ego n’obodo ahụ - karịchara n’isi ala - nwere “ime obodo tọgbọ nkịtị” n’ihi ọnụọgụ nke ndị nzụta ofesi dị elu, ndị na anọ ọtụtụ oge ha na mpụga nke obodo ahụ. +Iwu ọhụrụ ahụ na abịa n’izu ole ma ole ka Boris Johnson kpọchara oku maka mgbubi n’ọrụ stampụ iji nyere ndị ntorobịa aka ịnwe ụlọ izizi nke ha. +O boro ndị nnukwu ụlọ ọrụ nrụpụta ebubo maka idowe akụ n’ọnụego dị elu site na ịnapụ ala mana ha anaghị eji ya, ma rịọ Nwada May ka ọ hapụ oke n’ụlọ ndị dị ọnụ ala iji dozie “ihere ụlọ obibi” nke Britain. +Maazị Corbyn ekwuputela usoro mmezi ụlọ obibi na adọta ntinye uche, gụnyere njikwa ụgwọ ụlọ yana nkwụsị nke nchụpụ “abụghị ụta mmadụ”. +Ọ chọkwara ịnyekwu ndị kansụl ikike iji rụpụta ụlọ ọhụrụ. +Nwada May kwuru: “Afọ gara aga m kwuru m ga-ewepụta ọchịchị m iji weghachite nrọ Britain - ndụ ahụ kwesịrị ka mma maka agbụrụ ọhụrụ ọ bụla. +Ma nke ahụ pụtara idozi ahịa ụlọ obibi anyị mebiri emebi. +Britain ga-ekpughere oge niile maka ndị mmadụ chọrọ ibi, rụọ ọrụ ma bido ndụ ebe a. +Kaosiladị, ọ nweghị ike ịdị mma na ọ dị mfe maka ndị mmadụ na ebighi n’ime UK, yanakwa ụlọ ọrụ ndị ofesi, iji zụta ụlọ ka ndị obibi Britain na arụsị ọrụ ike. +Maka ọtụtụ ndị mmadụ, nrọ nke ịnwe ụlọ nke ha bụzị ihe ọ nọ nso eru aka, mmetọ nke enweghị ebe obibi bụzị ihe dị ire.” +Jack Ross: ‘Ọchịchọ m kachasị bụ ijikwa Scotland’ +Onye isi nke Sunderland Jack Ross kwuru na “ọchịchọ ya kachasị” bụ ịbụrụ onye ndu Scotland otu oge. +Onye Scotland ahụ, 42, na enwe obi ụtọ maka mgba nke iweghachite otu asọmpi North-East, ndị nọ ugbu a n’ọkwa atọ na League One, akara atọ n’okpuru nke isi. +Ọ gara na Stadium of Light n’ọkọchị a ka o duchara St Mirren laghachite na Scottish Premiership n’afọ asọmpi gara aga. +“Achọburu m ịgbara obodo m bọọlụ ka m bụ onye egwu. +Enwetara m cap B nke ahụ bụ ya,” Ross gwara Sportsound nke BBC Scotland. +“Mana etolitere m na elele Scotland na Hampden ọtụtụ oge, mụ na nna m ka m bụ nwata, ọ bụ ihe na adọghachi m oge niile. +Ohere ahụ ga-abịa, agbanyeghị, ọ bụrụ na m mee nke ọma na njikwa otu egwuregwu.” +Ndị bịara tupu Ross ka onye ndu Sunderland gụnyere Dick Advocaat, David Moyes, Sam Allardyce, Martin O'Neill, Roy Keane, Gue Poyet na Paulo Di Canio. +Onye isi nke Alloa Athletic gara aga kwuru na ọ naghị enwe ụjọ n’isochi aha ndị ahụ ama ama n’ụdịrị nnukwu otu ahụ, ka ọ jụchara arịrịọ ndị si na Barnsley na Ipswich Town. +“Ọganihu maka m n’oge a ka a ga-atụ site na “enwere m ike idughachi otu a na Premier League?’ +N’ihi nyiwe na ụlọ nke otu a, na enweghị mgbagha kwesịrị ịnọ na Premier League,” o kwuru. +“Ọ bụghị ọrụ dị mfe iji laghachi ebe ahụ, mana enwere naanị ike ịhụta onwe m ka onye mere nke ọma ebe a ma ọ bụrụ na m nwere ike idughachi otu ahụ ebe ahụ.” +Ross nọ naanị afọ atọ n’ọrụ njikwa ya, ka obere oge gachara ka onye enyemaka na Dumbarton yana ọnụnọ ọnwa 15 n’otu ndị ọrụ Hearts. +Ọ gara nyere Alloa aka ịlaghachite na mgbatu ha gara n’ọkwa nke atọ, ma tụgharịa St Mirren site n’isi nke mgbatu gaa na mmeri iko Championship n’afọ asọmpi sotere. +Ma Ross kwuru na ọ nwere obi ume ala ugbu a karia ka ọ nwere n’oge onye egwu ya na Clyde, Hartlepool, Falkirk, St Mirren na Hamilton Academical. +“Ọ nwere ike ịbụ ezi njikọ,” ọ chetere, ịweghara ikike na Alloa. +“Ekwenyere n’ezie na njikwa bụ ihe ziri m nke ọma, karịa ịgba agba. +Ọ dara ka ihe ọjọọ n’ihi na m mere nke ọma, ebiri ezigbo ndụ na ya, ma nwee ọhụụ ụfọdụ ihe ndị elu dị mma. +Mana ịgba agba na esi ike. +Enwere ọtụtụ ihe ị ga-agafere kwa izu. +M ka na agafe nke ahụ n’okwu nke nsogbu na ndagide nke ọrụ ahụ mana njikwa dị mma n’anya. +Bido na mbụ achọrọ m ịme njikwa, ugbu a ana m eme ya, ọ kachasị enye m mmetụta obi ume ala, abụ m onwe m na ndụ okenye m niile.” +Ị nwere ike ịge njụajụjụ ọnụ ahụ n’uju na Sportsound na Sọnde, Septemba 30, na Radio Scotland n’oge 12:00 na 13:00 BST +Oge kachasị mma maka pint bụ 5:30 mgbede na Satọde, nyocha kwuru +Okpomọkụ ọkọchị etipuola ego maka ụlọ mmanya ndị Britain ndị na aghọ ada mana dosakwuo nsogbu n’elu ndị azụmahịa ụlọ oriri na ọṅụṅụ. +Otu ndị ụlọ mmanya hụrụ ka ahịa rịgoro pasentị 2.7 na Julaị - mana nrite n’ụlọ oriri na ọṅụṅụ dara pasentị 4.8, ọnụọgụ gosiri. +Peter Martin, nke ndị ndụmọdụ azụmahịa CGA, nke kpokọrọ ọnụọgụ ahụ, kwuru: “Anyanwụ ka dị yana nsonye England na World Cup toro ogologo ole atụrụ anya pụtara na Julaị sochiri otu usoro ka ọnwa nke Juun gara aga, mgbe ụlọ mmanya rịgoro pasentị 2.8, belụsọ na ndị ụlọ oriri na ọṅụṅụ nwere nnukwu nhịahụ. +Nrịda nke pasentị 1.8 n’azụmahịa ụlọ oriri na ọṅụṅụ na Juun kawanyere njọ na Julai. +Ụlọ mmanya kachasị mee nke ọma otu yitere ihe dị ka otu ụlọ oriri na ọṅụṅụ si gbadaa. +Ụlọ mmanya na ere nri tara ahụhụ n’anyanwụ, mana ọbụghị ka nke ndị na azụ ahịa ụlọ oriri na ọṅụṅụ. +Ọ dị ka ndị mmadụ chọrọ ịpụ ṅwụọ mmanya. +N’ofe ụlọ mmanya ndị a na ejikwa ọrịre mmanya rịgoro pasentị 6.6 maka ọnwa ahụ, ebe nri rịdara pasenti atọ.” +Paul Newman, nke ntụrụndụ na nlekọta onye nyocha RSM kwuru: “Nsonaazụ ndị a sochiri usoro ahụ anyị hụrụ kemgbe ngwụcha nke Eprel. +Ihuigwe na mmetụta nke mmemme mmerịkọta ma ọ bụ egwuregwu ndị dị ukwuu ka bụkwa nnukwu mmetụta mgbe ọ bịara n’ọrịre n’ahịa ndị apụrụ n’ụlọ. +Ọ naghị abịa ka ihe ntụnanya na ụlọ oriri na ọṅụṅụ gara n’ihu na aghọ ada, agbanyeghị nrịda ọrịre nke pasentị 4.8 kwa afọ kwa afọ ga-abụ ihe nnukwu mgbu n’elu ndagide ụgwọ na aga ugbu a. +Okpomọkụ ogologo ọkọchị ahụ enweghị ike ịbịa n’oge jọrọ njọ maka ndị na ere nri, mana oge ga-ekwu ma temprechọ dịtụ mma enwere na Ọgọst a ga-eweta ụfọdụ ezumike achọrọ.” +Mgbakọta ntolite ọrịre n’ofe ụlọ mmanya na ụlọ oriri na ọṅụṅụ, gụnyere ndị mepere ọhụrụ, bụ pasentị 2.7 na Julaị, na egosi mgbatu na mbupute azụmahịa ọhụrụ. +Nyocha azụmahịa ụlọ ọrụ Coffer Peach Tracker maka ụlọ mmanya UK, ngalaba ụlọ mmanya na ụlọ oriri na ọṅụṅụ na anakọta ma nyochaa data arụmọrụ site na otu nrụọrụ 47, site na ịnwe ọmụrụnwa ekpokọtara gafere ijeri £9, nke ahụ bụ akara ụlọ ọrụ atọrọ. +Otu n’ime ụmụaka ise nwere akaụntụ ebe mmerịkọta ọhaneze ezoro ezo nke ha na ezonarị nne na nna ha +Otu n’ime ụmụaka ise - ụfọdụ erubeghị afọ 11 - nwere akaụntụ ebe mmerịkọta ọhaneze ha na ezonarị nne na nna na ndị nkuzi ha, nyocha gosiri +Nyocha nke ụmụ akwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndịrị 20,000 gosiri ntolite n’ibe “Insta adịgboroja” +Akụkọ ahụ agbalitela ụjọ na a na ebisa ọdịnaya mmekọrịta nwoke na nwanyị +Pasentị iri abụọ nke ụmụ akwụkwọ kwuru na ha nwere “isi” akaụntụ iji gosi nne na nna +Otu n’ime ụmụaka ise - ụfọdụ na erubeghị afọ 11 - na emepụta akaụntụ ebe mmerịkọta ọhaneze nke ha na ezonarị ndị okenye. +Nyocha nke ụmụ akwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndịrị 20,000 gosiri ntolite ngwangwa n’akaụntụ “Insta adịgboroja” - nrụtụ aka na saịtị nkekọrịta-foto Instagram. +Akụkọ ahụ agbalitela ụjọ na a na ebisa ọdịnaya mmekọrịta nwoke na nwanyị. +Pasentị iri abụọ nke ụmụ akwụkwọ kwuru na ha na ejikwa “isi” akaụntụ dị ọcha iji gosi nne na nna, ma na enwekwa nke nzuzo. +Otu nne dakwutere saịtị nzuzo nke nwa nwanyị ya dị afọ 13 hụrụ ka otu nwa agbọghọ na akwa ndị ọzọ ka ha “nwakpuo ya.” +Nyocha ahụ, si n’aka Digital Awareness UK yana Headmasters” and Headmistresses” Conference (HMC) nke ụlọ akwụkwọ ndị nnwere onwe, hụrụ pasentị 40 nke ndị afọ 11 ruo 18 nwere profaịlụ abụọ, n’ebe ọkara kwenyere na ha nwere akaụntụ nzuzo. +Onye isi HMC Mike Buchanan kwuru: “Ọ na atụ ụjọ na ọtụtụ ndị ntorobịa na anwa ịmepụta oghere n’ịntanetị ebe ndị nne na nna na ndị nkuzi enweghị ike ịchọta ha.” +Eilidh Doyle ga-abụ “olu ndị asọmpi” na oche Ndị Asọmpi Scotland +Ahọpụtala Eilidh Doyle n’otu ndị isi oche nke Ndị Asọmpi Scotland ka onye nduzi na abụghị onye isi na nzụkọ ọgbakọ kwa afọ nke otu nchịkwa. +Doyle bụ onye asọmpi nke Scotland kachasị nweta ihe nrite, onye isi Ian Beattle kọwara mmereme ahụ ka nnukwu ohere maka ndị ahụ na edu egwuregwu ahụ iji nwete elele n’ahụmịhe ya gbasara agbasa n’ọkwa ofesi gafere afọ iri gara aga. +“Eilidh nwere nsọpụrụ buru ibu n’ofe ogbe ndị asọmpi Scotland, UK na ụwa gburugburu, doro anyị anya na asọmpi na Scotland ga-enweta nnukwu elele site na ịwebata ya n’oche ha,” Beattie kwuru. +Doyle kwuru: “Enwere m mmasị ịrụ ọrụ ka olu ndị asọmpi, m na atụ anya na m nwere ike ịnyere aka n’ezie ma nyere aka duzie egwuregwu n’ime Scotland.” +Onye America, meriri mita 200 na mita 400 na Egwuregwu 1996 na Atlanta n’ime mgbakọta nke ọla-edo Olympic ano ya, ugbu a bụ onye ọkachamara BBC, enwenwughi ike ịga ije ka ọ nwechara mbuso agha transient ischemic. +Ọ dere na Twitter: “Otu ọnwa gara aga taa enwere m ọrịa mkpọnwụ ahụ. +Enwenwughi ike ịga ije. +Ndị dọkịnta kwuru naanị oge ga-ekwu na m enwere ike ịlaghachite ma ọ bụ kedu oke m ga-eru. +Ọ bụ nnukwu ọrụ mana alaghachitere m n’uju, mụgharịa otu esi aga ije ma taa m na eme ọrụ siri ike! +Daalụ maka ozi nke nkasị obi!” +Mgbasa ozi ihe mgbapụta mmiri ara na atụle ndị nne yana ehi kewara echiche n’ịntanetị +Ụlọ ọrụ ihe mgbapụta mmiri ara ekewaala echiche n’ịntanetị site na iji mgbasa ozi na atụle ndị nne yana ehi a na amị ara ha. +Iji kapụta mbido nke ihe ekwuru ga-abụ “ihe mgbapụta mmiri ara a na eyi eyi zoro ezo nke izizi n’ụwa,” ụlọ ọrụ teknụzụ ndi ahia Elvie buputere mgbasa ozi vidiyo na egwu na atọ ọchi iji gosipụta nnwere onwe ihe mgbapụta ọhụrụ ahụ na enye ndi nne. +Ezigbo ndị nne anọ gbara egwu n’ọba ehi nke nri ehi juru n’egwu nwere okwu ndị dị ka: “Ee, m na amịpụta mmiri ara m, mana ị gaghị ahụ ọdụdụ ọ bụla ”Ọ bụrụ na ị chọpụtabeghị ndị a abụghị ara ehi, ndị a bụ ara m.” +Isi egwu gara n’ihu: “Gbapụta ya, gbapụta ya, m na enye ụmụ ntakịrị nri, gbapụta ya, gbapụta ya, ụmụ nwanyị m, m na amịpụta mmiri ara.” +Kaosiladị, mgbasa ozi ahụ, nke ebiputegoro n’ibe Facebook nke ụlọ ọrụ ahụ, ebutela nsogbu n’ịntanetị. +Ọ nwere nlele 77,000 yana narị ọnụọgụ nke okwu ntụkwasa, vidio ahụ enwetala ndapụta dị iche iche n’aka ndị nlele, ebe imirikiti na ekwu na ọ na eme ka “ihe egwu” nke ụlọ ọrụ mmiri ara ehi dị mfe n’anya. +“Nnukwu ajọ mkpebi iji ehi wee gbasaa ozi ngwaahịa a. +Dị ka anyị ha ga-adị ime wee mụọ nwa iji mepụta mmiri ara, naanị na a na ezuru ụmụ ha n’ime ụbọchị ole ma ole ka ha mụchara nwa,” otu onye dere. +Ihe mgbapụta mmiri ara Elvie ahụ na ezo n’ime bra nwanyị na elekọta nwa (Elvie/Mother) +Ọzọ dere: “Ihe nnukwu ụjọ aghọtara maka nne yana nwa. +Mana ee gịnị kpatara na ejighi ha iji gbasaa ozi ihe mgbapụta mmiri ara maka ndị nne nwere ohere idowe ụmụ ha?” +Otu onye ọzọ tinyekwara” “Ụdịrị mgbasa ozi na enweghị isi.” +Ndị ọzọ kwuchitere mgbasa ozi ahụ, otu nwanyị kwenyere na egwu ahụ tọrọ ya “ọchị.” +“Echere m na nke a bụ alo mara oke mma. +Enwere m ike ịzụta otu ọ bụrụ na m na enye nwa ara. +Mgbapụta mere m dị ka ehi kpọmkwem. +Mgbasa ozi ahụ bụtụ ihe isi mgbaka mana enwere ya ka ọ dị. +Nke a bụ ngwaahịa nnukwu ọgụgụ isi,” otu onye dere. +Ọzọ dere: “Nke a bụ mgbasa ozi ọhụụ ezubere maka ndi nne na eme mgbapụta (oge ụfọdụ n’ebe ọrụ ma ọ bụ ụlọ mposi ha) na ahụta onwe ha ka “ehi.” +Nke a abụghị mgbasa ozi na eto ma ọ bụ na ama ụlọ ọrụ mmiri ara ikpe.” +Na ngwụcha nke vidio ahụ otu nke ụmụ nwanyị ahụ gosiri na ha na agba egwu kemgbe mana enwere ihe mgbapụta zoro ezo n’ime bra ha. +Nghọta nke kwadobere mgbasa ozi ahụ dabere na nghọta na imirikiti ụmụ nwanyị na agbapụta mmiri ara kwuru na ha na ahụta onwe ha ka ehi. +Ihe Mgbapụta Elvie kaosiladị, zoro ezo kpamkpam, ọ nwere eriri ma ọ bụ okpoko ma zobaa n’ime bra onye na elekọta nwa, na enye ụmụ nwanyị ogere ịgagharị, jide nwa ha, ma pụọ ka ha na agbapụta mmiri ara. +Ana Balarin, onye mmeko na ECD na Mother kwukwasara: “Ihe Mgbaputa Elvie bụ ụdị nnukwu ngwaahịa ọhụrụ kwesịrị mbupute na akpalite mmụọ. +Site na igosi ndịiche n’etiti ụmụ nwanyị na elekọta nwa yana ehi na amịpụta mmiri ara anyị chọrọ itinye mgbapụta mmiri ara yana aka mgba ya niile na mgbado anya, na egosipụtakwa ya ụzọ na enye ọhụụ ma bụrụ nke gaa eru ụlọ, mmetụta nke nnwere onwe dị ukwuu nke ihe mgbapụta ọhụrụ ahụ ga-ewete. +Nke a abụghị izizi ihe mgbapụta Elvie mere ihe mkpọtụ. +N’oge Izu Ekike London, nne ụmụaka abụọ pụtara na warawara ụzọ ịga ije maka onye ọmenka Marta Jakubowski ka ọ na eji ngwaahịa ahụ. +Narị Kwụrụ Narị nke Ụmụaka Gbabatara N’obodo Nwayọ Gara na Ogige Akanya na Oke Ala Texas +Ọnụọgụ nke ụmụaka ndị gbabatara n’obodo ejidere ejide agbagoola na agbanyeghị na ngafe oke ala kwa ọnwa agbanwebeghị nke ukwuu, n’ihi nkwupụta ike na iwu nke nchịkwa Trump webatara emeela ka o sikwuo ike idowe ụmụaka n’aka ndị nkwado. +N’ọdịnala, imirikiti ndị nkwado bubu ndị mgbabata n’onwe ha enweghị ndekọ, ha nwere ụjọ imebi ikike nke ha iji nọrọ n’obodo ahụ site na ịbịa ihu iji zọrọ otu nwa. +Ihe egwu ahu gbagoro na Juun, mgbe ndị ikike etiti obodo kwuputere na ndị nkwado nwere ike ịbịa na ndị okenye nke ezinụlọ ha ndị ọzọ ga-enyefe mbisa mkpịsị aka, na a ga-ekekọrịta data ha n’etiti ndị ikike mbata na ọpụpụ. +Izu gara aga, Matthew Albence, otu onye isi na Mmanye Mbata na Ọpụpụ na Kọstọms, kwuru n’ihu Kọngress na ụlọ ọrụ ahụ ejidela ọtụtụ ndị mmadụ ndị tinyere akwụkwọ ka ha bụrụ ndị nkwado maka ụmụ ntakịrị na enweghị ndị so ha. +Ụlọ ọrụ mechara kwenye na pasentị 70 nke ndị ahụ ejidere enwebughi ndekọ omekome na mbụ. +“Ihe rutere pasentị 80 nke ndị mmadụ bụ ndị nkwado ma ọ bụ onye otu ezinụlọ nke ndị nkwado nọ n’obodo a n’ụzọ gabigara iwu, ọtụtụ n’ime ndị ahụ bụ ndị mbịambịa gabigara iwu. +Yabụ anyị na aga n’ihu na achụ ndị mmadụ ahụ,” Maazị Albence kwuru. +Ịchọ ịhazi ụmụaka ahụ ọsọ ọsọ karịa, ndị ọrụ webatara iwu ọhụrụ ga-achọ ka ụfọdụ ha gosi n’ụlọ ikpe n’ime otu ọnwa nke ejidere ha, karịa ka ụbọchị 60 gachara, nke bubu ọkọlọtọ dịbu adị, site n’aka ndị ọrụ ebe obibi. +Imirikiti ga-egosi site na oku nzụkọ vidio, kama n’onwe, iji rịọ okwu ha maka ọkwa iwu n’ihu ọkaikpe mbata na ọpụpụ. +A ga-ebupu ndị ahụtara ka ndị na etozughi maka ihe elele ozugbo. +Ka ụmụaka ahụ na anọte aka na njide, ka ha nwekwara ike ịnwekwu obi mmaja ma ọ bụ obi mmapụ, nke nwere ike ibute ngosipụta iwe ọkụ ma ọ bụ ọnwụnwa mgbapụ, site n’aka ndị ọrụ ebe obibi yana mkpesa pụtara na sistemụ ahụ n’ọnwa nso nso a. +Ndị nkwuchite kwuru na echiche ndị ahụ na agbalite na nnukwu ụlọ dị ka Tornillo, ebe mgbama na nwata na enwe nhịahụ na ka enwe nleghara anya karịa, n’ihi nha ya. +Ha tinyere na ibuga ụmụaka n’obodo akanya ahụ na enyeghi oge zuru oke iji kwadobe mmụọ ha ma ọ bụ iji kelee ndị enyi ha nwere ike ibuwanye mmaja ọtụtụ n’ime ha na enwe ugbu a. +Syria gwara ‘ndị agha nọ n’obodo ha’ nke US, French na Turkey mebere ka ha pụọ ozugbo +Ikwu okwu n’ihu Mgbakọ Ezumezu UN, Minista Ofesi Walid al-Moualem kpọkwara ndị gbara ọsọ ndụ na Syria ka ha laghachite, agbanyeghị na ọgụ nke obodo ahụ nọ n’afọ asatọ ya. +Moualem, onye na arụkwa ọrụ ka osote praịm minista, kwuru na ndị agha ofesi ahụ nọ n’ala Syrian n’ụzọ gabigara iwu, n’okpuru nzuzo nke iluso ndị alụọ alaa ọgụ, na “a ga-emeso ha omume otu ekwesịrị.” +“Ha ga-apụrịrị ozugbo na enweghị ọnọdụ ọ bụla,” ọ gwara ọgbakọ ahụ. +Moualem kwusiri ike na “ọgụ nke ihe ụjọ agwụchaala” na Syria, ebe ihe karịrị ndị mmadụ 360,000 anwụọla na 2011, ebe ọnụọgụ nde ka achụpụrụ n’ụlọ ha. +O kwuru Damascus ga-aga n’ihu “ịlụ ọgụ a ruo mgbe anyị chụpụrụ ndị alụọ ọlaa Syria niile” maka otu abụọ nke ndị ụjọ yana “ọnụnọ ofesi ọ bụla gabigara iwu.” +United States nwere ndị agha 2,000 n’ime Syria, bụkarị maka ọzụzụ na ịnye ndụmọdụ maka ndị agha Kurdish yana Syrian Arabs na agba Onye Isi Ala Bashar al-Assad mgba. +France nwere karịa ndị agha 1,000 n’ala n’obodo ahụ ọgụ mebichagoro. +N’okwu maka ndị gbara ọsọ ndụ, Moualem kwuru ọnọdụ ndị ahụ dị mma maka ha ịlaghachite, wee tinye ụta n’isi “ụfọdụ obodo ọdịda anyanwụ” maka “ịfesa ụjọ na enweghị isi” nke manyere ndị gbara ọsọ ndụ ịnọte aka. +“Anyị akpọọla ogbe ndị ofesi yana ọgbakọ ndị enyemaka mmadụ iji bido nlaghachite ndị a,” o kwuru. +“Ha ji ihe kwesịrị ịbụ naanị nsogbu enyemaka mmadụ eme ndọrọndọrọ.” +United States na European Union adọọla aka na ntị na agaghị enwe enyemaka nrụgharị maka Syria ruo mgbe enwere nkwekọrịta ndọrọndọrọ ọchịchị n’etiti Assad yana ndị mbuso agha iji kwụsị ọgụ ahụ. +Ndị nnọchite UN kwuru na nkwekọrịta nso nso a n’etiti Russia na Turkey iji tọọ mpaghara nchekwa n’ebe ndị mbuso agha ikpeazụ ka siri ike dị na Idlib nọ emepụtala ohere ij wee na achụ okwu ndọrọndọrọ ọchịchị. +Mkpebi Russian-Turkish ahụ kwụsịrị nnukwu nluso agha nke ndị agha Syria ndị Russia na akwadobe na mpaghara ahụ, ebe ọnụọgụ nde 3 ndị mmadu bi. +Moualem kaosiladị kwụsịrị ike na nkwekọrịta ahụ nwere “oge njedebe ndị doro anya” ma kwupute olile anya na mmereme ndị agha ga-achụba ndị jihadist gụnyere ndị ọgụ si na Nusra Front jikọrọ al-Qaeda, ndị “ ga-ekpochapụ.” +Onye ozi UN Staffan de Mistura na atụ anya ịme nzụkọ izizi ndị ahụ nke ọgbakọ ọhụrụ emepụtara n’ime ndị gọọmentị na ndị otu mbuso agha iji depụta akwụkwọ iwu osote ọgụ maka Syria ma dozie ụzọ maka ntuli aka. +Moualem tụsara ọnọdụ maka nsonye gọọmentị Syria n’ọgbakọ ahụ, na ekwu na ọrụ ọgbakọ ahụ kwesịrị ka amachie ya na “inyocha edemede nke akwụkwọ iwu dị ugbu a,” ma dọọ aka na ntị maka itinye aka. +Ihe Kpatara Na Trump Ga-emeri Agba Nke Abụọ +Site na echiche ahụ, Maazị Trump ga-emeri nhọpụtagharị na 2020 belụsọ na, ebe imirikiti ndị nghọta ezi uche nwere ike ị na atụ anya, mwepu n’oche na agwa ọjọọ ga-akwụsị ọchịchị ya n’oge. +N’ihe ga-abụ na enweghị mgbagha “Ngwụcha ikpeazụ nke onye isi ala kachasị dị egwu!” +Ugbu a, enweghị mgbama nke ike ọgwụgwụ nke nlele. +Kemgbe 2014, ogo oge-mgbasa ozi kachasị agbagoola mkpị ruru nde 1.05 na CNN ebe ọ fọdụrụ ntakịrị ka ọ gbagoo mkpị atọ na nde 1.6 na MSNBC. +Fox News nwere ndị nlele oge mgbasa ozi kachasị bụ nde 2.4, gbagoro nde 1.7 n’afọ anọ gara aga, ka Nielsen si kọwaa, na MSNBC “The Rachel Maddow Show” anọrọla n’isi ogo kebụl site na iji ndị nlele nde 3.5 n’abalị akụkọ ndị dị oke mkpa mere. +“Nke a bụ ọkụ a na adọta ndị mmadụ na ya n’ihi ọ bụ ihe anyị na aghọta,” Neal Baer kwuru, onye ọmenka nke ejije ABC bụ “Designated Survivor,” bụ maka ọde akwụkwọ kabinet bụrụ onye isi ala ka mbuso agha mebichara Capitol. +Nell Scovell, ọdee ihe ọchị ama ama yana ọdee akwụkwọ nke “Just the Funny Parts: And a Few Hard Truths About Sneaking Into the Hollywood Boys" Club," nwere echiche ọzọ. +Ọ chetara ọnyịnya ụgbọ ala na Boston tupu nhọpụta 2016. +Ọkwọ ụgbọ ahụ gwara ya na ọ ga-atụnyere Maazị Trump. +Maka gịnị? ọ jụrụ. +“O kwuru, “N’ihi ọ na eme ka m chịa ọchị,”” Nwada Scovell gwara m. +Enwere uru ntụrụndụ n’ọgbaghara ahụ. +N’ezie, nke na adịghị ka ihe ọzọ na Igwe onyonyoo, akụkọ ndị si na Washington apụta ga-ekpebi ọdịnihu nke Roe v. Wade, ma ndị ezinụlọ ndị gbabatara n’obodo nwere ike ijikọtagharị yana ọdịmma nke akụnụba ụwa. +Iwepu uche bụ okomoko naanị ndị nlele ji ego nwere ike ịmenwu. +Mana ka ọ dị ugbu a, ọ gafere ịbụ onye amaala ma ihe na eme mgbe ị chọtara onwe gị n’elekere isii nke ị na elele ogwe ndị ọkachamara rụrịta ụka maka ojiji Bob Woodward nke isi “okirikiri miri emi” maka akwụkwọ ya “Fear,” uwe ahụ bọmba akpụkpụ ostrich nke Paul Manafort bụ $15,000 (“uwe juputara na hubris,” The Washington Post kwuru) yana ndapụta nke nkọwapụta Stormy Daniels maka anụahụ Maazị Trump jọrọ njọ. +M, agaghị ele Super Mario anya otu m si ahụbu ya ọzọ. +“Akụkụ nke ihe ọ na eme nke na eme ka ọ dị ka ihe ngosi ntụrụndụ bụ na ọ na enye gị otu ihe kwa abalị,” Brent Montgomery kwuru, onye isi oche nke Wheelhouse Entertainment yana onye mmepụta nke “Pawn Stars”, maka ihe ngosi nke Trump na agbanwe ndị nka yana ntụgharị akụkọ kwa ụbọchị (iluso N.F.L. ọgụ, ito Kim Jong-un). +Ị kwesịrị ịghara otu nsotanso ma ọ bụ aghara gị. +Mgbe m nwetara Maazị Fleiss n’izu a, anyanwụ nọ na acha digri 80 na ilo be ya dị n’akụkụ osimiri nke ugwu nke Kauai, mana ọ n’ime ụlọ na elele MSNBC ebe ọ na edekọ CNN. +Ọ nwenwughi ike ịdọpụ onwe ya, ọbụghị ka Brett Kavanaugh chọrọ izute Ọgbakọ Ndị Ikpe nke Nzụkọ Ọmeiwu yana ọdịnihu nke Ụlọ Ikpe Kachasị kodoro n’ikuku. +“M chetara mgbe anyị na eme ihe ngosi nzuzu ndị ahụ niile n’oge ochie, ndị mmadụ kwuru, “Nke a bụ mbido nke njedebe mmepe ndị ọdịda anyanwụ,”” Maazị Fleiss gwara m. +“M chere na ọ bụ njakịrị, mana ọ pụtara na ha ziri ezi.” +Amy Chozick, ọdee akwụkwọ maka The Times na ekpuchi azụmahịa, ndọrọndọrọ na mgbasa ozi, bụ ọdee akwụkwọ nke ihe ncheta “Chasing Hillary.” +Ewepuga nsọbanye ego n’agbamọsọ nhọpụta etiti afọ kachasị sie ike maka House +Ọ bụghị ihe ntụnanya na Pennsylvannia nke 17th na ahụ nsọbanye ego, ekele dịịrị nhazigharị nke ogige ndị kọngress nwetara mmadụ abụọ nọ n’ọchịchị ka ha banye n’ọsọ maka otu oche ahụ. +Ogige ime obodo Pittsburg esegharịrị nso nso a dowere Rep. Demokrats Conor Lamb - onye meriri oche ya n’ogige ọzọ na nhọpụta pụrụ iche emere na spring gara aga. +Lamb na azọcha ya onye ọzọ nọkwa n’ọchịchị, Repọblikan Keith Rothfus, onye nke na anọchite ogige Pennsylvania 12th ugbu a, nke na amachi nnukwu n’elu 17th ọhụrụ. +Esegharịrị maapụ ndị ahụ ka Ụlọ Ikpe Kachasị nke Pennsylvania mara ikpe na Jenụwarị na ekewapụrụ ogige ndị ochie ahụ n’ụzọ gabigara iwu obodo iji menyere ndị Repoblikan. +Agbamọsọ ahụ dị na 17th ọhụrụ ebidola nsọbanye ego mgbasa ozi n’etiti ndi nkwado ego ndọrọndọrọ ndi kachasi, nke Democratic Campaign Congressional Committee (DCCC) yana National Republican Campaign Committee (NRCC). +Lamb bụrụ aha ama ama na Pennsylvania ka ọ nwechara ntakịrị mmeri na nhọpụta pụrụ iche emere na Machị nke ọtụtụ ndị mmadụ lelere maka Ogige Kọngress Pennsylvania nke 18th. +Onye Repọblikan ji oche ahụ kemgbe afọ iri, Onye Isi Ala Donald Trump ji akara 20 wee merie ogige ahụ. +Ndị ọkachamara ndọrọndọrọ enyela ndị Demọkrats obere nzọụkwụ n’ihu. +U.S. Echere Ịnye El Salvador Ntaramahụhụ Maka Ịkwado China, Wee Kwụsị +Ndị nnọchite anya rịbara ama na Dominican Republic na Panama akwadola Beijing, enwere obere mgbochi si na Washington. +Maazị Trump nwere nzụkọ dị mma n’etiti Onye Isi Ala Juan Carlos Varela nke Panama na Juun 2017 ma banye n’ụlọ nkwari akụ na Panama ruo mgbe ndị mmekọ chụpụrụ otu njikwa nke Ọgbakọ Trump. +Ndị ụlọ ọrụ Ngalaba Steeti kpebiri ịkpọghachite ndị isi njem nnọchite anya ndị America si El Salvador, Dominican Republic na Panama maka “mkpebi nso nso iji kwụsị ịkwado Taiwan,” Heather Nauert, onye okwu okwu nke ngalaba ahụ, kwuru na nkwupute na mbido ọnwa a. +Mana atụlere ntaramahụhụ naanị maka El Salvador, nke nwetara ihe rutere ọnụọgụ nde $140 n’enyemaka si n’aka America na 2017, gụnyere njikwa ọgwụ ike, nkwado ntolite na akụnụba. +Ntaramahụhụ ndị ahụ atụnyere, nke gụnyere mgbubi n’enyemaka ego yana mmachi visa ndị a ga-ezube iche, kwesịrị ịbụ ihe nhịahụ maka obodo Central America ahụ yana ogo enweghị ọrụ na igbu mmadụ ya. +Ka nzụkọ ime ụlọ gara n’ihu, ndị ọrụ North America na Central America bugharịrị ọgbakọ ogo-dị-elu gbadoro anya na nchedo na ntolite akụnụba iji sochie otu mgbakọta ụdịrị ahụ n’afọ gara aga nke ahụrụ ka nzọụkwụ n’ọganihu na mbọ iji gbochie ndị mgbabata n’obodo na ịga na United States. +Mana tupu etiti-Septemba, ndị ọrụ nchịkwa dị elu mere ka o doo anya na ha chọrọ ka nzụkọ ahụ gaa n’ihu, na akwụsị ntụle ọ bụla maka ntaramahụhụ maka El Salvador ozugbo. +Atọrọ ka Osote Onye Isi Ala Mike Pence zute ọgbakọ ahụ, nke atọrọ ugbu a na etiti-Ọktoba, na mgbama nke mkpa nke nchịkwa ahụ dowere na nzụkọ ndị ahụ, ndị nnọchite anya ahụ kwuru. +Ndị ozi America atọ ahụ jiri nwayọ laghachi El Salvador, Panama na Dominican Republic na enweghị ozi ike ma ọ bụ ntaramahụhụ ọhụrụ si na Washington. +Onye nkwuchite White House maka Maazị Bolton jụrụ ikwu okwu na nkọwapụta nke nrụrịta ụka ahụ nke ndị ọrụ America atọ ahụ kọwara, gụnyere ndị nnọchite anya abụọ, ndị kwenyere ịkparịta arụmarụ ndị ime ụlọ ahụ n’ọnọdụ nke nzuzo. +Onye nyocha mpụga kwadoro akụkọ ha, onye nọ nso na nchịkwa ahụ ma kwukwaa okwu n’ọnọdụ nke nzuzo. +Ndekọ Mmụta +Akpụkpụ ụkwụ na esote a ga-edowe nwere ike ịbụ mkpesa nke kansụl pụrụ iche nke Robert Mueller maka ọmụme ndachi nke akwụmọtọ n’aka Maazị Trump, nke enwere ihe akaebe doro anya dị na ndekọ ọhaneze. +Ekpesara na Maazị Mueller na atụgharịkwa ka nyocha ya bụrụ ma ndị mgbasa ozi Maazị Trump na Russia ejikọrọ aka na mbuso agha ya na ntuli aka anyị. +Kọngress ahụ ekwesịrị ịgbanwe aka, Maazị Trump ga-ahụ onwe ya na eche ajụjụ na nke ahụ, ka ọ na akwadobe ịga ọzọ n’ihu ndị ntuli aka, ma ikekwe emechaa n’ihu ndị ọkaikpe nke ndị ọgbọ ya. +Nke ahụ bụ ọtụtụ enwee ike, ọ bụghị na m chọrọ ịtụnye na ọdịda Maazị Trump ga-abịarịrị - ma ọ bụ nke ndị otu ya na Europe. +Enwere mkpebi anyị niile ga-eme n’akụkụ abụọ nke Atlantik ga-emetụta ogologo oge ole mgba ahụ ga-abụ. +Na 1938, ndị ọrụ Germany dị njikere ịnapụ ọchịchị n’aka Hitler, ọ bụrụ na Ọdịda Anyanwụ gbochiri ya ma kwadobe ndị Czechoslovaks na Munich. +Anyị dara, ma ghara ohere iji zere afọ nke nnukwu mbibi merenụ. +Usoro nke akụkọ ala na agbagharị n’ụdịrị isi mgbanwe ahụ, ọgụga ọchịchị onye kwuo uche ya na anaghị akwụsị akwụsị ga-aga n’ihu ma ọ bụ gbutu oge. +Ndị America na eche ọtụtụ isi mgbanwe ugbu a. +Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na Maazị Trump chụọ Osote Ọkaiwu Obodo General Rod Rosenstein, nwoke na ejikwa akaraka nke nyocha Maazị Mueller? +Rosenstein anọrọla na nnukwu nsogbu kemgbe akwụkwọ a kpesara nke ahụ, afọ gara aga, ọ tụnyere ịdekọ onye isi ala na nzuzo ma boo ebubo na ọ dịghị mma maka ụlọ ọrụ. +Maazị Rosentein kwuru akụkọ nke The Times ezighi ezi. +“Kedu otu anyị ga-esi zaghachi ma ọ bụrụ na nnyocha F.B.I ọhụrụ arịrịọ maka Brett Kavanaugh emeghị n’uju ma ọ bụ dị mma - ma ọ bụ ọ bụrụ na etinye ya na Ụlọ Ikpe Kachasị agbanyeghị ebubo nke nwakpo nwanyị doro anya yana ihe akaebe na ezighi ezi? +N’isi ihe niile, anyị ga-eme ntuli aka n’etiti afọ maka Kọngress nke ga-ejide Maazị Trump n’ọrụ? +Ọ bụrụ na anyị daa nnwale ndị ahụ, ọchịchị onye kwuo uche ya ga-akwadobe maka oge njụmoyi toro ogologo. +Mana ekwenyere m na anyị agaghị ada, n’ihi ihe ndị mụtara na Prague. +Nne m bụ onye Czechslovak Jew onye nke achụpụrụ na Auschwitz n’otu aka ndị ọchịchị Nazi ahụ nọchiri ụlọ ebe nnọchite m. +Ọ dị ndụ, gbabata na America ma, ka afọ 60 gachara, zipuru m gaa kandụl Sabbath ọkụ n’elu tebul ahụ bụ swastika. +Ka nke ahụ bụ ọdịbendị m, kedu otu m ga-esi nwee ezigbo olile anya maka ọdịnihu anyị?” +Norman Eisen, otu okenye na Ewumewu Brookings, bụ onye isi oche nke Ndị Amaala maka Ọrụ na Omume na Washington yana ọdee akwụkwọ nke “The Last Palace: Narị Afọ Ọgbaghara nke Europe na Five Lives and One Legendary House.” +Graham Dorrans nke Rangers nwere ezigbo olile anya maka asọmpi Rapid Vienna +Ndị Rangers na anabata Rapid Vienna na Tọsde, mara na mmeri n’elu ndị Austria ahụ, sotere egwu onye laba onye laba mara mma agbara na Spain n’etiti Villareal na mbido ọnwa a, ga-etinye ha n’ọnọdụ siri ike iji tozue pụta na Otu G nke Europa League. +Ahụ mmerụ n’ikpere gbochiri onye etiti Graham Dorrans n’ime mpụta izizi nke afọ asọmpi ahụ ruo mgbe egwuregwu 2-2 dị n’etiti Villareal mana ọ kwenyere Rangers nwere ike iji nsonaazụ ahụ dị ka nzọụkwụ iji mee ihe ndị dị egwu. +“Ọ bụ ezigbo akara maka anyị n’ihi Villareal bụ ezigbo akụkụ,” nke onye afọ 31 ahụ kwuru. +“Anyị banyere egwuregwu ahụ kwete na anyị nwere ike ịnwete ihe ma jiri otu akara wee pụta. +Ikekwe anyị kwesịrị ịnweta mmeri na ngwụcha mana, na nchịkọta, onye laba onye laba bụkwa nsonaazụ dị mma. +Ọ dị ka ha aka mma n’ọkara nke izizi, ma anyị pụtara n’ọkara nke abụọ ma bụrụ akụkụ ka mma. +Ịbanye Tọsde, ọ bụ nnukwu abal�� Europe ọzọ. +N’olile anya, anyị nwere ike ịnweta akara atọ mana ọ ga-esi ike n’ihi ha nwetara nsonaazụ mara mma n’egwuregwu ikpeazụ ha mana, ndị igwe mmadụ nọnyere anyị, adị m njikere na anyị nwere ike ịga n’ihu ma nweta nsonaazụ mara mma. +Afọ ikpeazụ siri nnukwu ike, n’ime ihe niile mere ma ahụ mmerụ m yana mgbanwe n’otu asọmpi ahụ n’onwe ya mana enwere ezi mmụọ gbasara ebe ahụ ugbu a. +Otu egwuregwu ahụ dị mma, ndị otu m nwoke na enwe ọhụụ ya; ọzụzụ dị mma. +N’olile anya, anyị nwere ike ịkwara gaba n’ihu ugbu a, tinye afọ asọmpi gara n’azụ anyị ma mee nke ọma.” +Ụmụ nwanyị na agbakasị ahụ n’ihi ụjọ ego nchekwa oge ezumike nka +Agbanyeghị n’eziokwu ndị sonyere na nyocha ahụ nwere alo doro anya otu ha siri chọọ ka elekọta ha, ndị mmadụ ole ma ole nọ na agwa ndị otu ezinụlọ okwu maka ya. +Ihe dị ka okara nke ndị mmadụ ahụ na mmụta Nationwide emere kwuru na ha na agwa di ma ọ bụ nwunye ha okwu gbasara ụgwọ nke nlekọta ogologo oge. +Naanị pasentị 10 kwuru na ha gwara ụmụaka ha maka ya. +“Ndị mmadụ chọrọ ka onye otu ezinụlọ ha lekọta ha, mana ha anaghị eme ihe ọ bụla iji kpaa nkata ahụ,” Holly Snyder kwuru, osote onye isi nke azụmahịa nchekwa ndụ nke Nationwide. +Nke a bụ ebe ị ga-ebido. +Gwa nwunye ma ọ bụ dị gị yana ụmụaka: Ị nweghị ike ịkwadobe ezinụlọ gị iji nye nlekọta ma ọ bụrụ na i kwuputeghi ihe ndị ị chọrọ n’oge. +Gị na onye ndụmọdụ gị na ezinụlọ gị rụkọta ọrụ iji kpakọrịta ebe yana otu a ga-esi nweta nlekọta, ebe nhọrọ ndị ahụ nwere ike ịbụ ihe ndị dị mkpa na ikpebi ụgwọ ya. +Webata onye ndụmọdụ ego gị: Onye ndụmọdụ nwekwara ike ịnyere gị aka ịtụnye ụzọ iji kwụọ ụgwọ maka mmefu ego ndị ahụ. +Nhọrọ ego gị maka nlekọta ogologo oge nwere ike ịgụnye iwu nchekwa nlekọta ogologo oge dị adị, iwu nchekwa ndụ uru-ego achịkọtara ọnụ iji nyere gị aka kpuchie mmefu ego ndị a ma ọ bụ nchekwa-onwe site na iji akụ nke gị - ma ị nwee ego ahụ. +Kpaa maka akwụkwọ iwu gị: Kpebie nsogbu iwu n’ohere ahụ. +Dowe ihe nnọchite nlekọta-ahụike na njikere ka ị nwee ike ịkenye ya mmadụ atụkwasịrị obi iji hụ maka nlekọta ahụike gị ma gbaa mbọ hụ ndị ọkachamara mezuru na mmasị gị ma ọ bụrụ na ị nweghị ike ikwukọrịta okwu. +Ọzọkwa, tụlee ikike nke ọkaiwu maka ego gị. +Ị ga-ahọpụta otu onye atụkwasịrị obi iji meere gị mkpebi ego ma hụ na akwụrụ ụgwọ gị ma ọ bụrụ na ị nweghị ike. +Echefuna obere ihe: Chee echiche na nne na nna gị kara nka nwere ihe mberede ahụike ma nọrọ n’ụzọ na aga n’ụlọ ọgwụ. +Ị ga-enwe ike ịza ajụjụ maka ọgwụ na ihe ndị ha na ezere? +Kwupute nkọwapụta ndị a n’atụmatụ edere ede ka ị nwee dị njikere. +“Ọ bụghị naanị ego ka a na ekwu maka ya, mana kedu ndị bụ dọkịnta ya?” Martin jụrụ. +“Gịnị hụ ọgwụ ndị ahụ? +Onye ga-elekọta nkịta? +Hazie atụmatụ ahụ." +Eji egbe ikuku gbaa otu nwoke ọtụtụ oge na llfracombe +Ejirila egbe ikuku wee gbaa otu nwoke ọtụtụ oge ka o ji ụkwụ alaghachi ụlọ ka ọ pụchara n’abalị. +Onye ọ metụtara, nọ n’afọ 40, nọ n’ogige Oxford Grove nke llfracombe, Devon, mgbe agbara ya egbe n’obi, afọ yana aka. +Ndị uwe ojii kọwara ọgbụgba egbe ahụ, nke mere n’ihe dị ka 02:30 BST, ka “omume na enweghị kpatara ya.” +Onye ihe ahụ metụtara ahụghị onye makporo ya. +Ahụ mmerụ ya abụghị ihe ga-egbu ya, ndị uwe ojii arịọla maka ndị akaebe. +Ala ọmajiji na tsunami na Indonesia +Opekata mpe ndị mmadụ 384 nwụrụ ka nnukwu ala ọmajiji na tsunami dara n’obodo Palu nke Indonesia na Fraịde, ndị ọrụ kwuru, atụrụ anya na ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ ga-agbakọ. +Ka akụpụrụ ụzọ nkwukọrịta, ndị ọrụ enyemaka enwebeghị ike ịnweta ozi ọ bụla n’aka ala ọchịchị Donggala, mpaghara ugwu nke Palu nọketere nso na etiti nke ala ọmajiji 7.5 ahụ. +Na Palu, karịa ndị mmadụ 16,000 kwapụrụ n’ụlọ ka ọdachi ahụ mere. +Ndị a bụ ụfọdụ eziokwu gbasara Palu na Donggala, n’agwaetiti nke Sulawesi: +Palụ bụ isi ala nke ogige Central Sulawesi, dị na ngwụcha nke warawara ọnụ mmiri dị na akụkụ mmiri ọdịda anyanwụ agwaetiti Sulawesi, nwere ọnụọgụgụ ndị mmadụ 379,800 na 2017. +Obodo ahụ nọ na eme emume ncheta 40 ya mgbe ala ọmajiji na tsunami ahụ dara. +Donggala bụ ala ọchịchị dọtịrị n’ogologo 300 km (maịlụ 180) nke akụkụ osimiri dị na ọdịda anyanwụ na ugwu nke agwaetiti Sulawesi. +Ala ọchịchị ahụ, mpaghara nchịkwa dị n’okpuru ogige, nwere ọnụọgụgụ ndị mmadụ ekpebiri na 299,200 na 2017. +Ịkọ azụ na ịkọ ugbo bụ isi ọrụ nke akụnụba ogige Central Sulawesi, karịchara mpaghara akụkụ mmiri nke Donggala. +Ngwụpụta nickel bụkwa mkpa n’ogige ahụ, mana agbakojuru karịa na Morowali, na nchebe ihu nke Sulawesi. +Tsunami adaala na Palu na Dongalla ọtụtụ oge n’afọ 100 gara aga, nke Ụlọ Ọrụ Mgbochi Ọdachi nke Indonedia kwuru. +Na 1938, tsunami gburu karịa ndị mmadụ 200 ma mebie narị kwụrụ narị ụlọ na Donggala. +Otu tsunami dakwara n’akụkụ ọdịda anyanwụ Donggala na 1996, na egbu itoolu. +Indonesia tukwu n’etiti Pacific Ring of Fire, ala ọmajiji na akụ ya kwa oge. +Ndị bụ ụfọdụ nnukwu ala ọmajiji na tsunami n’afọ nso nso: +2004: Nnukwu ala ọmajiji n’akụkụ osimiri ọdịda anyanwụ nke ogige Aceh Indonesia dị n’akụkụ ugwu Sumatra na Dis. 26 kpalitere tsunami kụrụ obodo 14, na egbu ndị mmadụ 226,000 n’ogologo akụkụ osimiri nke Nnukwu Osimiri India, karịa ọkara ha nọ na Aceh. +2005: Nsotanso nnukwu ala ọmajiji kụrụ akụkụ osimiri ọdịda anyanwụ nke Sumatra na ngwụcha Machị yana na mbido Eprel. +Narị kwụrụ narị nwụrụ na Agwaetiti Nias, na mpụga akụkụ osimiri nke Sumatra. +2006: Ọmajiji 6.8 kụrụ akụkụ ndịda nke Java, agwaetiti nke Indonesia kachasị nwee mmadụ, na akpalite tsunami jiri iwe daa na akụkụ osimiri nke ndịda, na egbu ihe ruru ndị mmadụ 700. +2009: Ala ọmajiji ruru 7.6 dara n’akụkụ obodo Padang, isi ala nke ogige West Sumatra. +Egburu ihe karịrị ndị mmadụ 1,100. +2010: Ọmajiji 7.5 dara n’otu agwaetiti Mentawai, na mpụga Sumatra, na akpalite tsunami ruru mita 10 nke mebiri ọtụtụ ime obodo ma gbuo ndị mmadụ ruru 300. +2016: Obere ọmajiji kụrụ ala ọchịchị Pidie Jaya dị na Aceh, na ebute mmebi na ọgbaghara na echetere ndị mmadụ mmebi nke ọmajiji na tsunami 2004 gburu ọtụtụ. +Enweghị tsunami akpalitere n’oge a, mana ụlọ ndị na ada gburu karịa ndị mmadụ 100. +2018: Nnukwu ọla ọmajiji dara n’agwaetiti ndị njem nke Lombok dị na Indonesia, na egbu karịa ndị mmadụ 500, karịchara n’akụkụ ugwu nke agwaetiti ahụ. +Ọmajiji ahụ mebiri puku kwụrụ puku ụlọ ma hapụ ụfọdụ ndị njem na nsogbu ntakịrị oge. +Ejidere Nwa Nwoke Sarah Palin Tọchara N’ihi Ebubo Ịmekwasị Mmadụ Ihe Ike +Track Palin, nwa nwoke tọchara nke gọvanọ Alaska gara aga yana osote onye nhọpụta isi ala Sarah Palin, ka ejidere maka ebubo ịmekwasị mmadụ ihe ike. +Ejidere Palin, 29, nke Wasilla, Alaska, na nyocha nke ịmekwasị mmadụ ihe ike, na etinye aka na mkpesa nke mmekwasị ihe ike yana igbochi njide, site na mkpesa Alaska State Troopers buputere na Satọde. +Site na mkpesa ndị uwe ojii ahụ, mgbe otu enyi nwanyị nwara ịkpọ ndị uwe ojii iji kpesa mpụ eboro na ebubo, ọ were ekwentị ya n’aka ya. +Ejidere Palin na Ewumewu Tupu-Ikpe Mat-Su, ejidere ya na bọnd na enweghị nchekwa $500, nke kTUU kpesara. +Ọ pụtara n’ụlọ ikpe na Satọde, ebe ọ kọwara onwe ya “ka ọ onye aka dị ọcha, n’ezie” mgbe ajụrụ ya arịrịọ ya, netwọk ahụ kpesara. +Palin na eche mpụ Klaasị A ato, ọ pụtara enwere ike ịtụ ya nga ruo otu afọ ma ọ bụ daa ya nra $250,000. +Eboola ya ebubo nke mpụ Klaasị B, enwere ike iji otu ụbọchị n’ime nga ma ọ bụ nra $2,000 wee nye ntaramahụhụ ya. +Ọ bụghị ebubo mpụ nke izizi a na etinye maka Palin. +Na Disemba 2017, eboro ya ebubo nke ịmekwasị nna ya ihe ike, Todd Palin. +Nne ya, Sarah Palin, kpọrọ ndị uwe ojii iji kpesa mbuso agha ahụ eboro n’ebubo. +Okwu ahụ nọ n’ihu Ụlọ Ikpe nke Ndị Agha Ochie nke Alaska. +Na Jenụwarị 2016 agbara ya akwụkwọ maka ịmekwasị mmadụ ihe ike, itinye aka na mpụ ịmekwasị mmadụ ihe ihe, yana iji ngwaọgụ ka mmanya na egbu ya na njikọ nke okwu ahụ. +Enyi ya nwanyị boro ya ebubo na ọ kụrụ ya ọkpọ n’ihu. +Ndị agha ochie kọtọrọ Sarah Palin na 2016 ka ejikọchara omume ihe ike nwa ya na PTSD bidoro n’ọrụ ya na Iraq. +Tsunami ala ọmajiji Indonesia: egburu narị +Opekata mpe ndị mmadụ 384 anwụọla ka ala ọmajiji dara na agwaetiti nke Sulawesi nke Indonesia na Fraịde. +Ala ọmajiji ruru ike 7.5 kpalitere tsunami ma mebie puku kwụrụ puku n’ụlọ. +Netwọk latrik na nkwukọrịta mebiri emebi, ebe atụrụ anya na ndị nwụrụ anwụ ga-agbago n’ụbọchị ndị na-abịa. +Ala ọmajiji ahụ dara na obere mpụga etiti Sulawesi nke bụ akụkụ ọwụwa anyanwụ na ugwu nke isi ala Indonesia, Jakarta. +Vidio ndị na agagharị n’ebe mmerịkọta ọhaneze gosiri oge ọ dara. +Ọnụọgụ narị ndị mmadụ kpokọtara maka emume akụkụ osimiri n’obodo nke Palu mgbe tsunami ji iwe daa n’akụkụ mmiri ahu. +Ndị ọkaikpe etiti obodo na achụ ntaramahụhụ ọnwụ maka onye a na enyo enyo maka agha ụjọ mere na NYC +Ndị ọkaikpe nọ na New York na achọ ntaramahụhụ ọnwụ maka Sayfullo Saipov, onye a na enyo enyo na agha ụjọ mere na New York nke gburu ndị mmadụ asatọ -- ntaramahụhụ na adịkabeghị nke emebeghị na steeti ahụ maka mpụ etiti obodo ọ bụla kemgbe 1953. +Saipov, 30, eboro ya ebubo ji gwongworo mgbaziri Home Depot wee mee ihe egwu ahụ n’ụzọ anyịnya igwe dị n’ogologo West Highway dị na Lower Manhattan, na ebetu ndị ji ụkwụ aga yana ndị na akwọ anyịnya igwe n’ụzọ ya na Ọkt. +Iji gosi ihe kpatara ntaramahụhụ ọnwụ ji dị mma, ndị ọkaikpe ga-egosi na Saipov “kpachara anya” gbuo ndị mmadụ asatọ ma “kpachara anya” merụọ ndị mmadụ nnukwu ahụ, site n’ọkwa nke ebumnuche iji chọọ ntaramahụhụ ọnwụ, nke Southern District nke New York gbara n’akwụkwọ. +Ebubo abụọ ndị a nwere ike ibu ntaramahụhụ ọnwụ, site n’aka akwụkwọ ụlọ ikpe ahụ. +Izu sotechara mbuso agha ahụ, ndị otu ikpe etiti obodo manyere Saipov ebubo ngụ-22 nke gụnyere ebubo asatọ maka igbu mmadụ n’enyemaka nke izu oyi, nke ndị ọkaikpe etiti obodo na ejikarị n’okwu ajọ mpu, yana ebubo nke ihe ike na mmebi nke ụgbọ ala. +Mbuso agha ahụ chọrọ “nhazi na ntụle echiche dị ọkpụrụkpụ,” ndị ọkaikpe kwuru, na akọwara omume nke Saipov jiri mee ya ka “arụ, jọrọ njọ na mmetọ.” +"Sayfullo Habibullaevic Saipov butere mmerụ ahụ, mmekpa ahụ, na mbibi maka ezinụlọ na ndị enyi nke Diego Enrique Angelini, Nicholas Cleves, Ann-Laure Decadt, Darren Drake, Ariel Erlij, Hernan Ferruchi, Hernan Diego Mendoza, na Alejandro Damian Pagnucco," ọkwa nke ebumnuche kwuru. +Mmadụ ise nke ndị ahụ emetụtara bụ ndị njem si Argentina bịara ịlegharị anya. +Ọ bụrụla otu afọ iri kemgbe Southern District nke New York kpere ikpe okwu ntaramahụhụ ọnwụ. +Onye ahụ eboro ebubo, Khalid Barnes, nwetara amamikpe nke igbu mmadu abụọ na ere ọgwụ ike mana emechara tụọ ya nga ndụ ya niile n’ikpeazụ na Septamba 2009. +Oge ikpeazụ emere ntaramahụhụ ọnwụ na okwu etiti obodo nke New York bụ na 1953 maka Julius na Ethel Rosenberg, di na nwunye egburu ka amachara ha ikpe maka ịkpa nkata iji mee ọrụ sabo maka Soviet Union n’oge Cold War afọ abụọ ya gara aga. +Eji oche latrik wee gbuo Rosenberg abụọ ahụ na Juun 19, 1953. +Saipov, onye amaala nke Uzbekistan, gosiri enweghị obi mmadụ n’ụbọchị na ọnwa sotere mbuso agha ahụ, nke akwụkwọ ụlọ ikpe gosipụtara. +Ọ gwara ndị nyocha na ihe ọ mere dị ya mma, ndị uwe ojii kwuru. +Saipov gwara ndị ikikere na ihe kpalitere ya ịme mbuso agha ahụ bụ ka ọ lelechara vidio ndị ISIS n’ekwentị ya, nke ebubo ahụ gosiri. +Ọ rịọkwara ka o gosipụta ọkọlọtọ ISIS n’ime ụlọ ọgwụ ya, ndị uwe ojii kwuru. +Ọ rịọla na aka ya dị ọcha n’ebubo ngụ-22 ahụ. +David Patton, otu n’ime ndị mgbachite etiti obodo maka ọhaneze na anọchite Saipov, kwuru ha nwere “nnukwu mwute” maka mkpebi nke ikpe ahụ. +“Anyị chere na mkpebi iji chọọ ntaramahụhụ ọnwụ kama ịnara arịrịọ ikpe ọmụma maka ndụ niile n’ime nga na enweghị ohere nke nhapụ naanị ga-adọtịkwu ụjọ nke mmemme ndị ahụ maka mmadụ niile emetụtara,” Patton kwuru. +Otu mgbachite nke Saipov arịọbuola ndị ọkaikpe ka ha hapụ ịchọ ntaramahụhụ ọnwụ. +MP Tory kwuru na ekwesịrị itinye NIGEL FARAGE n’isi nke ụbụbọ Brexit +Nigel Farage kwere nkwa “izukọta ndị agha nke igwe mmadụ’ taa n’oge ngagharị iwe n’ọgbakọ Tory. +Onye ndu Ukip gara aga kwuru na ndị ndọrọndọrọ kwesịrị ‘ịnweta okpomọkụ’ sitere n’aka ndị Eurosceptics - ebe otu n’ime ndị MP nke Theresa May tụnyere na ọ kwesịrị ị nọ n’isi nke ụbụbọ ahụ dị n’etiti EU. +Onye oche azụ Conservative Peter Bone gwara igwe mmadụ nọ na Birmingham na UK “ga-apụgo’ ma ọ bụrụ na Maazị Farage bụ Ọde Akwụkwọ Brexit. +Mana mgba Nwada May na eche bụ na ijikọtagharị ndị otu ya kewagoro ukwuu bụ ihe pụtara ihie ka ndị na akwado Ịnọrọ Na Tory sonyere ngagharị iwe dị iche na egbochi Brexit n’obodo ahụ. +Onye isi ahụ na enwe nhịahụ idowe atụmatụ nkwekọrịta Chequers ya n’usoro n’etiti mbuso agha sitere n’aka Brexiteers, Remainers na EU. +Ndị njikọ siri ọnwụ na ọ ga-aga n’ihu ịnwa ịnweta nkwekọrịta yana Brussels na agbanyeghị nkwutọ ahụ - ma manye Eurosceptics na Labour ịhọrọ n’ime ngwungwu ya na ‘ọgbaghara’. +Maazị Bone gwara otu mgbakọ Leave Means Leave na Solihull na ọ chọrọ ‘itufu Chequers’. +Ọ tụnyere na ekwesịrị ịme Maazị Farage onye otu ma nye ya ọrụ maka ụbụbọ dị n’etiti Brussels. +‘Ọ bụrụ na ọ nọ n’isi, anyị kwesịrị ịpụgo ugbu a,’ o kwuru. +MP Wellingborough ahụ tinyere: ‘M ga-akwụrụ ọtọ maka Brexit mana anyị kwesịrị itufu Chequers.’ +Na ekwupute nkwugide ya maka EU, o kwuru: “Anyị alụghị ọgụ ụwa iji bụrụ ndị nrube isi. +Anyị chọrọ ịme iwu nke anyị n’obodo anyị.’ +Maazị Boone tufuru ntụnye na echiche ọhaneze agbanweela kemgbe ntuli aka 2016: ‘Alo na ndị Britain agbanweela uche ha ma chọọ ịnọrọ abụghị eziokwu ma ncha.’ +Onye nkwado Brexit nke Tory Andrea Jenkyns nọkwa na mgbakọ ahụ, na agwa ndị nta akụkọ: ‘Naanị ihe m na ekwu: Praịm Minista, gee ndị mmadụ ntị. +‘Ọtụtụ ndị ọhaneze amasịghị Chequers, Ndị Nkwugide agaghị atuli aka maka ya, ndị otu ndọrọndọrọ na ndị mmume anyị amasịghi ya, ndị nke na agagharị n’okporo ụzọ wee hụ na ahọpụtara anyị. +Biko hapụ Chequers ma bido ịge ntị.’ +N’ozi atụrụ Nwada May, o kwuru: ‘Ndị praịm minista na edowe ọrụ ha mgbe ha dowere nkwa ha.’ +Maazị Farage gwara ndị mgbakọ ahụ na ndị ndọrọndọrọ kwesịrị “ịnweta okpomọkụ ahụ’ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịgbarapụ mkpebi emere na nhọpụta 2016. +‘Nke a ugbu a bụ okwu nke ntụkwasị obi n’etiti anyị - ndị mmadụ - yana otu ndị ndọrọndọrọ anyị,’ o kwuru. +‘Ha na anwa ịgbarapụ Brexit mana anyị nọ ebe a taa iji gwa ha ‘anyị agaghị ahapụ unu ma unu mee nke ahụ’.’ +N’ozi maka igwe mmadụ mmụọ ha gbalitegoro o tinyere: ‘Achọrọ ka unu mee otu ndị ndọrọndọrọ anyị, ndị nọ n’isi nke ịgbarapụ Brexit, ka ha hụta okpomọkụ ahụ. +‘Anyị na ezukọta ndị agha igwe mmadụ nke obodo a nyere anyị mmeri na Brexit, anyị agaghị ezu ike ruo mgbe anyị bụrụkwara United Kingdom nke nnwere onwe, na achịkwa onwe ya, nwere ugwu.’ +Otu aka ọzọ, ndị Remainers gara site na Birmingham tupu ha emee mgbakọ nọrọ aka elekere-abụọ n’ama obodo ahụ. +Obere mgbakọ nke ndị mmume fere ọkọlọtọ Tory Yana Brexit ka ebidochara otu ahụ n’izu ụka a. +Onye otu Labour Lord Adonis kọtọrọ Conservatives maka nsogbu nchedo ha tara ahụhụ ya site na iji ngwa otu ndọrọndọrọ ka ọgbakọ ahụ mepere. +‘Enwere ndị mmadụ ndị na agwa anyị na ha nwere sistemụ IT dị njikere yana teknụzụ niile maka Canada gbakwunyere gbakwunyere, maka oke ala na enweghị nsogbu, maka azụmahịa efu na enweghị oke ala na Ireland,’ o tinyere. +‘Ọ bụ nnukwu asị. +Ọ nweghị ihe dị ka ezigbo Brexit,’ o tinyere. +Warren na akwado ‘ịlenyesị anya ike’ maka ịpụta maka onye isi ala +U.S. Onye Ọmeiwu Elizabeth Warren kwuru na ọ “ga-elenyesị anya ike maka ịpụta maka onye isi ala” ka ntuli aka Nọvemba gachara. +Boston Globe kwuru na Demokrat nke Massachusetts ahụ kwuru maka ọdịnihu ya n’oge ime ụlọ nzụkọ n’ọdịda anyanwụ Massachusetts na Satọde. +Warren, otu onye nkọtọ Onye Isi Ala Donald Trump, na apụta maka nhọpụtagharị na Nọvemba chere Rep. Geoff Diehl nke GOP steeti, onye bụ onye njikọ isi oche nke mgbasa ozi nke Trump na 2016 na Massachusetts. +Ọ nọrọla n’etiti asịlị na ọ nwere ịgbasa Trump mgba na 2020. +Mmemme ehihie Satọde na Holyoke bụ nzụkọ nke 36 n’etiti ndị obodo site na iji usoro ụlọ nzụkọ kemgbe Trump banyere n’oche. +Onye nọ ebe ahụ jụrụ ya ma ọ chọrọ ịpụta maka onye isi ala. +Warren zaghachiri ọ bụ oge “maka ụmụ nwanyị ịga na Washington iji dozie gọọmentị anyị mebiri emebi, ma nke ahụ gụnyere nwanyị ịnọ n’isi.” +Ejidela mmadụ na mgbagbụ Sims nke LSU +Ndị uwe ojii na Baton Rouge, La., kwuru na Satọde na ejidela otu onye a na enyo enyo na mgbagbu nke onye egwu basketbọọlụ LSU bụ Wayde Sims na Fraịde. +Ngalaba Ndị Uwe Ojii nke Baton Rouge kwuputere njide nke Dyteon Simpson, 20, na 11 ụtụtụ. Ọgbakọ akụkọ ET. +Ha buputere vidio nke egbe ọgbụgba ahụ na Fraịde, na arịọ enyemaka na ịchọpụta otu nwoke ahụrụ na nseta ahụ. +Agbara Sims, 20 egbe ma gbuo ya n’akụkụ ogige Mahadum Southern n’ụtụtụ Fraịde. +“Wayde Sims nwere ọnya mgbọ egbe n’isi, ọ nwụrụ n’ihi nke ahụ,” onye isi ndị uwe ojii Murphy J. Paul gwara ndị mgbasa ozi na Satọde, site na 247sports. +Wayde kwụpụtara ịgbachitere enyi ya mgbe Simpson gbara ya egbe. +Ajụrụ Simpson ajụjụ, ọ kwenyere na ọ n’ebe ahụ, jiri ngwa ọgụ, ma kwenye na ịgba Wayde Sims egbe. +Ejidere Simpson na enweghị nsogbu, dubaa ya n’ụlọ mkpọrọ na Ngalaba Ndị Uwe Ojii East Baton Rouge Parish. +Junịọ 6-ụkwụ-6 toro na Baton Rouge, Sims gwuru egwuregwu 32 nke o bidoro 10 n’afọ asọmpi gara aga ma nweta ọkara nkeji 17.4, akara 5.6 yana nkụghachi 2.9 kwa egwuregwu. +Grand Prix nke Russia: Lewis Hamilton eruwelaị n’iko mba ụwa ka ntimiwu otu nyefere ya mmeri n’elu Sebastian Vettel +O doro anya n’oge ahụ na Valtteri Bottas tozuru tupu Lewis Hamilton na Satọde nke otu ndị Mercedes tiri n’iwu nke ga-eme nnukwu mmetụta n’akụkụ ọsọ ahụ. +Na mbido, Bottas nwetara ezigbo mmalite, ntakịrị ihe ka ọ hapụ Hamilton na aja ka ọ na azọchite ọnọdụ ya na ntụgharị abụọ nke izizi ma kpọọ Vettel iji makpuo onye otu ya. +Vettel buru ụzọ banye na pit ma hapụ Hamilton ka ọ banye n’ụzọ mkpọchi na ngwụcha nke otu ahụ, ihe kwesịrị ịbụ ihe mkpebi. +Mercedes ahụ banyere na pit otu lapụ ka emechara ma pụta n’azụ Vettel, mana Hamilton gara n’ihu ka enwechara mmereme ụkwụ-na-ụkwụ nke mere na ọkwọ ụgbọ Ferrari ahụ n’ejighi obi ya hapụ ime ka o ghere oghe n’ihi egwu nke ịgbasi ike ka emechara mkpali-mkpị iji mee nzọchite n’akụkụ nke atọ. +Max Verstappen bidoro n’azụ nke usoro ahụ, ọ nọ na nke asaa na ngwụcha nke lapụ izizi na ụbọchị ọmụmụ 21 ya. +Ọ gara n’ihu nọrọ n’ihu ọtụtụ oge n’ọsọ ahụ ka o jidere taya ya iji chụba mmecha ọsọ ọsọ ma gafere Kimi Raikkonen na nke anọ. +Ọ mechara n’ikpeazụ bata na pit na lap nke 44 mana ọ nwenwughi ike iwelite ọsọ ya na lap asatọ fọdụrụ ka Raikkonen were onye nke anọ. +Ọ bụ ụbọchị siri ike n’ihi Valtteri rụrụ ọmarịcha ọrụ n’izu ụka ahụ niile ma bụrụ nwoke dị nwayọ dị ka esi gwa m. +Otu ahụ arụọla ọrụ pụrụ iche iji nwee nke izizi na nke abụọ,” Hamilton kwuru. +Nke Ahụ Bụ Asụsụ Ahụ Jọrọ Oke Njọ +Onye isi ala Donald Trump kọtọrọ Onye Ọmeiwu Dianne Feinstein na mgbakọ na Satọde maka nkwusi ike ya na ọ bụghị ya kpughepuru leta si n’aka Christine Blasey Ford na ebo Brett Kavanaugh onye ahọpụtara maka Ụlọ Ikpe Kachasị ebubo nke nwakpo nwanyị. +Ikwu okwu na mgbakọ emere na West Virginia, onye isi ala ekwughi ozugbo maka ihe akaebe nke Ford nyere n’ihu Ọgbakọ Ndị Ikpe nke Nzụkọ Ọmeiwu, kama na ekwu na ihe na eme na Nzụkọ Ọmeiwu gosiri na ndị mmadụ bụ ndị “obi akpọ na obi ọjọọ yana ndị aghụghọ.” +“Otu ihe nwere ike ịme yana ọmarịcha ihe na eme n’ụbọchị ole ma ole gara aga na Nzụkọ Omeiwu, mgbe ị hụrụ iwe ahụ, mgbe ị hụrụ ndị mmadụ iwe na ewe, nwere obi akpọ na bụrụ ndị aghụghọ,” o kwuru. +“Mgbe ị hụrụ mbupute na mkpughepu emechaa ha ekwuo “oh, emeghị m ya. +Emeghị m ya." +Cheta? +Dianne Feinstein, i kpughepuru? +Cheta azịza ya... i kpughepuru akwụkwọ ahụ - “oh, oh, gịnị? +Oh, mba. +Ekpughepughi m." +Ọ dị mma, chere otu oge. +Anyị ekpughepuru...Mba, anyị ekpughipughi,” o tinyere, na nghọrọ nke onye ọmeiwu ahụ. +Ezigara Feinstein leta kọwara ebubo nke Ford mere Kavanaugh na Julaị gara aga, ma ekpughepuru ya na mbido nke Septemba - mana Feinstein gọnarịrị na mkpughepu ahụ si n’ụlọ ọrụ ya. +“Ezoghi m ebubo Dk. Ford, ekpughepughi akụkọ ya,” Feinstein gwara ọgbakọ ahụ, The Hill kpesara. +“Ọ rịọrọ m ka m jidere ya na nzuzo, m dowere ya na nzuzo dị ka o si rịọ.” +Mana ngọnarị ya adịghị mma n’ebe onye isi ala nọ, onye kwuru okwu na n’abalị mgbakọ Satọde ahụ: “M ga-agwa gị ihe, nke a bụ asụsụ ahụ jọrọ oke njọ. +Ọ nwere ike ọ meghị ya, mana nke ahụ bụ asụsụ ahụ kachasị njọ m hụgoro.” +Ịga n’ihu na mgbachite nke onye nhọpụta Ụlọ Ikpe Kachasị, onye nke ụmụ nwanyị atọ bogoro ebubo nke nwakpo nwanyị, onye isi ala tụnyere na ndị Demokrat na eji ebubo ndị ahụ maka ihe mkpa nke ha. +“Ha kpebisiri ike iweghachi ike site n’ụzọ ọ bụla enwere ike. +Ị hụrụ obi akpọ ahụ, obi ọjọọ ahụ, ha achọghị ịma onye ha na emekpa ahụ, onye ha ga-ekwofere iji nweta ike na njikwa,” Mediaite kpesara na onye isi ala ahụ kwuru. +Elite League: Dundee Stars 5-3 Belfast Giants +Patrick Dwyer nyere goolu abụọ maka Giants n’egwu ha na Dundee +Dundee Stars kwụrụ ụgwọ maka ntufu Elite League nke Fraịde n’aka Belfast Giants site na imeri asọmpi nlaghachi 5-3 na Dundee na Satọde. +Giants nwetara ndu goolu abụọ n’oge site na goolu nke Patrick Dwyer na Francis Beauvillier. +Mike Sullivan na Jordan Cownie saghachiri iji tinye ndị ahụ n’ụlọ na nhakọ tupu Dwyer eweghachite ndu nke Giants. +Francois Bouchard saghachiri maka Dundee tupu goolu Lukas Lundvald Nielsen abụọ nwetara mmeri ha. +Ọ bụ ntufu nke Elite League atọ n’ime afọ asọmpi a maka ndị otu Adam Keefe ndị si n’azụ wee merie Dundee 2-1 na Belfast n’abalị Fraịde. +Ọ bụ nzụkọ nke anọ n’ime afọ asọmpi ahụ n’etiti akụkụ ndị ahụ, ebe Giants meriri asọmpi atọ gara aga. +Goolu mmepe Dwyer bịara na nkeji anọ na 3:35 site n’enyemaka Kendall McFaull, ebe David Rutherford wetere enyemaka ka Beauvillier dọtịrị ndu ahụ ka nkeji anọ gachara. +N’ihe bụ oge mmepe juputara na mmereme, Sullivan kpọghachitere ndị ahụ nọ n’ụlọ n’egwuregwu ahụ na 13:10 tupu Matt Marquardt bụrụ onye enyemaka maka nsaghachi nke Cownie na 15:16. +Dwyer hụrụ na ndị Giants were ndu ahụ banye n’ezumike izizi mgbe ọ nyere goolu nke abụọ ya n’abalị ahụ na ngwụcha nke oge izizi ahụ. +Akụkụ ahụ nọ n’ụlọ chịkọtagharịrị ma Bouchard ọzọ tinyekwara ha n’ọkwa nhakọ site na iji nnukwu goolu na 27:37. +Cownie na Charles Corcoran jikọtara aka nyere Nielsen aka ịnye Dundee ndu izizi na asọmpi ahụ n’oge ngwụcha nke oge nke abụọ, o kechiri mmeri ahụ site na nke goolu ise nke otu ya n’ọkara oge nke oge ikpeazụ. +Giants, ndị tufugoro asọmpi anọ n’ime ise ikpeazụ ha, nọ n’ụlọ na Milton Keynes n’asọmpi ha na esote na Fraịde. +Onye Na Ahụ Maka Ụgbọ Elu Nwụrụ Iji Hụ Na Ọnụọgụ Narị Kwụrụ Narị Ndị Mmadụ Nọ N’ụgbọ Elu Gbanarịrị Ala Ọmajiji +A na eto otu onye na ahụ maka ụgbọ elu na Indonesia ka dike ka ọ nwụchara ka ọ na ahụ na ụgbọ elu ibu narị kwụrụ narị ndị mmadụ fepụrụ n’ala na enweghị nsogbu. +Ihe gafere ndị mmadụ 800 nwụrụ, imirikiti na efu ka nnukwu ọla ọmajiji dachara na agwaetiti nke Sulawesi na Fraịde, na akpalite tsunami. +Nnukwu ọmajiji gara n’ihu na enye mpaghara ahụ nsogbu, ejidere imirikiti n’okpuru ahịhịa n’obodo nke Palu. +Mana agbanyeghị ndị ọrụ ibe ya ịgbapụ ọsọ ndụ ha, Anthonius Gunawang Agung dị afọ 21 juru ịhapụ ọrụ ya n’elu ụlọ njikwa na efegharịsị ike n’ọdụ ụgbọ elu Mutiara Sis Al Jufri Airport Palu. +Ọ nọsiri ike iji hụ na Ụgbọ Elu 6321 Batik Air, nke nọ n’okporo ụzọ mfepụ, nwenwuru ike ịfepụ na enweghị nsogbu. +Mgbe ahụ ọ wụpụrụ n’elu ụlọ njikwa ụgbọ elu ahụ mgbe ọ chere na ọ na achọ ịda. +Ọ mechara nwụọ n’ụlọ ọgwụ. +Onye okwu okwu maka Air Navigation Indonesia, Yohannes Sirait, kwuru na mkpebi ahụ nwegoro ike ịzọpụta ọtụtụ ndụ ndị mmadụ, ABC News nke Australia kwuru. +Anyị kwadobere helikọpta si Balikpapan dị na Kalimantan iji buga ya n’ụlọ ọgwụ ka ibu dị n’obodo ọzọ. +Na mwute ọ hapụrụ anyị n’ụtụtụ a tupu helikọpta ahụ erute Palu. +“Obi anyị gbawara ịnụ maka nke a,” o tinyere. +Otu aka ọzọ, ndị ikikere na atụ ụjọ na ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ ga-erute puku kwụrụ puku ebe ụlọ ọrụ mgbochi ọdachi nke obodo na ekwu n’ụzọ esi enweta Donggala, Sigi na Boutong kpọchiri akpọchi. +“Ekwenyere na ọnụọgụ ahụ ka na agbago ebe ọtụtụ ndị mmadụ ka nọ n’okpuru mbibi ebe enwebeghị ike ịnweta imirikiti,” onye okwu okwu ụlọ ọrụ Sutopo Purwo Nugroho kwuru. +Oke ifufe ruru mita isii emebisiela Palu nke na eme nnukwu akwamozu na Sọnde. +Ụgbọ elu ndị agha na nke azụmahịa na ewebata ihe enyemaka. +Risa Kusuma, nne dị afọ 35, gwara Sky News: “Kwa nkeji ụgbọ ihe mberede na ebubata ahụ ndị mmadụ. +Mmiri dị ọcha dị ụkọ. +Ezuru oyi n’obere ahịa dị ebe niile.” +Jan Gelfand, onye isi nke International Red Cross dị na Indonesia, gwara CNN: “Red Cross nke Indonesia na agba ọsọ ịnyere ndị dị ndụ aka mana anyị amaghị ihe ha ga-ahụ ebe ahụ. +Nke a abụrụla ọdachi, mana ọ nwere ike ịkawanye njọ.” +Onye isi ala Indonesia Joko Widodo rutere na Palu na Sọnde wee gwa ndị agha obodo ahụ: “M na arịọ unu niile arịọrọ ka unu rụọ ọrụ n’ụbọchị na abalị niile iji mezuo ọrụ ọ bụla metụtara mkpopu. +Ị dị njikere?” CNN kpesara. +Na mbido nke afọ ala ọmajiji kụrụ Indonesia na Lombok nke ndị mmadụ 550 nwụrụ. +Ihe mberede ụgbọ elu Micronesia: Air Niugini kwụrụ otu nwoke na efu ka ihe mberede ụgbọ elu ọmi osimiri mechara +Ndị ụgbọ elu na ahụta maka ụgbọ elu dakpunyere n’ime ọmị osimiri Pacific na Micronesia ugbu a kwuru na otu nwoke na efu, ka ha kwuchara na mbido na ebupuchaala ndị njem na ndị ọrụ 47 niile n’ụgbọ elu ahụ na ekpu. +Air Niugini kwuru na nkwupute n’ebe ehihie Satọde, na ya enwenwughi ike ịchọta otu nwoke onye njem. +Ndị ụgbọ elu ahụ kwuru na ya na ndị mpaghara, ụlọ ọgwụ na ndị nyocha na arụkọta ọrụ iji nwaa ịchọta nwoke ahụ. +Ndị ụgbọ elu ahụ azaghachighi ozugbo arịrịọ maka nkọwapụta ndị ọzọ maka onye njem ahụ, dị ka afọ ma ọ bụ obodo. +Obere ụgbọ mmiri mpaghara nyere aka na ịzọpụta ndị njem na ndị ọrụ ndị ọzọ ka ụgbọ elu daruru na mmiri ka ọ na anwa ịdasa n’ọdụ ụgbọ elu Agwaetiti Chuuk. +Ndị ọrụ kwuru na Fraịde na ebugala mmadụ asaa n’ụlọ ọgwụ. +Ndị ụgbọ elu kwuru na ndị njem isii nọrọ n’ụlọ ọgwụ na Satọde, na ha niile nọ n’ọnọdụ dị mma. +Ihe butere mberede ahụ yana usoro nke mmemme ahụ kpọmkwem edobeghi anya. +Ndị ụgbọ elu ahụ yana U.S. Ndị agha mmiri kwuru na ụgbọ elu ahụ dakpunyere n’ọmị osimiri ntakịrị ihe tupu o ruo okporo ụzọ. +Ụfọdụ ndị akaebe chere na ụgbọ elu ahụ gbafere okporo ụzọ ahụ. +Onye njem America Bill Jaynes kwuru na ụgbọ elu gbadatara obere. +“Nke ahụ nnukwu ezigbo ihe,” Jaynes kwuru. +Jaynes kwuru na ya na ndị ọzọ nwara iji gafere mmiri ahụ nọ n’ukwu wee ruo ebe ọpụpụ ihe mberede n’ụgbọ elu ahụ na ekpu. +O kwuru na ndị ọrụ ụgbọ elu ahụ nọ na atụ ụjọ na eti mkpu, na ya nwere obere ọnya n’isi. +The U.S. Ndị agha mmiri kwuru na ndị na ọkwọ ụgbọ mmiri nọ nso na arụ ọrụ iji melite ọdụ ụgbọ mmiri nyerekwara aka na ịme nzọpụta site na iji ụgbọ mmiri afụrụafụ wee bufee ndị mmadụ n’ala tupu ụgbọ elu ahụ emie ihe dị ka mita 30 (ụkwụ 100) nke mmiri. +Data si na Aviation Safety Network gosiri na ndị mmadụ 111 nwụrụ n’ihe mberede nke ndị ụgbọ elu edebanyere-na-PNG n’afọ iri nke agba abụọ gara aga mana ọ nweghị ike ịgụnyere Air Niugini. +Ndị nyocha gosiri oge nke abalị agbara nwanyị ọkụ na ndụ +Ndị ọkaikpe kwụsịrị ikpe ya na Satọde na mkpegharị nke nwoke eboro ebubo ịgba nwanyị Mississipi ọkụ na ndụ na 2014. +U.S. Onye Nyocha Ngalaba nke Akwụmụtọ Paul Rowlett nyere akaebe ogologo oge ka onye akaebe ọkachamara n’akụkụ nke nyocha amamịghe. +Ọ gwara ndị otu ọkaikpe otu o si jiri ndekọ ekwentị mkpanaka iji chọpụta ngagharị nke onye eboro ebubo Quinton Tellis dị afọ 29 yana onye emetụtara dị afọ 19, Jessica Chambers, n’abalị ọ nwụrụ. +Rowlett kwuru na ọ nwetara data ọnọdụ site n’ọtụtụ ekwentị mkpanaka gosiri na Tellis na Chambers nọ na mgbede nke ọnwụ ya, na emegide okwu ikpeazụ ya, The Clarion Ledger kwuru. +Mgbe data gosiri na Chambers ji ekwentị ya n’oge o kwuru na ya na enyi ya Michael Sanford nọ, ndị uwe ojii gara ịgwa Sanford okwu. +Sanford gbagoro n’oche na Satọde wee kwuo na ya anọghị n’obodo n’ụbọchị ahụ. +Mgbe ndị ọkaikpe jụrụ ma Tellis a na ekwu eziokwu mgbe o kwuru na ya nọ na gwongworo Sanford n’abalị ahụ, Sanford kwuru na ọ na atụ “asị, n’ihi gwongoro m nọ na Nashville.” +Ihe ọzọ na adabaghị bụ na Tellis kwuru na ya amarala Chambers ihe dị ka izu abụọ mgbe ọ nwụrụ. +Ndekọ ekwentị gosiri na ha abụọ marala onwe ha ihe dị ka otu izu. +Rowlett kwuru n’obere oge ka Chambers nwụchara, Tellis hichapụrụ ederede, oku na ozi mkpọtụrụ nke Chambers n’ime ekwentị ya. +“O hichapụrụ ya na ndụ ya,” Hale kwuru. +Atọrọ na ndị mgbachite ahụ ga-ebido nrụrịta ikpeazụ ya na Sọnde. +Nnukwu ọkaikpe kwuru na ya tụrụ anya na ikpe ahụ ga-aga n’aka ndị otu ọkaikpe emechaa n’ụbọchị ahụ. +The High Breed: Gịnị bụ hip hop amamịghe? +Mmadụ atọ hip hop chọrọ ịgbanwe nhụta jọrọ njọ maka ụdị egwu ahụ site na iji ozi ndị mara mma wee kpojuo egwu ha. +The High Breed, si Bristol, na ekwu na hip hop hapụrụ ozi ndọrọndọrọ ebumpụta ya yana ikwu maka nsogbu mmekọrịta ọhaneze. +Ha chọrọ ịlaghachi na mgbọrọgwụ ya ma mee ka hip hop amamịghe wuo ewu ọzọ. +Ndị ọkụegwu dị ka The Fugees na Common ahụla mmalitegharị nso nso a na UK site na ndị ọkụegwu dị ka Akala na Lowkey. +Onye isi ojii ọzọ?! +Onye na eku nwa na NY gbara di na nwunye akwụkwọ maka ịchụ n’ọrụ ka ọ nwetara ederede “ịkpa oke” +Otu onye na eku nwa na NY na agba otu di na nwunye akwụkwọ maka ịchụ ya n’ọrụ n’ihi agbụrụ ya ka ọ nwetachara ederede jefiere ụzọ n’aka nne ya na ekpesa na ọ bụ “onye isi ojii ọzọ.” +Di na nwunye ahụ gọnarịrị na ha na akpa oke, na ekwu na ikpe ahụ bụ “nnapụ ego.” +Lynsey Plasco-Flaxman, nne nke mmadụ abụọ, kwuputere iwe ya mgbe ọ chọpụtara na onye na elekọta nwa ọhụrụ, Giselle Maurice, bụ onye isi ojii ka ọ na erute n’ụbọchị ọrụ izizi ya na 2016. +“MBAAAAAAAAAA ONYE ISI OJII ỌZỌ,” Nwada Plasco-Flaxman degara di ya n’ederede. +Kaosiladị, kama izigara ya di ya, o zigara Nwada Maurice ugboro abụọ. +Ka ọ chọpụtachara mmehie ya, Plasco-Flaxman “na agbakasị ahụ” chụrụ Nwada Maurice n’ọrụ, na ekwu na onye na ekuru ha nwa na apụ apụ, onye bụ onye African-American, rụrụ ajọ ọrụ na ya nọ na atụ anya Filipino, dị ka ndị New York Post siri dee. +Akwụrụ Nwada Maurice ụgwọ maka ọrụ otu ụbọchị wee jiri Uber zilaa ya ụlọ. +Ugbu a, Maurice na agba di na nwunye ahụ akwụkwọ maka ego nkasi obi maka ọchụchụ ahụ, ọ na achọ ego nkasị obi ruru $350 kwa ụbọchị nke ọnwa-isii, nhazi ibi n’ụlọ nke ebubu ụzọ jiri maka ya were ya n’ọrụ, agbanyeghị enweghị nkwekọrịta edere ede. +“Achọrọ m igosi ha, lee anya, ị gaghị eme ihe dị otu ahụ,” ọ gwara Post na Fraịde, na etinye “Ama m na ọ bụ ịkpa oke.” +Di na nwunye ahụ agọnarịla ebubo ndị ahụ na ha bụ ndị na akpa oke, na ekwu na ịkwụsị ọrụ nke Maurice bụ ihe dị mma ịme, na atụ ụjọ na ha enweghị ike ịnwe ntụkwasị obi na ya ka ha kpasuchara ya iwe. +“Nwunye m zigara ya ihe ọ akpachaghị anya kwuo. +Ọ bụ onye na akpa oke. +Anyị abụghị ndị na akpa oke,” di ya Joel Plasco gwara Post. +“Mana ị ga-etinye ụmụaka gị n’aka onye ị gwagoro ajọ okwu, ọbụlagodi na ọ bụ na mmehie? +Nwa ọhụrụ gị? +Bịanụ.” +Na atụnye ikpe ahụ ka “nnapụ ego,” Plasco kwuru na nwunye ya ka mụchapụrụ nwa n’ọnwa abụọ gara aga, na ọ “n’ọnọdụ siri ike.” +“Ị ga-achụba mmadụ dị otu ahụ? +Nke ahụ abụchaghị ezigbo ihe ịme,” onye ọrụ ụlọ akụ nchekwa ego ahụ tinyere. +Ikpe ahụ ka na aga n’ihu, ụlọ ikpe nke echiche ọhaneze ejirila ọsọ ọsọ katọọ di na nwunye ahụ n’ebe mmerịkọta ọhaneze, na akatọ ha maka omume na echiche ha. +Ndị biputere Paddington tụrụ ụjọ na ndị agụmagụ agaghị aghọta biya na ekwu okwu, leta ọhụrụ gosiri +Nwa nwanyị Bond Karen Jankel, onye amụchara ozugbo anabatara akwụkwọ ahụ, kwuru maka leta ahụ: “O siri ike mmadụ itinye onwe ya n’ọnọdụ onye na agụ ya oge izizi tupu ebipute ya. +Ọ na atọ nnukwu ọchị ugbu a ma ị mara nnukwu akụkọ ọma nke Paddington.” +Na ekwu na nna ya, onye rụrụ ọrụ ka ọsee foto BBC tupu ọ nweta mmụọ iji dee akwụkwọ ụmụaka ahụ maka obere ihe egwuregwu biya, ga-enwe ezi olile anya na a ga-ajụ ọrụ ya, o tinyere na ụbọchị ncheta nke 60 nke mbipụta akwụkwọ ahụ bụ nke “ilu na ụtọ” ka ọ nwụchara n’afọ gara aga. +Nke Paddington, onye kọwara ka “onye otu ezinụlọ anyị dị oke mkpa,” o kwukwara na nna ya nwere obi dị elu maka ọganihu ya emechara nwee. +“Ọ bụ nwoke dị nwayọ, ọ bụghị onye mpako,” o kwuru. +“Mana n’ihi Paddington dị ndụ nnukwu n’ebe ọ nọ, ọ dị ka ebe mmadụ nwere obere nwa mezuru ihe: ị ga-enwe obi dị elu ebe ha nọ ọbụlagodi na ọ bụchaghị n’ike aka gị. +Echere m na ọ hụrụ ọganihu nke Paddington n’ụzọ ahụ. +Agbanyeghị na ọ bụ mmepụta ya na uche ya, oge niile ọ nọ na enye Paddington otito n’onwe ya.” +Nwa m nwanyị nọ na anwụ, naanị n’ekwentị ka m nwere ike isi ya ka ọ dị +Na ọdịda na ebugala nwa nwanyị ya na Nice’s Hospital Louis Pasteur 2, ebe ndị dọkịnta rụrụ n’efu iji zọpụta ndụ ya. +“Nad nọ na akpọ kwa oge iji kwuo na ọ jọrọ oke njọ, na atụghị anya na ọ ga-adị ndụ,” Nwada Ednan-Laperouse kwuru. +“Mgbe ahụ enwetara m oku n’aka Nad iji kwuo na ọ ga-anwụ n’ime nkeji abụọ na esote, ekwesịrị m ị sị ya ka ọ dị. +Emere m ya. +Ekwuru m, “Tashi, ahụrụ m gị n’anya, ọ dị m n'obi. +M ga-anọnyere gị n’oge adịghị anya. +M ga-anọnyere gị. +Ọgwụ ndị dọkịnta nyere ya iji dowe mkpụrụobi ya ka ọ na akụ ji nwayọ na apụcha ma na ahapụ ahụ ya. +Ọ nwụọla tupu oge ahụ, nke a bụ ha niile ịgbatu. +Etukwuru m ebe ahụ ma chere, mara na ihe niile na apụta ihie. +Enweghị ike ịkwa akwa ma ọ bụ tie mkpu ma ọ bụ bee anya mmiri n’ihi anọ m n’ọnọdụ nke ndị ezinụlọ na ndị mmadụ gbara m okirikiri. +Ekwesịrị m ịkpakọta onwe m.” +N’ikpeazụ Nwada Ednan-Laperouse, onye ugbu a na akwa akwa maka ọnwụ nke nwa nwanyị ya, bara ụgbọ elu n’akụkụ ndị njem ndị ọzọ - ndị na amaghị ihe ọ na agabiga. +“Ọnweghị onye ma,” o kwuru. +“Isi nke m kpọdara ala, anya mmiri nọ na ada oge niile ahụ. +O siri ike ịkọwa, mana ọ bụ n’ụgbọ elu ahụ ka m nwere nnukwu mwute juputara n’ahụ maka Nad. +Na ọ chọrọ ịhụnanya na nghọta m. +Ama m otu o si hụ ya n’anya.” +Ụmụ nwanyị na eru uju na ebisa kaadị iji gbochie ịkwụ ụdọ n’akwa mmiri +Ụmụ nwanyị abụọ ndị ịkwụ ụdọ napụrụ ndị ha hụrụ n’anya na arụ ọrụ iji gbochie ndị ọzọ n’igbu onwe ha. +Sharon Davis na Kelly Humphreys na ebisa kaadị nwere ozi na akpalite mmụọ na akara ekwentị kemgbe n’akwa mmiri Welsh nke ndị mmadụ nwere ike ịkpọ maka enyemaka. +Nwa nwoke Nwada Davis bụ Tyler dị afọ 13 mgbe o bidoro nwebe obi ịda mba wee gbuo onwe ya n’afọ 18. +O kwuru “achọghị m ka nne na nna ọ bụla nwee ụdị mmetụta m na enwe kwa ụbọchị,”. +Nwada Davis, afọ 45, onye bi na Lydney, kwuru na nwa nwoke ya bụ osi nri na ekwe nkwa n’ọdịnihu nwere ọchị na efe efe. +“Mmadụ niile ma ya maka ọchị ya. +Ha na ekwu oge niile na ọchị ya na ebulite ime ụlọ ọ bụla.” +Kaosiladị, ọ kwụsịrị ọrụ tupu ọ nwụọ, n’ihi na ọ “n’ebe jọrọ oke njọ.” +Na 2014, nwanne nwoke Tyler, onye dị 11 n’oge ahụ, bụ onye nke hụrụ nwanne ya ka o gbuchara onwe ya. +Nwada Davis kwuru: “Ọ na eche m oge niile na a ga-enwe mmetụta nsotanso.” +Nwada Davis mere kaadị ndị ahụ, “iji mee ka ndị mmadụ mara na enwere ndị mmadụ nọ ebe a ha nwere ike ịgakwu ma gwa okwu, ọbụlagodi na ọ bụ enyi. +Etukwuna na nkịtị - ị kwesịrị ikwu okwu.” +Nwada Humphreys, onye bụ enyi Nwada Davies ọtụtụ afọ, enweghịzị Mark, di ya nke afọ 15, n’obere oge ka nne ya nwụchara. +O kwuru “o kwughi na ọ na enwe obi umeala ma ọ bụ ịda mba ma ọ bụ ihe ọ bụla,”. +“Ụbọchị ole ma ole tupu Ekeresimesi anyị chọpụtara mgbanwe n’omume ya. +Ọ nọ n’ala ala na Ubọchi Ekeresimesi - mgbe ụmụaka mepere onyinye ha anya ya na nke ha akụtaghị ma ọ bụ ihe ọ bụla.” +O kwuru na ọnwụ ya bụ nnukwu nkụja n’ebe ha nọ, mana ha ga-arụkọta ọrụ iji gafere ya: “Ọ gbapuru oghere n’ime ezinụlọ ahụ. +Ọ na ekewa anyị. +Mana anyị niile ga-aga n’ihu na agba mgba.” +Ọ bụrụ na ị na enwe nhịahụ ịga n’ihu, ị nwere ike ịkpọ Samaritans n’efu na 116 123 (UK and Ireland), email jo@samaritans.org, ma ọ bụ gaa na weebụsaịtị ndị Samaritans ebe a. +Ọdịnihu Brett Kavanaugh tọgbọ n’ikuku ka ndị FBI na ebido nyocha +“Echere m, ọ bụrụ na anyị nwere ike ịnweta ihe dị ka ihe ọ na arịọ - nyocha amachiri n’oge, amachiri n’oke - anyị nwere ike iwete obere ịdị n’otu,” Maazị Flake kwuru na Satọde, na etinye na ọ na atụ ụjọ na ọgbakọ ahụ na “etisasi” n’ime mkpọchi ndọrọndọrọ gozusiri ike. +Gịnị kpatara na Maazị Kavanaugh na ndị nkwado Repọblikan achọghị ka ndị FBI mee nyocha? +Enweghị mmasị bụ n’ihi oge. +Ntuli aka etiti oge bụ naanị n’ime izu ise na abịa, na Nọvemba 6 - ọ bụrụ na, dị ka atụrụ anya, ndị Repọblikan emeghị nke ọma, mgbe ahụ ha agaghị enwe ọtụtụ ike n’ọnwụnwa ha iji nweta nwoke ha chọrọ ka ahọpụta maka ụlọ ikpe kachasị n’ala. +George W. Bush na ewelite ekwentị iji kpọọ Ndị Ọmeiwu, na arịọ ha ka ha kwado Maazị Kavanaugh, onye rụrụ ọrụ na White House n’aka Maazị Bush ma site n’aka ya zute nwunye ya Ashley, onye nke bụ ọde akwụkwọ nkeonwe Maazị Bush. +Gịnị ga-eme mgbe ndị FBI weputere mkpesa ya? +A ga-enwe ntuli aka na Nzụkọ Ọmeiwu, ebe ndị Repọblikan 51 na Demokrat 49 nọ ugbu a. +O dobeghi anya ma Maazị Kavanaugh enwere ike ịnweta opekata mpe ntuli aka 50 n’ala Nzụkọ Ọmeiwu, nke ga-enye Mike Pence ohere, osote onye isi ala, ịkpọ ndapụta ya ma tinye ya na Ụlọ Ikpe Kachasị. +Ọnụọgụ ndị gbapụrụ na North Korea ‘gbadara’ n’okpuru Kim +Ọnụọgụ ndị gbapụrụ na North Korea gbagara South Korea agbadaala kemgbe Kim Jong-un banyere n’ọchịchị afọ asaa gara aga, onye ọmebe iwu South Korea kwuru. +Park Byeong-seun, na arụtụ aka na data si na minitri njikọta South, kwuru na enweela mgbapụ 1,127 n’afọ gara aga - tụlee yana 2,706 na 2011. +Maazị Park kwuru njikwa oke ala kpachikwuru akpachi n’etiti North Korea na China yana ụgwọ dị elu ndị na akpọfe ndị mmadụ na ana socha n’ihe ndị kpatara ya. +Pyongyang agwabeghị ọhaneze ihe ọ bụla. +A na enye ọtụtụ nke ndị gbapụrụ si na North akwụkwọ amaala nke South Korea. +Seoul kwuru na ihe gafere ndị North Korea 30,000 gafere oke ala ahụ n’ụzọ dara iwu kemgbe ngwụcha nke Ọgụ Korea na 1953. +Imirikiti na esi China agbapụ, nke nwere oke ala kachasị ogologo n’etiti North Korea ma ka dị mfe ịgafe karịa Demilitarised Zone (DMZ) echedosiri ike n’etiti Korea abụọ ahụ. +China na ahụta ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ka ndị mgbabata dara iwu karịa ndị mgbabata ọsọ ndụ ma jiri iwe kpọghachi ha. +Mmekọrịta n’etiti North na South - ndị ka nọ n’ọgụ - enwela mmelite ahụrụ anya n’ọnwa nso nso a. +Na mbido ọnwa a, ndị isi nke obodo abụọ ahụ hụrụ na Pyongyang maka ekwumekwu gbadoro na ụbụbọ mkposa ngwa ọgụ nuklịa. +Nke a bịara ka nnukwu nzụkọ Juun mere n’etiti Onye Isi Ala Donald Trump na Kim Jong-un na Singapore, mgbe ha kwenyere n’isiokwu sara mbara iji rụkọta ọrụ maka ala mmiri Korea na enweghị ngwa ọgụ nuklịa. +Mana na Satọde, Minista Ofesi nke North Korea Ri Yong-ho tara ntaramahụhụ ndị US ụta maka ọganihu na adịghị kemgbe ahụ. +“Na enweghị ntụkwasị obi na US, agaghị enwe okwukwe na nchedo obodo anyị yana n’ụdịrị ọnọdụ ndị ahụ, enweghị ụzọ ọ bụla anyị ga-esi bụrụ ụzọ kwekọrịta otu oge ịkwasa ngwa ọgụ anyị,” Maazị Ri kwuru n’okwu na Mgbakọ Ezumezu UN na New York. +Nancy Pelosi kpọrọ Brett Kavanaugh “isi mgbaka,” o kwuru na o tozughi iji rụọ ọrụ na Ụlọ Ikpe Kachasị +Onye Ndu Ndị Ntakịrị N’ụlọ Nzụkọ Nancy Pelosi kpọrọ onye nhọpụta maka Ụlọ Ikpe Kachasị Kavanaugh “isi mgbaka” ma kwuo na ọ na ewe iwe ọkụ iji rụọ ọrụ na Ụlọ Ikpe Kachasị. +Pelosi kwuru okwu ndị ahụ n’ajụjụ ọnụ na Satọde na Texas Tribune Festival na Austin, Texas. +“Enwenwughi m ike ịkwụsị ịche na ọ bụrụ na nwanyị mee ụdịrị ihe ahụ, ha ga-ekwu ‘isi mgbaka,”” Pelosi kwuru maka mmetụta ya n’ihe akaebe Kavanaugh n’ihu Ọgbakọ Ndị Ikpe nke Nzụkọ Ọmeiwu na Tọsde. +Kavanaugh jiri nnukwu mwute gọnarị ebubo ndị ahụ na ọ wakporo Dk. Christine Blasey Ford n’ike mgbe ha abụọ bụ ndị ntorobịa. +N’oge nkwupute mmepe ya, mmụọ Kavanaugh di elu nke ukwuu, oge ụfọdụ ọ na achọ iti mkpu ma olu a na agbagbu ya ka ọ na ekwu maka ezinụlọ ya yana afọ ụlọ akwụkwọ kọleji ya. +Ọ kọtọkwara ndị Demokrat nọ n’ọgbakọ ahụ n’ụzọ doro anya, na akpọ ebubo emere ya “mgbagbu omume dị egwu n’anya, akpara akpa” nke ndị mmesapụ ahụ na ewe iwe na Hillary Clinton dara na ntuli aka onye isi ala 2016 haziri. +Pelosi kwuru na ọ kwenyere na akaebe nke Kavanaugh gosiri ọ nweghị ike ịrụ ọrụ na Ụlọ Ikpe Kachasị, n’ihi o gosiri na ọ nweghị mmasị n’ebe ndị Demokrat nọ. +O kwuru “echere m na ọ kagburu onwe ya site na iji okwu ndị ahụ yana n’ụzọ o si kwutọọ Clintons yana ndị Demokrat,” +Pelosi dajụrụ mgbe ajụrụ ma ọ ga-achọ iwepu Kavanaugh ma ọ bụrụ na etinye ya n’oche, ma ọ bụrụ na ndị Demokrat nweta ọnụọgụgụ karịrị na Ụlọ nke Ndị Nnọchite. +“M ga-ekwu nke a -- ọ bụrụ na ọ naghị agwa Kọngress ma ọ bụ ndị FBI eziokwu, mgbe ahụ ọ bụghị naanị na o tozughi ịnọ na Ụlọ Ikpe Kachasị, ma ị nọ n’ụlọ ikpe ọ nọ na ya ugbu a,” Pelosi kwuru. +Kavanaugh bụ nnukwu ọka ikpe na D.C. Ụlọ Ikpe Sekuit nke Arịrịọ Mkpegharị. +Pelosi kwukwara na ka onye Demokrat na ọ nwere nchegbu maka ntimiwu Kavanaugh ga-adị maka Affordable Care Act ma ọ bụ Roe v. Wade, ebe a na ahụta ya ka akwụmụtọ na egbochi mgbanwe. +N’ọnụnụ itinye ya n’oche, Kavanaugh leghara ajụjụ ma ọ ga-atụgharị ụfọdụ mkpebi Ụlọ Ikpe Kachasị. +“Ọ bụghị oge maka isi mgbaka, onye na asọ ihe iji gaa n’ụlọ ikpe ma tụọ anya na anyị ga-ekwu, “ọ na nke ahụ adịghị mma,”” Pelosi kwuru. +Ụmụ Nwanyị Kwesịrị Iji Ya. +Ọ bụ nkatọ ziri ezi, ọnwa na afọ iwe ọkụ na awofu, ọ nweghị ike ikwupute ya na ebeghị akwa. +“Anyị na ebe akwa mgbe iwe were anyị,” Nwada Steinem gwara m n’afọ 45 gachara. +“Echeghị m na nke bụ ihe ọhụrụ, ọ ihe ị che?” +Ọ gara n’ihu, “Enwetara m nnukwu enyemaka n’aka nwanyị bụ otu onye isi oche n’otu ebe, onye kwuru na ya onwe ya bekwara akwa mgbe ọ na ewe iwe, mana ọ mụtara ụzọ nke pụtara mgbe ọ were iwe ma bido ịbe akwa, ọ ga-agwa onye ọ na agwa okwu, “Ị nwere ike ịche na m nwere obi mwute n’ihi na m na ebe akwa. +Iwe na ewe m.” +Mgbe ahụ ọ ga-agaba n’ihu. +M chere na nke ahụ mara oke mma.” +A na anabata anya mmiri ka mwepu maka iwe n'otu akụkụ n’ihi nghọta ya doro anya. +Otu n’ime ncheta m kachasị foo n’anya m bụ n’ọrụ m na mbido, ụlọ ọrụ ụmụ nwoke gafere, ebe m hụrụ onwe m ka na ebe anya na nnukwu iwe, ka otu agadi nwanyị dọkpụrụ m n’azụ onu m - onye njikwa juru oyi onye m na atụtụ ụjọ - onye dọbara m n’akwa nrigo. +“Ekwena ka ha hụ gị ebe ị na ebe akwa, “ọ gwara m. +“Ha amaghị na nnukwu iwe ji gị. +Ha chere na ị na enwe obi mwute, ọ ga-atọ ha ụtọ n’ihi na ha nwetara gị.” +Patricia Schroeder, mgbe ahụ bụ nwanyị kọngress Demokrat si na Colorado, rụụrụ Gary Hart ọrụ n’ọsọ onye isi ala ya. +Na 1987, mgbe ejidere Maazị Hart na mmekọ nwanyị na abụghị nwunye ya n’elu ụgbọ mmiri akpọrọ Monkey Business, ọ pụrụ n’ọsọ ahụ, Nwada Schroeder, na nnukwu iwe, chọpụtara na enweghị ihe kpatara na ọ gaghị eche maka ịpụta maka onye isi ala n’onwe ya. +“Ọ bụghị echiche echere nke ọma, “ọ gwara m ya n’ọchị ka afọ 30 gachara. +“Enweela ndị nhọpụta asaa ndị ọzọ n’ọsọ ahụ, ihe ọzọ ha achọghị bụ onye ọzọ. +Otu onye kpọrọ ya “Snow White and the Seven Dwarfs.”” +N’ihi ọ bịaghị n’oge na mgbasa ozi ahụ, ọ nọ n’azụ na ịkpakọta ego, ya mere o jiri nwụọ iyi na ọ gaghị abanye n’ọsọ ahụ belụsọ na ọ nwetara nde $2. +Ọ bụ ọgụ a ga-ada. +Ọ chọpụtara na ụfọdụ ndị nkwado ya nyere ụmụ nwoke $1000 nyere ya naanị $250. +“Ị chere na m nwere ike ịnweta mwepu ego?” ọ tụlere. +Mgbe o kwuru okwu ya na ọ gaghị ebido mgbasa ozi n’uju, nnukwu obi mmụọ juputara ya n’ahụ - ekele maka ndị mmadụ kwadoro ya, iwe na sistemụ mere ka o sie nnukwu ike ịkpakọta ego ma gbado anya na ndị ntuli aka karịa ndị nnọchite, yana iwe na ịkpa oke nwoke na nwanyị - o gbadoro ya n’onu. +“Ị nwere ike ịche na m nwere nnukwu ụjọ,” Nwada Schroeder chetara maka otu ndị nta akụkọ si wee hụta ya. +“Ị nwere ike ịche na Kleenex bụ ụlọ ọrụ na akwado m. +M chetara mgbe n eche, kedu ihe a ga-etinye n’okwute dị n’ili m? +Ọ bere akwa”?”” +Otu ọgụ azụmahịa US-China nwere ike isi dịịrị Beijing mma +Mbuso agha mbido nke ọgụ azụmahịa dị n’etiti US na China kpuchiri nti, ebe ọgụ ahụ tere aka na ngwụcha, nkewa n’etiti obodo ndị ahụ nwere ike ibuteere Beijing elele n’ọdịnihu, ndị ọkachamara kwuru. +Donald Trump, Onye isi ala US, buru ụzọ dọọ aka na ntị na mbido afọ a site na itinye ụtụ isi na ahịa mbupu ndị China gụnyere sọla panel, steel na aluminium. +Mkpalite kachasị gosipụta batara n’izu a nwere ụtụ isi ọhụrụ na emetụta ọnụọgụ ijeri $200 (ijeri £150) n’ọnụahịa ngwaahịa, na etinye ụtụ isi n’ọkara ngwaahịa niile na esi na China abata US. +Beijing megwara oge ọ bụla n’ụdịrị ahụ, nke nso nso a ịmanye ụtụ isi nke pasentị ise ruo iri n’elu ngwaahịa ndị America ruru ọnụọgụ ijeri $60. +China ekweela nkwa ịmakọ ndị US kwa mmereme, akụnụba obodo nke abụọ kachasị n’ụwa enweghị ike ịtabi anya n’oge ọ bụla dị anya. +Ịme ka ndị Washington gbatuo pụtara ịkwenye na ihe ndị achọrọ, mana ịkpọọrọ ndị US isi n’ihu ọhaneze ga-abụ nnukwu ihere maka Xi Jinping, onye isi ala nke China. +Ndị ọkachamara ka na ekwusi ike na ọ bụrụ na Beijing ga-egwu kaadị ya nke ọma, akwumọkụ ọgụ azụmahịa US nwere ike ịkwado China n’ụzọ dị mma n’ọdịnihu site na iwedata ndabekọrịta dị n’etiti akụnụba abụọ ahụ. +“Na mmereme mkpebi ndọrọndọrọ mere ngwangwa na Washington ma ọ bụ Beijing nwere ike ịmepụta ọnọdụ na ebido ọgbaghara akụnụba n’ime otu obodo abụọ ahụ ka bụrụ ihe egwu karịa ihe ndị nlele kwenyegoro na mbụ,” Abigail Grace kwuru, onye nyocha na agbado anya na Asia na Center for New American Security, ndị ndụmọdụ. +Syria ‘dị nkwadobe’ maka ndị gbara ọsọ ndụ ịlaghachite, Minista Ofesi kwuru +Syria kwuru na ọ dị nkwadobe maka nlaghachite nke ndị gbara ọsọ ndụ n’onwe ha, na arịọ maka enyemaka na ịrụgharị obodo ahụ nke ihe karịrị ọgụ nọrọ ogologo afọ asaa mebichara. +Ikwu okwu n’ihu Mgbakọ Ezumezu United Nations, minista Ofesi Walid al-Moualem kwuru na ọnọdụ n’obodo ahụ na emelite. +O kwuru “taa ọnọdụ dị n’ala ka dị mma ma nwee nchedo, ekele dịịrị ọganihu emere na igbochi ndị ọlụọ ọlaa,”. +Gọọmentị gara n’ihu na edozigharị mpaghara ndị ọlụọ ọlaa mebiri iji weghachite ihe otu o si adịbu. +Ọnọdụ niile dị ugbu a maka nlaghachite nke ndị gbara ọsọ ndụ n’obodo ha hapụrụ n’ihi ndị ọlụọ ọlaa yana ụkpụrụ akụnụba nke otu ndị ezubere na obibi ndụ ha yana ọrụ aka ha. +Ndị UN kpebiri na ihe gafere ọnụọgụgụ ndị Syria nde 5.5 agbafuola n’obodo ahụ kemgbe ọgụ ahụ bidoro na 2011. +Ọnụọgụọgụ nde isii ọzọ ka bi n’ime obodo ahụ chọrọ enyemaka ndị mmadụ. +Al-Moualem kwuru na ọchịchị Syria ga-anabata enyemaka na ịrụgharị obodo ahụ mebiri emebi. +Mana o kwusikwara ike na ọ gaghị anabata enyemaka nwere ọnọdụ ma ọ bụ enyemaka si n’aka obodo ndị na akwado ọgbaghara ahụ. +Europe jidere mmeri Ryder Cup na Paris +Team Europe meriri 2018 Ryder Cup site na imeri Team USA na akara ikpeazụ nke 16:5 ruo 10.5 na Le Golf National na mpuga Paris, France. +Ndị US adaala ugboro isiii bịakọrọ ọnụ n’ala Europe, ha emeribeghị Ryder Cup na Europe kemgbe 1993. +Europe weghachitere okpu eze ahụ ka otu nke kaptịn Thomas Bjorn nke Denmark ruru akara 14.5 ha chọrọ iji merie United States. +Onye ama ama nke US Phil Mickelson, onye nwere ọtụtụ nsogbu n’asọmpi ahụ, pianyere bọọlụ ya n’ime mmiri na ọkụkụ-3 maka oghere nke 16, tufuru asọmpi ya n’aka Francesco Molinari. +Onye gọlfụ nke Italy bụ Molinari mere nke ọma n’oge ya niile, bụrụ onye egwu 1-nke-4 iji gaa 5-0-0 kemgbe usoro asọmpi ahụ di ugbu a bidoro na 1979. +Jordan Spieth nke America dara 5na4 n’aka onye egwu pekarịsịrị n’ọkwa n’ime otu ndị Europe, Thorbjorn Olesen nke Denmark. +Onye egwu kachasị n’ọkwa n’ụwa, Dustin Johnson, dara 2 na 1 n’aka Ian Poulter nke England onye nke nwegoro ike igwu na Ryder Cup ikpeazụ ya. +Onye ochie nke Ryder Cups, onye Spain Sergio Garcia bụrụ onye Europe kachasị nwee mmeri na asọmpi ahụ, onye nwere akara 25.5 n’ogologo oge egwuregwu ya. +“Anaghị m ebekarị akwa mana taa enweghị m ike ịkwụsị ya. +Ọ bụ afọ siri ike. +Ana m ekele Thomas maka ịhọpụta m ma kwenye na m. +Obi juru m n’anụrị, enwere m obi anụrị ịnwetakwa iko ahụ ọzọ. +Ọ bụ maka ndị otu ahụ., enwere m anụrị na m nwere ike ịnyere aka,” nke Garcia juputara na mmụọ kwuru na mmeri Europe ahụ. +Ọ nyefere mpịọkụ ahụ n’aka onye obodo ibe ya John Ram onye nke gbaturu ọkaibe gọlfụ Tiger Woods nke US 2na1 n’asọmpi otu na otu na Sọnde. +“Nnukwu nganga a m nwere, imeri Tiger Woods, m na elele nwoke ahụ ka m na etolite,” Rahm dị afọ 23 kwuru. +Wood tufuru asọmpi anọ ya niile na France, ugbu a ọ nwere ndekọ nke 13-21-3 nke asọmpi ndekọ Ryder Cup. +Ọgụgụ na atụ n’anya nke otu n’ime ndị egwu kachasị n’oge niile, merigoro nnukwu iko 14 naanị onye nke abụọ n’azụ Jack Nicklaus. +Team USA tara ahụhụ n’izu ụka niile iji chọta ụzọ gara aga wepuga naanị Patrick Reed, Justin Thomas na Tony Finau, ndị gwuru gọlfụ dị oke elu na asọmpi ahụ niile. +Kaptịn US bụ Jim Furyk kwuru okwu ka ọ nwechara egwuregwu na adịghị mma maka otu ya, “Enwere m obi dị elu n’ebe ndị a nọ, ha gbara mgba. +Enwere oge n’ụtụtụ a mgbe anyị chara ndị Europe ọkụ. +Anyị dara. +Ekele dịịrị Thomas. +Ọ bụ ezigbo kaptịn. +Ndị egwu 12 niile ahụ gwuru egwu nke ọma. +Anyị ga-ahazigharị, m na ndị PGA nke America yana Ọgbakọ Ryder Cup ga-arụkọta ọrụ, anyị ga-aga n’ihu. +Ahụrụ m ụmụ nwoke 12 a n’anya, obi dị m elu ịrụ ọrụ ka kaptịn. +Ị ga-akpọ isi n’ala. +Emeriri anyị nke ọma.” +Mmelite Mmiri Anụnụ: Mbịakọta belatara na Pinellas, Manatee na Sarasota +Mkpesa kachasị ọhụrụ si na Florida Fish na Wildlife Commission na egosi mbelata zuru ọnụ na mbịakọta Mmiri Anụnụ maka akụkụ nke mpaghara Tampa Bay. +Site na FWC, a na ekpesa ọnọdụ ntoju mpekere na mpaghara obere obodo nke Pinellas, Manatee, Sarasota, Charlotte na Collies - nke na atụnye mbịakọta na ebelata. +Ntoju nke Mmiri Anụnụ ahụ na adọtị ihe ruru maịlụ 130 nke akụkụ osimiri bido n’akụkụ ugwu nke Pinellas ruo ndịda obere obodo Lee. +Enwere ike ịhụ mpekere n’ihe dị ka maịlụ 10 akụkụ mmiri nke Hillsborough County, mana n’ebe ole ma ole na erughi nke izu gara aga. +Achọpụtakwala Mmiri Anụnụ na Pasco County. +Ekpesara ọkara mbịakọta na ma ọ bụ n’akụkụ mmiri nke Pinellas Country n’izu gara aga, mbịakọta obere ruo na nke dị elu n’akụkụ mmiri nke Hillsborough County, mbịakọta mgbakwasa ruo na nke dị elu na Manatee County, mbịakọta mgbakwasa ruo na nke dị elu na ma ọ bụ n’akụkụ mmiri nke Sarasota County, mbịakọta mgbakwasa ruo na ọkara na Charlotte County, mbịakọta mgbakwasa ruo na nke dị elu na ma ọ bụ n’akụkụ mmiri nke Lee County, yana mbịakọta dị obere na Collier County. +A ka na ekpesa mmekpa ahụ iku ime na obodo Pinellas, Manatee, Sarasota, Lee, na Collier. +Ekpesaghị mmekpa ahụ iku ume na akụkụ Ugwu na ọdịda anyanwụ nke Florida n’ofe izu gara aga.